House of reps' alleged vote-buying : Ahụrụ m "green Mastercard" mana amaghị mka ego a dị na ya - Hon. Yakubu Barde

Ebe foto si, Yakubu Barde
Onye nnochiteanya Chikun/Kajuru n'Ụlọomeiwu Nta bụ Hon. Yakubu Barde ekwuola na ya huru mpekele akwụkwọ ndụ e ji a dọrọ ego e dere(Green Mastercard) aha Gbajabiamila na ntuliaka ndị ụlọomeiwu Nta mana ya amaghị ka o nwere ike ịghọ ego.
Ọ sịkwa na Femi Gbajabiamila na onwe ya agọnahụghị ya bụ mpekele akwụkwọ ndụ mana ọ sị na "ọ bụ ihe onyinye".
Barde sịkwa na ya hụkwara ka ndị otu ha na-ese ya bụ mpekele akwụkwọ ndụ edowere n'elu akwụkwọ ntuliaka ha foto mana ya amaghị ihe butere nke a.
O kwukwara n'ezie na ya bụ akparamaagwa were ike ime ka enyowa ya bụ ntuliaka enyo mana kemgbe onwe onye e ji aka, ọ ka bụ ihe efu.
N'uche ya,"o nweghị ihe o mere na mmadụ sere foto iji gosi nkwado, mana ọ bụrụ na-amanyere onye ahụ amanye na ụdị na-aga ata ya ahụhụ ma o meghị otu ahụ, ebe ahụ ka nsogbu dị".
Barde sịkwa na iwu Inec emetutaghị ntuliaka ahụ, na ha mere ya dịka ndị nnọchiteanya ahụ sị chọọ.
Ọ sị: Ahụrụ m "green Mastercard" mana amaghị m ka o nwere ka ego ji si n' aka fere aka. Mana ọ bụrụ na nke mere, ọ jọgburu udele ma sigbo nkakwụ".
Ndị nnọchiteanya Ndigbo anyị kpọrọ achọghị itụpuru BBC Igbo ọnụ maka nke a.
Akụkọ ga-amasị gị:











