Anambra Governorship Election:Ụlọikpe mkpesa maka ntụliaka enyela Andy Ụba na Soludo ohere inyocha akọrọngwa e jiri mee ntuliaka

Andy Uba na Charles Soludo

Ebe foto si, BBC/Charles Soludo

Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka mkpesa metụtara nọrọ n'Ọka,isiobodo ụbọchị Tọzde kwenye n'arịrịọ Andy Uba nke APC na Charles Soludo nke APGA rịọrọ ka ha lelee akọrọngwa Inec ji mee ntuliaka gọvanọ n'ọnwa November afọ 2021.

Onyeisi ụlọikpe pụrụ iche ahụ bụ Jọstịs D Mohammed sịrị na dịka ya lechara akwụkwọ ha wetara, na ọ dị ya mma, " Ya mere, ana m enye Inec ntuziaka ka ha nye Uba ohere inyocha akọrọngwa e jiri mee ntuliaka".

O nyere iwu ka e mee nke a n'ihu ndị detara akwụkwọ mkpesa ka emeya, ndị ọ dịị ịsa ha, ndị uweojii na ndị uweojii nzuzo a kpọrọ DSS n'ịchafụ.

Uba site n'aka ọkaiwu ya bụ Emeka Okafor na Soludo site n'alka iwu ya bụ Sly Ezeokenwa degara ụlọikpe ahụ akwụkwọ sị ka a manye Inec ka o nye ha ohere inyocha ihe e ji mee ntụliaka gụnyere akwụkwọ mpụtara ntuliaka kpọmkwem.

Godwin Maduka

Onye zọrọ ọkwa gọvanọ n'aha pati Accord bụ Godwin Maduka tinyeburu otu akwụkwọ ahụ site n'aka ọkaiwu ya bụ N. Agụ mana o mechara bịa wepụ ya, sị na ya achọghịzi.

Ụlọikpe ukwu akachapụla akwụkwọ a gbara Charles Soludo

Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja akachapụla akwụkwọ mmadụ abụọ gbara Charles Soludo maka nhọpụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti.

N'ikpe ọkaikpe Taiwo Taiwo kpere, akwụkwọ sị ka a kagbuo mmeri Soludo maka ebubo na ọ tụrụ asị n'ozi o nyere ụlọọrụ Inec mgbe ọ na-edebanye aha n'akwụkwọ ịzọ ọkwa.

Ndị gbara akwụkwọ bụ Adindu Valentine na Egwudike Chukwuebuka bụ ụlọikpe sị na akwụkwọ ha achịtaghị aja ọbụla.

Ọkaikpe Taiwo gara n'ihu gwara mmadụ abụọ ahụ kwụọ APGA, Soludo na osote ya bụ Ibezim ego dị nde naịra abụọ.

Otu onye enyemaka Soludo bụ Ejimofor Opara gwara BBC Igbo na obi dị ha ụtọ maka ikpe ahụ ma sị na ha nabatara ya nke ọma.

Mmadụ abụọ agbaala Soludo akwụkwọ n'ụlọikpe gbasara ntuliaka Anambra

Chukwuma Soludo

Dịka ọkammụta Chukwuma Soludo na-enwe aṅụrị maka imeri ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti, mmadụ abụọ ọzọ agbaala ya akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

Dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si dee, aha mmadụ abụọ a bụ Adindu Valentine na Egwudike Chukwuebuka.

Ha na-ebo ebubo na Soludo na ndị pati ya bụ APGA, tụụrụ INEC asị n'akwụkwọ ha binyere aka na ya tupu ntuliaka ahụ.

Adindu na Egwudike na-ekwu na Soludo nakwa onye osote ya bụ Onyeka Ibezim, dere na ọ bụ ọkwa "Aguata 2 Constituency" ka ha na-azọ, kama ide na ọ bụ ọkwa "Gọvanọ".

Ha na-akọwa na asị ahụ Soludo tụụrụ ndị INEC megidere iwu, nke pụtara na ụlọikpe kwesịrị ịkụchapụ aha Soludo maka ya bụ ntuliaka.

Aha onyonyo, Chukwuma Soludo: Ihe ndị Anambra chọrọ n'aka Chukwuma Soludo

Mana ọkaiwu Soludo nakwa nke APGA bụ Onyechi Ikpeazu kọwara na ya bụ okwu erijughị afọ, ma kpọọ ụlọikpe oku ka ha tụzụga ya n'akụkụ.

Ikpeazu kọwara na ndehie ihe n'akwụkwọ 'affidavit' erughị ihe a ga-eji kụchapụ aha mmadụ n'ịzọ ọkwa ọchịchị.

