Down-Below: Ihe anyi hụrụ n’ime ogbe ndi omekome n' Umuahia

Bicycle Workshop, Umuahia

Na nsonso a, Gọọmentị Ọkpuruochịchị Umuahia-North kwuru na ha ga-akụrị ọdọ 'Bicycle workshop' dị n'Ụmụahịa maka ihe ha sị ndị a na-enyo enyo jia gburugburu ebe ahụ eme.

Ebe ahụ na-akpo 'Down Below' bu ogbe a na-ahu dịka ebe ndị na-ere ọgwụike nakwa ndi omekome jiri mere ọnọdu n' Umuahia, Abia steeti.

Down Below dị nso 'Bicycle Workshop' nke dị n'azụ ọdụ ugboala Okigwe, Umuahia.

Oge gara aga ka a na-akpo ebe ahụ odu ugboala Ohuhu.

Kọmịshọna ndi uweoji n' Abia steeti bụ Kenechukwu Onwuemelie na onyeisi okpuruochị Umuahia North bụ Victor Ikeji

Ebe foto si, Abia State Police Command

Komishona ndi uweojii n' Abia steeti bụ Kenechukwu Onwuemelie n' onyeisi okpuruochịchị Umuahia North bụ Victor Ikeji gara njem na 'Bicycle Workshop' nq nsonso a ịhụ ihe na-eme na gburugburu ebe ahu.

Dịka onyeisi okpuruochịchị Umuahia-North bụ Victor Ikeji na-ekwuputa ebumnobi ya ịkutu ulo ndị na-adighi mma n' ogbe ahụ ma hazigharia ya ka o nwee ike ịbata ugboala na-ebu ndi njem ndi ozo, Komishọna ndi uweojii n' Abia steeti bụ Kenechukwu Onwuemelie tinyere ọnụ ya na etu ihe na-eme n' ebe ahụ sịrị emetuta nchekwa obodo.

'Ajọ ihe na-eme na 'BicycleWorkshop', Okigwe'- CP

N' ime Bicycle-Workshop, Umuahia

Komisiona ndi uweoji kọwara ogbe ahụ dị ka ebe ndị omekome jiri mere ọnọdụ.

O kwuru na e ji ebe ahu mere ogbe ndi na ele ogwuike, ndị ọrị na ndị omekome dị ịcheịche.

Kenechukwu gara n’ ịrị kwado ịhazịgharị gburugburu ebe ahụ, ma kọwaa na ọ ga- enyere nchekwa obodo aka.

Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n' Abia steeti bụ Maureen Desmond gwara BBC Igbo na “e be ahu bu ogbe ndi omekome a maara ama n' Umuahia”.

Komishọna ndi uweoji na Abia steeti bụ Kenechukwu Onwuemelie na onyeisi okpuruochịchị Umuahia Nọth bụ Victor Ikeji

Ebe foto si, Abia State Police

“ndị na-ere ọgwụ ike, dị na-aṅụ ọgwụ ike na-anọ ebe ahụ. Ndị omekome ndị ọzọ na-anọkwa ebe ahụ.”

“Ọ bụ ịhe ga-abara ọha na eze uru na ọ bụrụ na-agbanwe ọnọdụ ogbe ahụ, rụọ ihe mara mma ga-eme ka ndị omekome ghara ịjị ya mere ọnọdụ.”

Maureen gara n’ ịhụ kwuo na ndị uweojii Abia steeti nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-agba mbọ ịkpochapu ndị omekeme na steeti ahu.

'Anyị na-arịọ Gọọmentị ka e nye anyị ebe ọzọ tupu akukpọ ebe a'

Ụfọdụ na ndị gwara BBC Igbo okwu na 'Bicycle Workshop' kwuru na e kpebibeghị ịkwatu ebe ahụ maka na Gọọmentị gwara ha na ha ga-enwe mkparitauka tupu a kwatuo ya.

Godwin Nwoko na-arụzi anyịnya igwe kwuru na “anyị na ha na-enwe mkparịt uka. "Anyi na-arịọ ha ka e nye anyị ebe ọzọ dị mma anyị nwere ike ịnọrọ na-aruzị anyịnya ihe”

Ihe BBC Igbo huru na gburugburu 'Bicycle Workshop'

Bicycle-workshop, Umuahia

Ngbe onye ntaakụkọ anyi gara n' ogbe ahụ, ọ hụrụ ndi na-aṅụ ọgwụ ịke nakwa ndị na -ere ya ere.

Ulo nịle dị na ogbe ahu adịghị mma, ọtụtụ bụ ulo mmadu ebighị n'ime ya.

Ebe ahụu bụ ọdụ ụgbọala n' ọge gara aga mana ugbua ndị nọ ebe ahụ bụ ndị na arụzi igwe.

Ufodu jiri ulo ndị ahụ mere ebe obibi,ebe ụfọdụ na-ere ahia ndi ọzọ dị iche iche.

Ihe dị iche n' etiti ‘Down Below’ na ‘Bicycle Workshop’

Down-Below dị na ndagwurugwuru .

N'ime ya ka e kwuru a na-ere ọgwụ ịke.

Ndị ụweojii na-aga na 'Down-below' achụ ndi mmadu ọsọ ma kpurukwa ụfọdụ mgbe abụla mgbe.

Ebe 'Bicycle-Workshop' bụ ebe ndị na-arụzi anyịnya na-anọ.

Mana ndị na aṅụ ọgwụịke jịkwara ebe ahụ nwere mere ọnọdụ.