Supreme Court Judgement: Lee ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe, ekpere ka a kpọghachi Ihedioha

Aha onyonyo, Ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe maka nchụda Ihedioha

Ụmụnwaanyị Imo emeela ngaghariwe na-akpo oku Ụlọikpe Kachasi kpegharia ikpe ha kpere wa kpọchigha Emeka Ihedioha dịka Gọvanọ Imo steeti.

Ngaghariiwe ahụ nke otu pati PDOPP na steeti ahụ n'ọ n'isi ya ghọrọ ọnọdụ ekpere maka ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ nke otu pati APC weghaara na nso a.

Otu ọgbakọ ekpere a bụ nke e hiwere n'ógbè okputọrọ ọkpụ a kpọrọ 'Ugwu Ekwema' n'Owere, dọtara ọtụtụ mmadụ dị iche iche sitere otu kansulu iri na asaa nke steeti ahụ.

Ụmụnwaanyị Imo steeti

Ndị otu pati a bụ ndị yi uwe ojii iji gosi ka obi dị ha kwuru na ha na-eme nke a iji chọọ ihu Chineke maka ikpe ahụ nke uloomeiwu kachasị elu kpebiri.

Ha kwuru na ha kwenyere na Chineke ga-emetu ndị ọkà ikpe ahụ aka n'obi iji kpegharia ikpe ahụ dịka ha siri chọọ.

Aga-echeta na ndị otu pati a nooro n'izu gara aga ma mee ngagharị iwe iji gosipụta iwe ha n'ebe nchabi ikpe ahụ dị.

Ụmụnwaanyị Imo steeti

Cheta na ụlọikpe Kachasị nọrọ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị chutuo Emeka Ihedioha n’ọkwa gọvanọ ma were ya nye Hope Uzodinma.

Akụkọ ga-amasị gị: