Junior Pope: Ụlọomeiwu Anambra etiela iwu 'life jacket' maka njem ụgbọmmiri

Junior Pope

Ebe foto si, Junior page/Instagram

Ka izuụka ole na ole gachara onye ihe ejije Nollywood bụ Obunaeme Odonwodo a ma dịka Junior Pope nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri n'Anambara steeti, Ụlọomebeiwu steeti ahụ akpalitela atụmatụ iwu ga-eme ya iwu iyi akwa nchekwa na a na-eme njem ụgbọmmiri.

Ụlọomebeiwu Anambara steeti nọrọ n'ụbọchị Tuzdee 14 Mee 2024, wepụta akwụkwọ iwu ga-amanye iyi akwa nchekwa n'ụgbọmmiri ma a na-eme njem mmiri na steeti ahụ.

Onye kwadoro iwu ahụ bụ Mazị Ikenna Ofodeme, onye na-anọchite anya Ekwusigo Constituency kwuru na ọtụtụ mmadụ anwụọla n'ihi ihe mberede mere n'elu mmiri n'ihi na ndị njem na ndị na-anya ụgbọmmiri anaghị eji akwa nchekwa eme njem.

Mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ, Mazị Nigeria Henry Mbachu onye na-anọchite anya Awka Constitutency 1 kwuru na e zigala akwụkwọ iwu ahụ n'obi Gọvanọ steeti ahu bụ Chukwuma Soludo.

Mazị Mbachu kwuru na a na-atụ anya na Gọvanọ Soludo ga-ebinye aka n'akwụkwọ iwu ahụ ma nye iwu ka ụlọọrụ na-ahụ maka njem ụgbọmmiri na steeti ahụ machie njem ọbụla a na-ejighị akwa nchekwa eme.

Cheta na onye na-eme ihe ejije a ma ama bụ Junior Pope mara na mmadụ anọ ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri ụbọchị wenezde 10 Eprelụ na osimiri River Niger.

Ọnwụ ha bụ nke kpalitere ọtụtụ mmadụ na-akpọ oku banyere njem ụgbọmmiri na Naịjirịa.

Lee etu e si akwado maka oliliozu Junior Pope

Junior Pope

Ebe foto si, JUNIOR POPE/INSTAGRAM

Otu jikọtara ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) ahọpụtala ndị nnọchiteanya 30 site na steeti ise maka oliliozu Junior Pope.

Onyeisioche AGN bụ Emeka Rollas kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’akara ọbaozi Instagram ya banyere nkwado a na-eme maka oliliozu onye otu ha ahụ nwụrụ anwụ.

Dịka Emeka Rollas Rollas siri kwuo, steeti ise ndị ahụ gụnyere Delta, Imo, Abịa, Anambra na Enugwu.

O kwuru na agaghị enye onye ọbụla ohere ise foto maọbụ onyonyoo aghara aghara ebe ndị ọrụ mgbasaozi ga-ebu ụzọ nata ikike n’aka ezinaụlọ ya tupu enye ha ohere.

Lee nkwa E money kwere ụmụ Jnr Pope

Photo gosiri Jnr Pope na E money nakwa Kcee

Ebe foto si, @iamemoney/instagram

Onye ji ego achụ ego a ma ama bụ E Money na nwanne ya nwoke otiegwu bụị Kcee ekwela ezinaụlọ Jnr Pope nwụrụ anwụ nkwa ukwu.

E money ezi aha ya bụ Emeka Okonkow depụtara nke a n'akara Instagram ya na-egosi mwute ya maka ọnwụ Pope ma kwee kwa ya nkwa na ezinaụlọ ya ewerela ihe dị n'ịlkọta ụmụ ya.

"Ụmụ gị ga-achọta ezumike n'ahụ ezinaụlọ Okonkow dịka anyị na-ekwe nkwa ịzụ ha dịka ị sị chọbuo" ka Okonkwo dere.

