Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa
Mba Briten ga-amalite inye dijitalụ visa
Ụlọọrụ na-enye akwụkwọ ikikere ịbanye mba Briten ekwuola na ha ga-amalite inye akwụkwọ ikikere dijitalụ maka ndị chọrọ ịbata mba Briten site n'ụbọchị 25 Febụwarị 2026 maka ndị dere ka ha nata akwụkọ ịbata bụ visa, maka na ha ga na-enye sọsọ eVisa.
Ha sị na eVisa a ga-anọchịanya akwụkwọ visa ha na-atapa n'ime passports.
A ga-enwe ntuliaka n'okpuruọchịchị ndị dị n'Abuja, nke a ga-abụ nke mbụ kamgbe e binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Ntuliaka nke a ga-eme n'okpuruọchịchị isii dị n'Abuja ga-eme n'ụbọchị Satọde 21 Febụwarị, 2026.Ndị bi n'okpuruọchịchị ndị a bụ ndị ga-eme ya - Abaji, Abuja Municipal, Bwari, Gwagwalada, Kuje na Kwali - a ga-atụnyere ndị isioche isii na ndị nnọchịanya 62 nke Bekee kpọrọ councillor n'obodo 68 dị n'Abuja.Nke a ga-abụ nke izizi a ga-eme kamgbe Onyeisiala binyere aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ Electoral Amendment Act n'ụbọchị 17 Febụwarị 2026.Iwu a kwuru na ọ bụghị sọọsọ igwe ka a ga-eji nyefee mpụtara ntuliaka, iwu a nyere ohere ka e ji aka dee mpụtara ntuliaka site n'ọba ntuliaka n'igwe ebe ndị mmadụ nwereike na-ahụ na ndụ.Mana ọtụtụ katọrọ nke a maka na ha sị na ọ ga-enye ohere mmetọaka tụmadị ebe ndị netwọk adịghị.Ha sị na ndị ndọrọndọrọọchịchị nwereike mee nke a etu ọbụla ọsọrọ ha ma nyekwa ohere aka enwe n'ite ofe.Agbanyeghị nke a, ụlọọrụ Inc bụ - Independent National Electoral Commission ekwuola na ihe karịrị mmadụ nde 1.5 anatala akwụkwọ ntuliaka ha bụ PVC n'ime nde 1.68 tinyere akwụkwọ n'Abụja.“Sọọsọ ndị binyere aka ịtụ vootu ka a ga-ekwe ka ha tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka,” Ọnụ nkwuchitere Inec bụ Mohammed Haruna kwuru nke a.Nke a bụ ntuliaka nke abụọ Onyeisioche Inec chairman bụ Joash Amupitan e nyere ọkwa n'ụbọchị 23 Ọktoba, 2025.Ndị ọnụ na-eru okwu sị na ntuliaka Abuja a ga-abụ ọmụmaatụ nye ụlọọrụ Inec nakwa otu Pati All Progressives Congress (APC) na Onyeisiala Tinubu nke chere afọ ntuliaka na-abịa n'afọ 2027 ka ọ dara ntuliaka n'Abuja.Agbanyeghị na onye ji ọkọlọtọ Labour Pati zọọ ọkwa Onyeisiala bụ Peter Obi meriri n'Abuja n'afọ 2023, anaghị azọ ntuliaka a. O weliela aka ndị ji ọkọlọtọ African Democratic Congress (ADC) ịzọ ọkwa ọchịchị a bụ ndị e chere so Peter Obi si na otu Pati Labour baa ADC.
Otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị ga-eso azọ ntuliaka bụ: 17
Ụlọikpe Kachasị n'Amerịka akagbuola ụtụ egọ Trump
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Kachasị nke mba Amerịka akagbuola ụtụ ego Onyeisiala Donal Trump tụkwasara na ngwaahịa na mba ụwa
N'afọ 2025, Trump tinyere ego ụtụisi a ngwaahịa a na-atụbata n'Amerịka, sị na ọ bụ iji nyere Amerịka aka na mmepụtangwaahịa
Mana kama inweta nkwado ụlọomeiwu c, Trump gbadoro ụkwụ na iwu nke afọ Gbatgbata nke Akụnaụba mba ụwa nke afọ 1977(International Emergency Economic Powers Act. Declaring an emergency 1977) were tinye n'ọrụ ozugbo.
