Ndịagha Naịjirịa ekwuola okwu maka mwakpo e mere n'ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti

Ndịagha Oyo Steeti zọpụrụ njem ozugbo ha nwetara ozi ahụ gaa n’ogige ahụ dị na Agodi Ibadan, isi obodo Oyo Steeti.

Ebe foto si, NIGERIAN ARMY/X

Nkọwa foto, Ndịagha Oyo Steeti zọpụrụ njem ozugbo ha nwetara ozi ahụ gaa n’ogige ahụ dị na Agodi Ibadan, isi obodo Oyo Steeti.

Ndịagha Naịjirịa ekwuola okwu banyere mwakpo ndị na-achọ nnwereonwe Yoruba mere n’ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti.

N’ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuru ndị ndịagha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu, ọ sịrị na ndịagha Oyo Steeti zọpụrụ njem ozugbo ha nwetara ozi ahụ gaa n’ogige ahụ dị na Agodi Ibadan, isi obodo Oyo Steeti.

Dịka ozi ahụ siri kwuo, ngwangwa ha hụrụ ndịagha Naịjirịa, ha malitere ịgba ha egbe mana ndịagha ahụ meriri ha, nwụchie mmadụ itolu n’ime ha ma napụta ha ngwaọgụ dị iche iche.

Ka ọ dị ugbua ndịagha na-agba onye ọbụla ume ka ha dere duu dịka ha na-agba mbọ inwuchi ndị nke gbara ọsọ.

Sunday Igboho: Aka m adịghị na mwakpo e mere n'ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti

Ndị Odua Nationa na Sunday Igboho

Ebe foto si, Screengrab/Sunday Igbo/Instagram

Onye ndu otu 'Yoruba Nation' bụ Sunday Adeyemi a ma ama dịka 'Sunday Igboho' ekwuola n'aka ya adịghị na mwakpo e mere obi Gọvanọ Oyo steeti n'ụbọchị Satode.

Ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu nnwereonwe ala Yoroba kpọrọ onwe ha, 'Oodua Nation na-eme ngagharịiwe, wakporo ogige ụlọọrụ gọvanọ Oyo state n'ụtụtụ Satode, mebie ọkọlọtọ a kwụnyere n'Ụlọomeiwu Steeti ahụ. '

N'ozi nke o wepụtara n'akara ọbaozi ya n'Instagram n'ehihe Satode, Sunday Igboho kwuru na ihe ahụ mere bụ aka ọrụ ndị ji aha otu ha arụ ala.

Ọ sịrị : Aka m adịghị ya."

"O nweghị onye otu 'Oduduwa Nation' ga-anwali ụdị ihe dị otu a."

" Ana m ebeku gọọmentị steeti ka ha maa imi n'ala, nyocha mata ndị ahụ ji aha ndị ọzọ akpa mkpa mkpa."

Ozi Sunday Igboho

Ebe foto si, Sunday Igboho/Instagram

Ndị otu 'Oodua Nation' awakpoola ụlọọrụ Gọvanọ Oyo steeti

Otu na ndị mere ngagharịiwe

Ebe foto si, Screengrab

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na ndị a na-enyo na ha bụ ndị otu na-alụ ọgụ maka nnwereonwe ala Yoroba a kpọrọ 'Odua Nation' awakpoola obi Gọvanọ Oyo Steeti dị n'Ibadan isiobodo steeti ahụ.

Ndị ahụ ji ngwaọgụ wụbara n'ugbo dị n'ụlọọrụ gọvanọ steeti ahụ bụ Seyi Makinde n'ụtụtụ Satode(13/4/2024).

Ha gakwara n'ụlọomeiwu steeti ahụ mebie ọkọlọtọ Naijiria .

BBC Yoruba kwuru na ndị ahụ na-eme ngagharịiwe hapụrụ ụlọomeiwu mebie ọkọlọtọ tupu ndịagha awụchie.

A hụrụ ka ndị ahụ yi akwa ndịagha dịka ha na-eme ngagharịiwe.

N'otu aka ahụ, ndị uweojii kụrụ ụfọdụ n'ime ndị na-eme ngagrịiwe ihe ha tọgbọrọ n'ugbọ ahụ dị n'ogige ụlọọrụ gọvanọ.

Onye ndụmọdụ gọvanọ Oyo Steeti n'okwu metụtara ọdịmma ụmụnwaanyị bụ Fatia Owoseni kwuru na aka akparala mmadụ 16 so mee ngagharịiwe ahụ.

Onye ndụmọdụ ọzọ bụ Abosede Sodiq kwukwara na ya bụ ihe mere n'ezie.

O kwuru na ndị ahụ na-eme ngagharịiwe malitere gbawa egbe oge ha wụbara n'ugbo Gọvanọ Oyo Steeti.

O gara n'ihu kwuo na aka ndị ọrụ nchekwa akparala ọtụtụ ndị so mee ngagharịiwe ahụ.

"Anyị na-akpọku ụmụamala ka ha saa anya mmiri n' ụdị ndị a maka na ha yi uwe ndịagha."

Ka ọ dị ugbua, ndị nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha na ndị Amotekun abịala were ọnọdụ n'ọtụtụ ebe na steeti ahụ dịka udo lọghachiri.