Ego ole ka ndị Sịnetọ Naịjirịa na-eri n’ụgwọọnwa kpọmkwem?

Ebe foto si, Senate President
Okwu banyere ego ole ndị omeiwu Naịjirịa na-eri n’ụgwoọnwa bụ okwu a kpụụ n’ọnụ ugbua na Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị chiburu n’oge gara aga dịka Olusegun Obasanjo rụtụrụ aka na ọ bụ ndị omeiwu na-eji aka ha ekpebi ego ole ụgwọọnwa ga-abụ. Shehu Sani bụbu Sịnetọ na mpaghara Kaduna Steeti wepụtara ozi ma kwuo na ndị Sịnetọ na-anata ụgwọọnwa ruru nde naịra iri na atọ (N13.5m) kwa ọnwa.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị omeiwu Sịnetị bụ Yemi Adaramodu katọrọ ihe Obasanjo kwuru ma sị na ọ bụghị eziokwu na ha na-eji aka ha ekpebi ego ole a ga-akwụ ha dịka ụgwọọnwa.
Kama Adaramodu ekwupụtaghi ego ole ha na-eri dịka ụgwọọnwa maọbụ ego mgbakwụnye ndị na-eso ya.
‘Ndị Sịnetọ na-eri otu nde naịra’
Ụlọọrụ na-ahụ maka ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ bụ Revenue Mobilization and Fiscal Commission (RMAFC) kọwara ego ole ndị ụlọomeiwu Sịnetị na-eri n’ụgwọ ọnwa.
Onyeisi ulọọrụ a bụ M.B Shehu kwuru na mgbakọta egoọnwa na nke mgbakwụnye ndị Sịnetọ na-eri pụtara otu nde naịra, puku iri isii na atọ na narị asatọ na iri isii (N1,063,860) kwa ọnwa.
Na nkesa ego ụgwọọnwa gụnyere;
- Ụgwọ ọnwa bụ - N168,866,
- Ego mmanụ ụgbọala - N126,650,
- Ego ndị enyemaka - N42,216,
- Ego ndị ọrụ ụlọ N126,650,
- Ego inwe aṅụrị (entertainment) - N50,660,
- Ụgwọ ọkụ, mmiri na ndị ọzo – N50,660,
- Ego akwụkwọ akụkọ (newspapers) – N25,330
- Ego uwe – N42,216,66
- Ego ilekọta ụlọ obibi – N8,443,33
- Ego ‘nrụpụta ihe (constituency allowance) – N422,166,66
Lee ego ole ndị Sịnetọ kwuru ha na-anata

Otu Sịnetọ nke pati New Nigeria Peoples Party (NNPP) na Kano steetị bụ Abdurrahman Kawu Sumaila ka nọ n’ọkwa ọchịchị ugbua sị na eziokwu bụ na ego ndị omeiwu na-anata kwa ọnwa dịka ụgwọọnwa erughi otu nde naịra.
“Ụgwọọnwa anyị na-anata erughi otu nde naịra, ọ bụrụ na e sepu ụfọdụ ego n’ime ya, ọ na-abụ ihe dịka puku narị naịra isii (N600,000)," ka Sịnetọ a kwuru.
O kwuru na ụlọọrụ na-ahụ maka ego a na-akwụ ha bụ RMAFC na-egbubi ụgwọọnwa ha.
Mana Sịnetọ a bụ onye pati na-anọghị n’ọchịchị kwuru na ego ọrụ a kpọro ‘administrative fee’ ọ na-anata dịka Sịnetọ bụ nde naịra iri abụọ na otu (N21m) kwa ọnwa.
“N’ihi mgbanwe n’ụlọomeiwu, otu Sịnetọ na-anata ego dị nde naịra iri abụọ na otu (N21m) kwa ọnwa dịka ego e ji arụ ọrụ,” ka o kwuru.
Ọ gbakwụnyere na ego niile ọ na-enwete kwa ọnwa bụ nde naịra iri abụọ (N22m) dịka Sịnetọ.
“Amaghị m maka ego ọzọ a na-akwụ m dịka Sịnetọ,” ka o kwuru.
Ọ gara n’ihu kwuo na ego ndị ahụ gụnyere ego iji eme njem na Naịjirịa, ịzụta akwụkwọ akụkọ, ịkwụ ndị enyemaka ya ụgwọ dgz.
O kwuru na ọ maghị ego ole ndị ndu n’ụlọomeiwu na-anata dịka ụgwọọnwa na ego mgbakwụnye.