N'ọnwa Ọgọst afọ 2025, Ụlọikpe Mkpegharị nke Amerịka nyere mkpebi na ọtụtụ ụtụego ahụ Trump tinyere megidere iwu mana hapụ ya.
Mana Ụlọikpe Kachasị tinyere aka n'ikpe ahụ dịka Ụlọọrụ Onyeisial (White House rịọrọ ka ọ kagbuo mskpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere..
Ụlọikpe Tunisịa atụọla onye omeiwu mkpọrọ maka ịkatọ Onyeisiala Saied na soshal midia
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mba
Tunisịa atụọla onye omeiwu mba ahụ mkpọrọ ọnwa asatọ maka ebubo ịkwa Onyeisiala
Kais Saied emo na soshal midịa.
A nwuchiri Ahmed
Saidani na mmalite ọnwa Febúwarí oge o wepụtara ozi na soshal midịa oge Onyeisiala Saied
gara mgbaru n’ogige idemmiri wakporo ma kpọ ya “onye ndu mkpocha akwara mmiri
ozuzu”.
Ọkaiwu
na-anọchiteanya Saidani bụ Houssem Eddine Ben Attia gwara ụlọọrụ AFP na gọọmenti
ji iwu megidere mmetọ mgbasaozi na imeru ndị ọzọ ahụ na soshal midịa, kpagbu Saidani.
Iwu ahụ bụ nke nwere ike ime ka mmadụ nweta ntaramahụhụ mkpọrọ ruru afọ abụọ.
Ọtụtụ ụlọọrụ
na-achekwa ikike mmadụ katọrọ ikpe ahụ a mara Saidani ma kwuo na nke gosiri aka
ike Onyeisiala Saied ji achị mba Tunisịa kemgbe ọ kagburu ụlọomeiwu mba ahụ n’afọ
2021.
Na nso nso
a, Saidani bụbu onye nkwado Onyeisiala Saied, amalitela ikwu ma na-akatọ ọchịchị
ya.
E mechiela ụlọakwụkwọ niile dị n’Abuja n’ihi ntuliaka okpuru ọchịchị
Ebe foto si, Getty Images
E mechiela ụlọakwụkwọ niile dị n’isi obodo Naịjirịa bụ
Abuja dịka a na-akwado ịhazi ntuliaka okpuru ọchịchị n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị
2026.
A hụrụ ka ụmụakwụkwọ na-alaghachi n’ụlọ ha mgbe ọ kụrụ
ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ, n’ihi ntuziaka e nyere ka e mechie ụlọakwụkwọ
niile maka ntuliaka ahụ.
Ntuziaka ahụ bụ n’ihi atụmatụ e mere iji ọtụtụ ụlọakwụkwọ
ọhanaeze mere ogige ntuliaka nakwa ogige ngụkọ vootu n’ogogo wọọdụ.
Nke a bụ iji hụ
na a haziri ihe niile nke ọma maka ntuliaka ga-adị n’okpuru ọchịchị isii dị n’Abuja.
N’otu aka ahụ, ndị uweojii ekwuola na agaghị eme ngagharị n’Abuja malite n’elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede n’ụbọchị Satọde 21 Febụwarị 2026.
Kọmịshọna ndị uweojii n’isi obodo bụ Miller G. Dantawaye kwuru na ọnọdụ a ga-emetụta ndị niile bi n’Abuja e wezuga ndị ọrụ ha dị oke mkpa nakwa ndị ọrụ ntuziaka e nyere nkwado.
Otu ndị ọrụ PENGASSAN agwala Onyeisiala Tinubu ka ọ kagbuo iwu ọhụrụ gbasara ego mmanụ
Otu ndị orụ mmanụ agbadị nke Naịjịrịa bụ PENGASSAN agawala Onyeisiala
Bola Tinubu ka ọ kagbuo iwu ‘Executive Order’ nke ikike wepụrụ ụlọọrụ mmanụ ala
nke Naịjịrịa NNPC Limited iwepụ ego mmanụ dịka ụlọmgbasa ozi mpaghara siri kwuo.
Cheta na Onyeisiala Tinubu binyereka n’iwu mmanụ ọhụrụ n’ụbọchị
Wenezde 18 Febụwarị 2026 maka ụlọọrụ FAAC iwepụ ego mmanụ na ‘gas’ ozugbo.