Nke a na-abịa dịka o mere otu izu kemgbe omeiheonyonyo a ma ama nwụrụ n'ihe mberede ụgbọ mmiri.

Ihe mberede ahụ takwara isi mmadụ anọ ọzọ so nọrọ na ya bụ ụgbọ bụkwa ndị ha na Pope na-arụ ọrụ ihe onyonyo mgbe ha nwụrụ.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post, 1

E liela ozu Abigail Frederick so Junior Pope nwụọ n'ihe mberede ụgbọmmiri na steeti ya

Mgbe e liri Abigail nwụrụ na mberede ụgbọmmiri

Ebe foto si, Ubong Creativity David Blog

E liela ozu nwada Abigail Frederick bụ onye na-achọ ndị Nollywood mma a kpọro 'makeup artist' so nwụọ n'ihe mberede ụgbọmmiri ahụ gburu Junior Pope na mmadụ anọ n'osimmiri Naịja.

E liri ozu nwada a n'obodo ya bụ Ikot Udoma, nke okpuruọchịchị Eket dị n'Akwa Ibom.

Ọ bụ ndị ụlọụka Church of Christ haziri ofufe olili ya bụ nke ọtụtụ ndị ọrụ gọomentị Akwa Ibom Steeti bịara.

Cheta na e liburu ya n'akụkụ mmiri maka na ezinaụlọ ya enweghi ego ha ji emekọ mmụọ mmiri, mana gọọmentị Akwa Ibom nyere iwu ka a bọpụta ozu ya ma buru ya bịa lie na steeti ha.

Naanị mmadụ atọ so Junior Pope nwụọ ka e liri n'akụkụ mmiri - Ndị uweojii

Abigail na Junior Pope

Ebe foto si, Abigail/Junior Pope/Instagram

Ndị uweoji na Anambra steeti emeela ka a mata na ọ bụ naani mmadu atọ n’ime mmadu ise ahụ nwụrụ n’ihe mberede ugbọmmiri mere n’izuụka gara aga ka e liri n’akụkụ mmiri ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na steeti ahụ bụ Ikenga Tochukwu kwuputara nke a n’ụbọchi Sọnde 14 Eprel. O mere ka a mara na ọ bụ ezinaụlọ mmadu ato kwetara ka e lie ndị nke ha n’akụkụ mmiri ahu.

N’okwu ya, ọ siri na ezinaụlọ nwagbogho ahụ nwụrụ biara bọpụta ozu ya ebe ozu onye ahụ na-eme ejije a ma ama bụ Junior Pope na ndị ozo ka dọrọ n’obaozu.

Ka o dị ugbua, onye na-emepụta ihe oyoyo ahụ na mmadu abuo kpụrụ n’ụgbọmmiri ahụ agwala ndị uweoji ka ihe ahụ ee mee.

Ikenga gbara ama na ndị uweojii steeti ahụ na-eme nyocha iji chọpụta ihe kpatara mbered ahụ tara isi ụmụ amaala ahụ.

A nwuchiela ndị ọrụ ụgbọmmiri Junior Pope nwụrụ na ya

Junior Pope

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram

Akụkọ na-eru anyị nti ugbua na-ekwu na ndị uweojii anwụchiela ndị ọrụ ụgbọmmiri kpuru ma taa isi mmadụ ise gụnyere onye ejije Nollywood a ma ama bụ Obuneme Odonwodo a ma dịka Junior Pope.

Ihe mberede ụgbọmmiri tara isi Junior Pope na mmadụ anọ ndị ọzọ n'ụbọchị Wenezde oge ha si Asaba ,Delta Steeti ebe ha gara ime ejije na mba mmiri dị na Anambara West alọta.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC n'ekwentị na a nwụchiri ha n'ezie.

Ọ sịrị, " A nwụchiela mmadụ abụọ bụ ndị na-akwọ ụgbọmmiri nwere mberede."

"Ha edeela ihe ha ma maka ihe merenụ."

