Onyeisi ụlọomeiwu nta alaala azụ n'iwu ọ na-akwadobu iwepụta

Tajudeen Abbas

Ebe foto si, FB/Tajudeen Abbas

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Tajudeen Abbass bụ onyeisi ụlọomeiwu nta atụgharịala uche ma kwụsị iwu ọ na-akwadobu iweputa akpọrọ counter subversion bill.

Ozi o weputara kọwara na o mere nke a n'ihi nkata na izu ya na ụfọdụ ndị ọ ga-emetụta nwere nakwa ọnọdụ ala Naịjirịa ugbua.

"Mkpebi a gosiri ebe uche ndị omeiwu nọ n'ịdebe onwe ha ndị na-arụrụ ụmụ Naịjirịa ọrụ ka ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Musa Abdullahi Krishi binyere aka.

O hụrụ mkpọtụ niile ndị mmadụ mere maka iwu a ma kwuo na ọ gaghị eme ihe ọbụla ga-emebi udo na ndịnotu Naịjirịa.

Cheta na ndị mmadụ malitere ịkatọ iwu ahụ na soshal midia ma na-akpọ oku ka apịnyụọ ya ngwa ngwa.

Ndị ọzọ kwukwara na iwu ahụ enweghi isi n'ihi na o megidere Iwu ala Naịjirịai n'onwe ya.

Lee ntaramahụhụ ga-adịrị ndị na-achọ ikewapụ na Naịjirịa n'iwu ọhụrụ ndịomeiwu chọrọ imepụta

Tajudeen Abbas, Sunday Igboho na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, House of Reps/Igboho/Getty

Ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa na-achọ ka a tụọ onye maọbụ otu ọbụla na-achọ ikewapụ na Naịjirịa mkpọro afọ 25 maọbụ ọ kwụọ nde naịra iri (N10m).

Nke a dị n’akwụkwọ atụmatụ iwu a kpọro ‘Counter Subversion Bill 2024’ ha wepụtara nke Onyeisi ha bụ Tajudeen Abbas na-akwado.

Dịka ọ dị ugbua, atụmatụ iwu agafeela ngụpụta nke mbụ ma na-akwado ịgafe nke abụọ n’ụlọomeiwu nta.

Mana tupu e mee ka ọ bụrụ iwu, a ga-ebu ụzọ rụrịtaa ụka banyere ya n'ụlọomeiwu tupu ọ gafee ngụpụta nke abụọ.

Ụfọdụ ihe dị n'atụmatụ iwu a

  • Onye maọbụ otu ọbụla na-achọ nwereonwe maọbụ na-eme mgbasaozi banyere nwereonwe, nkewapụta na Naịjirịa ga-aga mkpọrọ afọ 25 maọbụ kwụọ nde naịra iri (N10m) maọbụ mee ha abụọ.
  • Onye ọbụla jụrụ ịgụ abụ na nkwa njirimaara Naịjirịa, mebie ọkọlọtọ maọbụ ebe okpukperechi nke nwereike ibute ọghaghara ga-aga mkpọrọ afọ iri maọbụ kwụọ nde naịra ise (N5m) maọbụ ha abụọ.
  • Iwu a kwuru na onye ọbụla dochiri ihe n’okporoụzọ nke iwu na-akwadoghi maọbụ bute kpachikpachi okporoụzọ maọbụ tinye iwu ịnọ n’ụlọ, ngagharị nke iwu na-akwadoghi ga-aga mkpọrọ afọ ise maọbụ kwụọ nde naịra abụọ (N2m) maọbụ mee ha abụọ.
  • Iwu kwuru na onye ọbụla katọrọ ọchịchị gọọmentị etiti, steeti na nke okpuruọchịchị tinyere ndị ndu obodo, okpukperechi n’ụzọ mkparị ga-aga mkpọro afọ abụọ maọbụ kwụọ nde naịra anọ (N4m) maọbụ mee ha abụọ.
  • Onye ọbụla kpachiri ebe okpukperechi, ụlọ ọgbakọ ozuzu, ụlọakwụkwọ nakwa ama ọha n’ike nke nwereike ibute ọgbaghara ga-aga mkpọro afọ iri maọbụ kwụọ nde naịra ise (N5m) maọbụ ha abụọ.'
  • Onye natara nkwado ego maọbụ nke ndọrọ ndọro si n’aka otu maọbụ mba ofesi nke na-agaghị ewulite, mepee ọnọdụ maọbu nchekwa Naịjirịa ga-aga mkpọrọ afọ iri abụọ maọbụ kwụọ nde naịra iri (N10m) maọbụ mee ha abụọ.
  • Onye ọbụla nwee, ji, na-ebubata ma na-ekesa uwe ndịagha, ndị uweojii nakwa njirimaara ndị ọrụ nchekwa ọbụla ga-aga mkpọrọ afọ abụọ maọbụ kwụọ nde naịra abụọ (N2m) maọbụ mee ha abụọ.

Kedụ ndị ọ ga-emetụta?

Ndị ekperima na-awakpokaarị mpaghara Ugwu nke Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Atụmatụ iwu, ọ bụru na e mee ka ọ bụru iwu ga-emetụta otu nakwa ndị ndị iche iche gụnyere;

Otu ọbụla na-achọ nwereonwa ha site n’ikewapụ na Naịjirịa ndị dịka Indigenous People of Biafra (Ipob), Movement for the Actualization of Sovereign State of Biafra (Massob) na Biafra Zionist Movement (BZM) bụ ndị na-achọ nwereonwe Biafra, otu Oduduwa na Yoruba Nations bụ ndị na-achọ nwereonwe ndị Yoruba.

Ndị ọzọ bụ ndị ekperima (bandit), otu nzuzo nakwa otu iche iche bụ nke gọọmentị kpọpụtara dịka ndị na-eyi ndụ egwu