N'okwu ya n'oge mkparịtaụka ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Tọzde,
Festus Osifo, onyeisiala mba nke PENGASSAN, kwuru na iwu ahụ bụ "mwakpo”
megide iwu ‘Petroleum Industry Act’.
Osifo kwuru na onyeisiala ejirila iwu ọhụrụ ahụ "wepụ
iwu nke Federal Republic nke Nigeria".
"Anyị chere na onyeisiala kwesịrị ikagbu iwu ahụ ozugbo,
ma leba anya na ya ọzọ, n'ihi na anyị maara na onyeisiala Naịjirịa emeela ihe
niile o kwesịrị ịme iji dọta itinye ego na ụlọọrụ mmanụ na gas nke Naịjirịa,"
ka o kwuru.
Onyeisi otu ndị ọrụ PENGASSAN kwetara na onyeisiala nwere
ikike ime iwu na ọrụ nchekwa nke ụlọọrụ ahụ.
A na-atụ ụjọ na ụfọdụ mmadụ anwụọla dịka otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu mere mwakpo na Kebbi Steeti
Ebe foto si, Getty Images
E nwere nnukwu
egwu na ụfọdụ mmadụ anwụọla oge ndị Lakurawa na-eyi ndụ egwu mere mwakpo n’ụfọdụ
obodo dị n’okpuru ọchịchị Arewa na Kebbi Steeti n’ụbọchị Wenezde 19 Febụwarị
2026.
Dịka ụfọdụ ndị
obodo na ndị nchekwa siri kwuo, ndị ojiegbe ahụ wakporo ime obodo ndị nọ n’okeala,
ma malite ịgba ndị mmadụ egbe.
Ndị isi ha pụtara
na njinji ahụ kọwara ya dịka mwakpo a haziri nke ọma nakwa nke na-amaghị nwata
maọbụ okenye.
Ngụkọ ndị nchekwa
wepụtara gosiri na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ iri na isii na Mamunu, gbuo
mmadụ ise n’Awashaka, ebe mmadụ abụọ dị iche iche nwụrụ n’ime obodo ise ndị ọzọ.
Mwakpo ahụ butere obi mmapụ, ma manyekwa ndị obodo ịgbahapụ ụlọ ha, dịka ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọ dị iche iche na-agba ndị mmadụ egbe.
E zipụla ndị nchekwa kemgbe ka ha gaa chekwaa obodo ndị ahụ, nyere ndị isi ha pụtara aka, ma mechie ụzọ dị iche iche ndị ahụ mere mwakpo nwereike isi gbaa ọsọ.
Oge ọ na-akọwa nke a dịka eziokwu, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kebbi Steeti bụ Bashir Usman sịrị na ha ga-ewepụtakwu ozi dịka nnyocha na-aga n’ihu.
Ndị be anyị, ụtụtụ ọma nu!
Nnọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 20 Febụwarị, 2026.
Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ
si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa.
Ndị uweojii anwụchiela nwoke a na-enyo maka ntọ, igbu mmadụ n'Anambara
Ebe foto si, Gety images
Ndị uweojii n'Anambara steeti ekwuola na ha anwuchiela nwoke maka ebubo aka ya ịdi na ntọ na igbu mmadụ n'Urum dị n'Okpuru Ọchịchị Awka-North.
N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga binyere aka ma wepụta, o kwuru na ọ bụ ndịagha si ogige '302 Artillery Regiment, Nigerian Army Cantonment' dị n'Ọnicha nyere nwoke ahụ n'aka ndị iwun'abalị ise nke ọnwa Febụrarị, afọ 2026.
A na-ebo ebubo na Onyenwe na Felix
Godwin na ndị ọzọ aka na-achọ achọ dunyere ndị ji ngwaọgụ wakpoo ndị madụ n’okporoụzọ
Urum.
Ozi ahụ kwuru na ka a gbara ya ajụjụ, na Onyenwe kwuru na Felix Godwin kwụtara N500,000 ka e were zụta ndị ojiegbe mmadụ anọ si k Ọchịchị Anyamelum
ka ha bịa mee mwakpo ahụ ma nyekwa ya ego dị ₦350,000 maka ịzụta mgbọ egbe.
Ọ gara n’ihu gbaa ama na mmadụ
isii bụ ihe merụ®ụ ahụ site na mgbọ egbe a gbara ha.