Ikenga, onye kwuru na a nwuchiri ha ụnyahụ bụ Fraide, gara n'ihu kwuo na onye nwe ejije ahụ Junior Pope gara ime tupu ọ nwụọ bụ Adanma Luke ji aka ya nyefee ndị uweojii onwe ya.

O kwukwara na ha ga-akpọ ndị ọzọ so n'ihe ejije ahụ maka ịgba ha ajụjụ ọnụ.

Akụkọ ka na-abịa.

"Junior Pope gbara mbọ ịzọpụta ndị ọzọ na mmiri" - Adanma Luke
Adanma Luke

Ebe foto si, Adanma Luke Instagram

Nkọwa foto, Onye nwe onyonyo Jnr Pope na ndị ọzọ na-eme tupu ọnwụ ha
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Adanma Luke bụ onye nwe onyonyo 'The other side of Life' nke Jnr Pope na ndị ọzọ nwụrụ na mmiri nọ na ya ekwuola okwu banyere etu ihe ahụ siri mee.

Adanma Luke kwuru okwu n'ihe onyonyo atọ o zipụtara n'akara ya n'Instagram bụ ebe ọ nọ jiri anya mmiri kwaa arịrị ihe ọjọọ ahụ dakwasịrị ya.

Ọ sịrị na ya nụrụ na Junior Pope gbara mgbọ ịzọpụta ndị ọzọ tupu mmiri erie ya.

O kwuru na ya nụrụ na e nyere Junior Pope uwe nchekwa 'life jacket' n'oge ọ na-abanye n'ime ụgbọmmiri mana ọ jụrụ iwere ya n'ihi na ọ sịrị na ọ dịghị ọcha.

O kwuru na ya agbaghị nkịtị gbasara ihe mere kama ya na-enye aka ịhụ na a chọtara ozu ndị ọzọ mmiri ahụ riri ma ha na e liri ndị a ga-eli ma bulakwa ndị e kwesiri ibula ozu ha.

N'onyonyo ahụ ọ jụrụ ajụjụ 'Gịnị ka o ji bụrụ m?'

N'okwu ya; 'ọ bụrụ na m ma, agaara m ịnọ na Legọs see ihe onyonyo m ghara ịga Asaba. Nke a bụ mbụ m na-eme onyonyo n'Asaba.'

'Ekwesiri m ịnọ n'ụgbọmmiri ahụ kpuru mana onye ọrụ m kpọrọ m ka m wetara ya kaadị ha ji ese onyonyo.'

O kwuru na ya na-enyere ndị uweojii aka na nyocha ha banyere mkpamkpa ahụ kpara.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post, 2

Junior Pope: A hụla ozu mmadụ atọ na-efubu efu

Junior Pope, Abigail

Ebe foto si, Junior Pope,Abigail/Instagram

A hụla ozu mmadụ abụọ ọzọ soro na ndị mmiri riri n'ihe mberede ụgbọmmiri tara isi onye ihe ejije a ma ama bụ Pope Obunaeme Nwodod a ma dịka 'Junior Pope'.

Ihe mberede ụgbọmmiri tara isi onye ihe ejije a ma ama bụ JohnPaul Obunaeme Odonwodo a ma dịka 'Junior Pope n'ụbọchị Wenezde oge ya na ndị ogbo ya si Asaba ,Delta Steeti ebe ha gara ime ejije na mba mmiri dị na Anambara West alọta.

N'ime mmadụ 12 ihe mbederede ahụ dagidere, a zọpụtara mmadụ asaa na ndụ, ebe a hụrụ ozu mmadụ abụọ, ma na-achọ mmadụ atọ achọ.

Mana ndị uweojii Anambara Steeti gbara ama n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide na ahụla ozu mmadụ abụọ ọzọ, ebe otu onye ka na-efu efu.

Ozi ahụ kwuru sị, "Ndị uweojii mmiri nke Anambara steeti ahụla ozu mmadụ atọ fọrọ na ihe mberede ụgbọmmiri."