Ọ kọwara na mmadụ ịtụ asị, dịka o si dị n'akwụkwọ iwu ntuliaka, bụ mgbe mmadụ chọrọ igosi na ọ bụ ihe ọbụghị maọbụ na o nwere ihe o nweghị n'eziokwu.

N'aka nke ọzọ, ọkaiwu INEC kwuru na ha agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu, kama ka ụlọikpe kpebie ya etu ka ya mma.

Ọkaikpe Taiwo Taiwo etinyela ya bụ ikpe ka ọ dị n'abalị iri atọ nke ọnwa Nọvemba a.

Aha onyonyo, Ihe ị kwesịrị ịma maka Charles Soludo, gọvanọ ọhụrụ nke Anambra steeti

Ụlọikpe kachasi enyela Soludo mmeri gbasara ịnọchite APGA na ntuliaka Anambra

Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook

Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ekpebiela ikpe gbasara onye kwesịrị ịnọchite anya pati 'All Progressive Grand Alliance' (APGA) na ntụliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

Ha kwuru na ọ bụ Chukwuma Soludo bụ onye tozuru ịnọchịte anya APGA.

Mkpebi a bịara n'ụbọchị Tọzde n'ụlọikpe 'Supreme Court' n'Abuja.

Cheta na otu APGA keburu ụzọ abụọ dịka mmadụ abụọ na-azọ onye bụ onyeisioche pati ahụ.

Mmadụ abụọ a bụ Jude Okeke na Victor Ike Oye haziri ntuliaka imeụlọ nke ha n'iche n'iche ma wepụtakwa onye nke ha.

N'otu nke Jude Okeke, ha wepụtara Chukwuma Umeoji, ebe otu nke Victor Oye wepụtara Chukwuma Soludo.

Aha onyonyo, Charles Soludo: Oji onye n'ala ji onwe ya n'okwu 'sit-at-home' ndị Ipob

Ngalaba nhazi ntuliaka bụ INEC bu ụzọ kwuo na ọ bụ Chukwuma Umeoji ka ha ma, nke mere ka ya bụ okwu pụọ ụlọikpe.

Ụlọikpe mkpegharị mechara gwa INEC ka ha wepụ aha Umeoji tinye Soludo, mana Umeoji na Jude Okeke wepụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe kachasị.

Ọ bụ mkpebi a ka ụlọikpe kachasị nyere taa n'Abuja.

"Obi aṅụlị juru m afọ maka ndebanye aha m n'ime ndị ga-azọ gọvanọ Anambra" - Chukwuma Soludo

Chukwuma Soludo

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Chukwuma Soludo n'obi ọṅụ

Charles Chukwuma Soludo agwala BBC Igbo na obi dị ya sọ aṅụlị, maka etu Inec si debanye aha ya n'ime ndị ga-eso zọọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

Ọ gara n'ihu gwa BBC Igbo si na "Ọ ga-eme eme!"

Taata bụ ụbọchị 19 Ọgọst , 2021 ka ụlọrọrụ Inec bụ Independent National Electoral Commision jiri debanye aha Maazị Soludo site n'ibipụta ozi ọha a:

Inec edebanyela aha Soludo na ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ Anambra

Ebe foto si, BBC Sport

Nkọwa foto, Inec edebanyela aha Soludo na ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ Anambra

Inec sị na ha debanyere aha Charles Soludo dịka o nwere mmeri n'ụlọikpe mkpegharị dị na Kano.

Nke a bụ akụkọ na-apụta ugbua site n'akara Facebook ndị Inec bụ ndị na-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa, lee aha Soludo n'ahịrị 6 n'akwụkwọ ha:

Aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra na 2021
Nkọwa foto, Aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra na 2021

Lee aha ọhụrụ ndị Inec wepụtara ka ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ taata bụ ụbọchị 19 ọnwa Ọgọst, 2021.

Nke a pụtara na Inec ewepụla aha Chukwuma Michael Umeoji, ebe osote ya bụ Orogbu Obiageli Lilian.

Ọ bụ aha ndị ka ha tinyeburu site n'ikpe ụlọikpe dị na Jigawa.

Aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra na 2021

Ebe foto si, Inec

Nkọwa foto, Aha ndị ga-azọ ọkwa gọvanọ n'Anambra na 2021

N'akwụkwọ a nke BBC Igbo hụrụ anya, aha Ifeanyi Ubah nke na-azọ n'okpuru otu YPP adịghị ya.

Kama aha onye na-azọ ọkwa dịka osote ya bụ Okechukwu Nnamdi Eze bụ ihe edepụtara.

Charles Chukwuma Soludo n'Ọgbakọ ndị otu patị Apga

Ntụliaka ọkwa Gọvanọ Anambra steeti bụ nke ga-eme n'ọnwa Nọvemba afọ 2021 dịka ụlọọrụ Inec si kwuo.