A tụọla onye bụbu Onyeisiala Saụt Koria nga mkpụrụọka maka itinye iwu ọnọdụ gbagbata
Ebe foto si, Reuters
A tụọla onye bụbụ onyeisiala mba Saụt Koria bụ bụ Yoon Suk Yeol nga mkpụrụọka maka ibute ọgbaghara na mba ahụ site iti iwu kpọbatara ndịagha.
Yoon gbaghara Iwu mba Saụt Koria, ziga ndịagha mechiri ụlọọmeiwu mba ahụ ma nwụchie ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'abalị atọ nke ọnwa Disemba afọ 2024, dịka ụlọikpe nke Seoul.
Yoon kagburu iwu ọhụrụ ahụ ka ọ gachara ụfọdụ awa, dịka ndịomeiwu ji ike baghachi n'ime Ụlọmeiwu ahụ ma kagbuo iwu ọhụrụ ahụ.
Ihe sochiri ya bụ esemokwu ndọrọndọrọ nakwa nchutu a chuturu ya n'ọkwa n'ike.
Ọkaikpe kpere ikpe ahụ bụ Ji Gwi-yeon kwuru na agwa Yoon kpara mebiri ọchịchị onyekwuoucheya nke mba ahụ n'ebe ọ dị ukwu ma kwesị ezi ntaramahụhụ.
Ndị na-ekpe ya ikpe chọrọ ka a ma ya ikpe ọnwụ
Yoon kwuburu na ihe mere o jiri tinye iwu ahụ bụ iji chekwaa ndị na-akwado mba Nọt Koria mana o teghị anya o doo anya na ọ bụ nsogbu dị n'ụlọ kpaliri ya dịka ndị anaọghị na pati ya karịrị n'ụlọomeiwu nke mere ka ọ bụrụ onyeisiala n'ọnụ, ọzọ bụ na nwunye ya bụ Kim Keon Hee bụ onye eborola ebọtụtụ ebubo nrụrụaka.
Hisbah bụ ndị uweojii okpukperechi alakụba ejidela mmadụ 9 na Kano steeti
Ebe foto si, HIZBA MAGAZINE/FACEBOOK
Hisbah bụ ndị uweojii okpukpere alakụba ejidela mmadụ
itoolu maka ịda iwu adịghị ebu ọnụ n’oge Ramadan.
Ha jidere mmadụ itoolu na-eri nri n’oge ibu ọnụ na Kano
steeti.
Kano bụ otu n’ime steeti dị icheiche na Naịjirịa bụ
ebe e nwere ọtụtụ ndị okpukpere alakụba ma bụrụkwa ebe iwu Sharia na-arụ ọrụ.
Mgbe ọbụla a
na-ebu ọnụ (Ramadan) ndị Hisbah na-agagharị n’ebe niile a na-ere nri na ọtụ ihe
ndị ọzọ na-achọ ndị okpukpere ha na-ada iwu.
N’ime Kano, ọtụtụ
ọlọ oriri na nkwari na-emepe ọkachasị ebe ndị ụka kraist ka n’ọnụ ọgụgụ.
Mujahid
Aminudeen bụ osote onyeisi Hisbah gwara BBC na ndị ha gedere bụ ụmụ nwaanyị abụọ
na ụmụ nwoke asaa.
N’okwu ya “anyị
jidere ha. Ha nọ n’ụlọọrụ anyị ebe anyị ga-akuziri ha uru ọ bara, etu e si ekpe
ekpere ma na-agụ akwụkwọ Quran, nakwa etu onye ezigbo onye alakụba”.
Gọọmenti Etiti emechiela ebe a na-egwupụta ihe ọtụtụ mmadụ nwụrụ na Plateau Steeti
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị na-eru uju bịara ọlili ozu ndị ọrụ na-egwupụta ihe nwụrụ mgbe ihe mberede ahụ mere
Gọọmenti Etiti Naịjirịa emechiela ebe a na-egwupụta ihe n'ala dị na Plateau steeti dịka mmadụ ruru iri atọ na atọ nwụrụ
n’ụbọchị Wenezde abalị iri na asatọ nke ọnwa Febụwarị n'ihi 'gas' na-ehiehi.
