Ebe ndị uweojii kụsara akwụ ndị Ipob/ESN n'Ọwụwa Anyanwụ n'izu a

Ebe foto si, NPF
Ndi uweojii agbaala ama na ha wakporo ma kụsaa akwụ otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ, 'Indigenous People of Biafra'(Ipob) na alaka ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network'(ESN) n'Enugwu nakwa Anambara steeti n'izu a dịka emume Mbilite n'ọnwụ Kraịst na-akpọtụ.
N'Enugwu, ndị uweojii steeti ahụ wakporo ogige ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị IPOB/ESN n'ime obodo Akwuke dị n' Okpuru Ọchịchị Enugwu Steeti ebe ha gbagburu mmadụ abụọ n'ime ha dịka ha kwarịtara mgbọ, ụbọchị Satọde.
N'otu aka ahụ, ndị ogbo ha n'Anambara steeti wakporo ọhịa n'obodo Ogbunka dị n'Okpuru Ọchịchị Orumba South ebe ha hụrụ akwụ ndị a na-enyo na ha bụ ndị Ipob na Alaka ha bụ ESN.
Dịka onye na-ahụ maka mgbasaozi ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe siri kwuo, " Mmadụ abụọ n'ime ndị omekome ndị ahụ nwụụ, ebe ndị ọzọ bu aba mgbọ egbe gbalaga"

Ebe foto si, Anambra Police Command
O gara na ihu kwuo na ihe ndị e nwetara n'aka ha gụnyere ụdị egbe dị iche iche, mgbọ egbe na otu Akwụkwọ Nsọ Gideon.
Ndukwe rụturu aka na ha na-enyo na ndị ahụ bụ ndị na-akpata ọtụtụ mwakpo na ibupụ egbe ndị uweojii na mpaghara.

Ebe foto si, Anambra Police Command
N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga gbara ama dịka ndị ọrụ ha na-ama imi n'ala ịchọta ndị omekome wakporo ogige ndị uweojii abụọ; n'Ọgbụ dị n' Orumba-North nakwa na Neni dị n'Okpuru Aniocha izuụka abụọ gara aga, ha nwetara ogige ndị Ipob/ESN n'ọhịa Ogbunka.
"N'abalị Fraide abalị 29 nke ọnwa Maach, otu jikọrọ ndịagha na ndị uweojii wakporo ọhịa dị n'Ogbunka dị n' Orumba South kụsaa ogige ndị nnupuisi."
"Ndị omekome ahu riri mwomwo ọsọ."

Ebe foto si, Anambra State Police Command
Ihe akaebe ha nwetara ebe ahụ gụnyere ogbuigwe isii, igwe ozi 'Walkie Talkies' abụọ, ngwa nri na ihe ndị ọzọ.
Cheta na kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, tigbuo-zogbuo riri elu n'ọwụwa anya dịka ndị bu ebe na ngwaọgụ ndị ọzọ malitere iwakpo ogige ndịuweojii na ewumewu gọọmentị ma tọrọ ma gbuo ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa na ndị nwere agba.
Gọọmentị Etiti na ndị uweojii boro ebubo na aka ha dị na mkpamkpa ndị a.
Mana Ipob agọọla ọtụtụ mgbe na aka ha adịghị ya.