“Ndị uweojii mmiri nke Anambara steeti enwetaala ozu mmadụ atọ fọọ na ọdachi ụgbọmmiri mere ndị ejije."

“A hụrụ ozu mmadụ abụọ ụnyaahụ(Tọzde) abalị 11 nke ọnwa Eprelu, 2024, ebe mmiri bupụtara otu ozu fọrọ n'ụtụtụ taa bụ Frade."

Ọ gara n'ihu kwuo na a dọnyela ozu ndị a n'ile n'ụlọozu dị n'Asaba.

Ihe Kenneth Okonkwo, Ini Edo, Jim Iyke na ndị Nollywood ọzọ na-ekwu maka ọnwụ Junior Pope

Jim Iyke, Ini Edo na Kenneth Okonkwo

Ebe foto si, Jim Iyke /Ini Edo/Kenneth Okonkwo/Instagram

Dịka arịrị juru ndị na-eme ihe ejije Nollywood afọ ka mmiri ụkwa n'ihi ọnwụ onye ejije a ma ama bụ Obuneme Pope Odonwodo a ma dka Junior, ọtụtụ n'ime ha akpọọla oku ka ehiwe otu ga na-ahazi ihe a na-eme na Nollywood na Naijiria.

Junior Pope nwụrụ n’ihe mberede ụgbọmmiri n’Asaba, Delta Steeti ebe ọ gara ime ihe ejije n'ụbọchị Wenezde.

Akụkọ kwuru na ọ nwụrụ dịka ụgbọmmir ha so aga njem n'elu mmiri na ọzọ sukọtara isi nke mere ka ụgbọ ha kpuo.

Mmiri riri junior Pope onye e nwetara ahụ ya, ebe a ka na-achịọ mmadụ anọ ndị ọzọ.

Junior Pope

Ebe foto si, Junior Pope Odonwodo

Nke a kpalitere obi iru ụjụ dịka ndị mmadụ gụnyere ndị otu ya na-akwa arịị maka ọnwụ erughị eru ya bụ nke a na-arụtụ aka aọ gaara agbalahụ maọbụrụ na e nwere ezi nchekwa.

Kenneth Okonkwo

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo

Onye ejije nwere agba bụ Kenneth Okonkwo, onye gbara ama na oge gara aga na ya etinyela ndụ ya n'ihe egwu dịka o sorola ụgbọmmiri gaa ime ejije n'elu mmiri 'Takwa Bay' dị na Legọs, kwuru na ụdị itinye ndụ n'ihe egwu ha mere dịka ndị so malite Nollywood ekwesighị ị na-aga n'ihu n'oge ugbua.

" Ihe ekwesịghị ime ọzọ. Ntaramahụhụ kwesịrị ịgara onye ọbụla nwe ejije nyere ohere ka ụdị ọdachie mee."

"Onye ihe ejije agaghị etinye ndụ ya n'ihe egwu ọzọ maka ime ihe ejije."

Ini Edo

Ebe foto si, Ini Edo/Instagram

Ini Edo kwuru na "Junior Pope ekwesịghị iji ndụ ya chụọrọ Nollywood aja tupu aghọta mkpa ọ dị inwe ngalaba na-ahazi ihe ana-eme iji chekwa ndụ ndị otu anyị."

Ik Ogbonna

Ebe foto si, Ik Ogbonna

N'otu aka ahụ, Ik Ogbonna kwuru na ' ọ dị oke mkpa ilebanye anya ngwa ngwa n'okwu nchekwa ndụ na Nollywood."

Ogbonna , onye rụtụrụ aka na ọ bụ nanị oge onye a ma ama nwụụ ka ọha na-anụ maka ya kwuru na ọnwụ junior Pope bụụ ihe ga-akpalite okwu maka nchekwa ndụ n'etiti ndị ọrụ ihe ejije na Naijiria.