Ihe ọdachi a mere obere
oge tupu anyanwụ apụta ma ọ bụrụ na a hapụchaa mpaghara obodo Wase nke ụlọọrụ na-egwupụta ihe nke
akpọrọ ‘Solid Unity Nigeria Ltd’ na-ahụ maka ya.
Akụkọ kwuru na ‘gas’
na-egbu egbu malitere ihiehi n'ebe ngwupụta ihe n'ime ala nke
mere ndị ọrụ ejighị enwetazi ikuku nke ọma.
E kwuru na saịtị
ahụ dị kilomita narị abụọ na anọ (124 miles) nọ na ndịda ọwụwa anyanwụ nke isi obodo
steeti Jos.
Ka ọ dị ugbua, a malitela ime nnyocha iji mara ihe kpatara ọdachi a mana ndị ọchịchị agabeghị ebe ahụ ileta ọnodụ
nchekwa ebe ahụ nke ndị ekperima na-enye nsogbu na ya.
Otu
onye ọrụ hụrụ ozu ndị otu ya nwụrụ anwụ mgbe ọ malitere ọrụ n'ụtụtụ na-esote abalị ahụ ihe ọdachi ahụ mere, gwara
BBC na e nwere ụfọdụ ndị ọrụ nọ n’ime ala arụ ọrụ ka dị ndụ mana e bugala ha n'ụlọọgwụ dị na
Wase
Safiyanu Haruna kwuru na ndị ọrụ ahụ bụ
ndị okpukperechi alakụba mechara ekpere n’ụtụtụ ma laghachite ịrụchapụ ọrụ ha
tupu ihe ọjọọ ahụ eme.
N’agbanyeghị na gọọmenti
Plateau Steeti kwuru na mmadụ iri atọ na atọ ahụ nwụrụ n’ihi ihe tiwara n'ebe ngwupụta ihe, Haruna kwuru na nke
ahụ abụghị eziokwu kama na “ọ bụ gas na-egbu egbu hiri ehi gburu ha.
Dịka o si kwuo “
enweghị ndị bịara ịzopụta ndị ọrụ ahụ mgbe ahụ maka ndị kwesịrị ịrụ ọrụ n’ụtụtụ
abịabeghị”
Cheta na afọ abụọ gara
aga, ọtụtụ ndị na-egwupụta ọlaedo nwụrụ dịka ha tọrọ n'okpuru ala na Naịja
steeti
Ọdachi a mere ugbua
nwereike imalite okwu gbasara nchekwa na ngalaba ebe ngwupụta ihe.
Tinubu, Chanselọ mba Jamini ga-agbakọ aka na nchekwa, ọkụ latrik - Obi ọchịchị Naịjirịa
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Bola
Tinubu na Chanselọ mba Jamini bụ Friedrich Merz ekpebiela ịkwalite mmekọrịta dị
n’etiti Naịjirịa na Jamini.
Ha kwuru na ebumnobi
nke a bụ iji kwalite mgbakọaka n’ihe gbasara nchekwa, ọkụ latrik na ngalaba
okporoigwe.
Na mkparịtaụka ha
nwere n’ekwentị na mgbede Wenezde 18 Febụwarị 2026, ndị ndu abụọ ahụ gosipụtara
njikere ha dị ijikọta aka kwalite ngalaba nka na ọrụaka.
N’ozi obi ọchịchị
Naịjirịa wepụtara n’abalị Wenezde, Tinubu na Merz kwuru okwu gbasara atụmatụ
Presidential Power Initiative, bụ nke Tinubu kwuru na Naịjirịa ga-achọ enyemaka
maka nkesa ọkụ latrik.
Ozi ahụ kwuru na Chanselọ mba Jamini kwere nkwa na ụlọọrụ Siemens ga-adị njikere inye aka na ngalaba ahụ, ebe ụlọakụ Deutsche Bank ga-adị njikere iji ego kwado atụmatụ ndị ahụ.
Onyeisiala Tinubu kpọkwara oku ka e zitere mpaghara Sahel ụgbọelu helikọpta ndị e jirila mee ihe iji nye aka n’ihe gbasara nchekwa na mpaghara ahụ.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu!
Ka ụbọchị taa mịtara gị mkpụrụ ọma.
Nnọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 19 Febụwarị, 2026.
Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ
si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa.