Ik Ogbonna

Ebe foto si, Ike Ogbonna/Instagram

Jim Iyke kwuru na ọnwụ Junior Pope "kụpịara m n'ụzọ m aghọtaghị."

Ozi Jim Iyke

Ebe foto si, Jim Iyke/Instagram

Junior Pope: AGN amachiela ọrụ ime ejije niile n’ụbọchị Tọzde
Junior Pope nwụrụ n’ihe mberede ụgbọmmiri n’Asaba
Nkọwa foto, Junior Pope nwụrụ n’ihe mberede ụgbọmmiri n’Asaba

Otu jikọtara ndị na-eme ejije 'Nollywood' bụ 'Actors Guild of Nigeria' maọbụ AGN n'ịchafụ Bekee amachiela ime ejije n'ụbọchị Tọzde 11 Eprel 2024 n'ihi ọnwụ onye otu ya bụ Junior Pope.

Ụnyaahụ bụ Wenezde 10 Eprelụ 2024 ka ozi rutere anyị aka banyere ọnwụ nwaafọ Naịjirịa na-eme ejije a maara nke ọma bụ Junior Pope Odonwodo.

N’oge mbụ BBC kpọrọ onyeisi otu na-ahụ maka ndị na-eme ejije Nollywood ‘Actors Guild of Nigeria’ bụ Emeka Rollas n’ekwentị, ọ gwara anyị na “Junior Pope nwụrụ n’ihe mberede ụgbọmmiri n’Asaba.”

Ọ gara n’ihu gwa anyị na ha “ebugala ozu ya n’ọbaozu dị n’Asaba ebe a hụbeghị mmadụ anọ ndị nke ọzọ ihe mberede ahụ metụtara.”

Ka e mesịrị, Rollas gara n’akara ọbaozi Instagram ya wee depụta na Junior Pope, onye a sịbu nwụrụ anwụ dị ndụ.

O dere n'ozi ahụ sị “ọ dịghị ihe Chukwu apụghị ime. Junior Pope dị ndụ, ọ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.”

Mana dịka ọtụtụ awa gasịrị, Emeka Rollas hichapụrụ ozi ahụ o zipụrụ n’akara ọbaozi Instagram ya kwuru na Junior Pope dị ndụ dịka mbọ niile BBC gbara inweta ya kemgbe ahụ kụrụ afọ n’ala.

Kedụ ozi AGN zigaara Nollywood banyere ọnwụ Junior Pope?

1.	Akwụsịla ejije niile a na-eme n’egbere mmiri maọbụ nke a ga-eji ụgbọmmiri eme ruo n’oge amaghị

Ebe foto si, ACTORS GUILD OF NIGERIA

Nkọwa foto, Akwụsịla ejije niile a na-eme n’egbere mmiri maọbụ nke a ga-eji ụgbọmmiri eme ruo n’oge amaghị

‘Actors Guild of Nigeria' (AGN) n’ịchafụ Bekee edegaraala ndị na-eme ejije Nollywood ozi gbasara ọnwụ Junior Pope Odonwodo, onye nwụrụ n’ụbọchị Wenezde 10 Eprel 2024 n’Asaba, isi obodo Delta Steeti.

Ozi ahụ onyeisioche AGN bụ Emeka Rollas wepụtara n’ụbọchị Tọzde 11 Eprel 2024 kwuru na ndị ndu AGN nwere mkpebi ndị a:

1. Akwụsịla ejije niile a na-eme n’egbere mmiri maọbụ nke a ga-eji ụgbọmmiri eme ruo n’oge amaghị.

2. Agaghị eme ejije n’akụkụ Naịjirịa niile n’ụbọchị Tọzde 11 Eprel 2024.

3. Akwụsila ihe niile banyere ejije ahụ a kpọrọ ‘Another Side of Life’ ruo n’oge amaghị.

4. Egbochiela ndị niile na-eme ejije ịrụrụ Adamma Luke ọrụ dịka onye nhazi ha ruo mgbe a ga-enye ha ntuziaka ọhụrụ.