Oke osisi dara n'ebe Awhum 'monastery' ma gbuo mmafụ karịrị ise
Ebe foto si, Enugu state police command
Akwa akwa na iru uju na-ada ugbua n'Obodo Awhum dị n'okpuru ọchịchị Udi n'Enugwu steeti, Naịjirịa maka na otu osisi dara ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ ruru iri na otu.
Nnukwu ọdachi a mere n'ụbọchị Tuzd, Feb 17, 2026.
Ọ bụ nnukwu osisi a na-akpọ 'Ukwu akpụ" bụ ihe dara ma dagbuo ndị na-eme njem nọ n'ụgbọala.
Oge BBC rutere n'ahia Awhum, bụ ebe mkpamkpa kpara, ụzụ akwa ka na-ada ebe niile.
Cheta na nke a na-eme
dịka ndị omeiwu mere ka ụlọọrụ INEC nweike ijiri usoro akụrụngwa ‘elektọnịk’
nakwa iji aka nkịtị nke a kpọrọ 'manụal' n'olu bekee na-edekọ mpụtara na ntuliaka.
Ndị omeiwu
ekweteghị ka e mee ka ọ bụrụ iwu na ụlọọrụ Independent National Electoral
Commission (INEC) ga-ejiriri naanị akụrụngwa
‘eletrọnịk’ nwere na-eziga mpụtara ntuliaka n’IREV ka a tụchara vootu.
Rọshịa na Yukren: mparịtaụka akwụsịla mana e nwetabeghị udo
Ebe foto si, Reuters
Mkparịtaụka mba Rọshịa na Yukren na-enwe abịala na njedebe mana mba abụọ ahụ enwebeghị udo.
N’agbenyighị na Rọshịa na Yukren nwere ọtụtụ ihe ha kwekọrịtara,
nke gụnyere “ihe gbasara ‘ndịagha, nkwụsịtụ ịkwa mgbọ, ntọhapụ ndị e jidere n’agha”.
Ihe ọzọ
na-ese okwu nke ha na-enweghị nkwekọrịta maka ya gunyere mpaghara Donbas (ya bụ
Donetsk na Luhansk) nke mba Rọshịa chọrọ ka ha were ma na-ahụ maka ya.
Aka akparala nwaanyị sụgburu di ya bụ onye ọrụ 'Immigration' n'Umuahia
Ebe foto si, Abia State Police/Getty Images
Ndị
uweojii Abia Steeti sị ha anwuchiela otu nwaanyị ji mma sụgbuo di ya bụ onye ọrụ
‘Immigration n’Umuahia maka ebubo ịgba n’ezi.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maureen Chinaka kwuru na nwaanyị na na
ngalaba ndị uweojii CID maka “ebubo igbu mmadụ” dịka nnyocha na-aga n’ihu.
Akụkọ
kwuru na ihe a malitere dịka esemokwu n’etiti di na nwunye ahụ mechara bute ọnwụ
onye ọrụ ‘immigration’ a na-arụ ọrụ n’Umuahia a kpọrọ Chidiebere James, site na
nghọtahie ya na nwunye ya.
Nke a
mere n’ụlọ ha dị n’obodo Umuihi, Umuogba Ekeoba dị n’Ohuhu nke okpuruọchịchị
Umuahia North nke steeti ahụ.
Anya hụrụ ka ihe a si mee ma bụrụkwa onye ezinaụlọ ahụ kwuru
na nwunye Chidebere sụrụ ya mma n’isi ụtụtụ Mọnde.
O kwuru na nsogbu dapụtara na Sọnde, mgbe di na nwunye ahụ
nwechara nrụrịtaụka banyere ahụike nwa ha nke e boro ebubo na nwoke ahụ eweteghi
ego e ji akwụ ụgwọ ahụike nwa ha.
Nwunye ya gakwara n’ihu boo ya ebubo ịgba n’ezi n’ihi ozi
ndị dị aṅaa ọ bụrụ n’ekwentị
di ya bụ nke a sị na ndị ezinaụlọ mechara kpezie.
Mana esemokwu
ha malitere ọzọ n’ụtụtụ Mọnde nke butere ọgụ na mmebi ekwentị. Ọ bụ
n’oge ahụ ka nwaanyị weere mkpa sụọ di ya n’ahụ, ọ dara n’ala , e buru ya gawa
n’ụlọọgwụ mana o mechara nwụọ.