Delta Soldiers Killing: Eze obodo so na ndị a na-achọ achọ enyefeela onwe ya n'aka ndị nchekwa

E boro Eze a ebubo ịma maka ogbugbu ndịagha

Ebe foto si, Clement Ikolo/Presidency/Facebook

Ndị uweoji nyefeela eze obodo ahụ na aka ndị agha Naịjirịa

Eze Clement Ikolo nke obodo Ewu dị n'okpuruọchịchị Ughelli South dị na Delta Steeti ewerela onwe ya nyefee n'aka ndị uweojii.

Clement sọ na mmadụ asatọ ndịagha Naịjirịa kpọrọ aha na aka ha dị n'ogbugu e gburu ndị otu ha mmadụ iri na asaa n'obodo Okuama dị na Delta Steeti.

Eze obodo ahụ tupu ọ gaa n'ụlọ ndị ụweojii n'ebe elekere 6:41nke mgbede Tọzde gwara ndị ntaakụkọ okwu sị na aka ya dị ọcha n'ebubo ahụ.

Ndị ụweojii na Delta Steeti kwuru na ọ bụ ezịokwu na Eze obodo ahụ biara nyefee onwe ya n'aka ha.

N'ụtụtụ Tọzde ka ndịagha Naịjirịa kwuru na ha na-achọ mmadụ asatọ achọ maka na aka ha dị n'ogbugbu ndị otu ha mmad ịrị na asatọ n'obodo ahụ.

Mana n'ụtụtụ Fraịde ka ndị uweojii kpọọrọ Eze Clement Ikolo nyefee n'aka ndịagha Naịjirịa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti bụ Bright Edafe kwuru na ọ bụ ezịokwu na ha nyefere Eze Ikolo n'aka ndịagha na-achọ ya achọ.

Ndị ọzọ a na-achọ achọ gụnyere; ọkammụta Ekpekpo Arthur, Andaowei Dennis Bakriri, Akevwru Daniel Omotegbo (ejịri Amagben nwere mara), Akata Malawa David, Sinclear Oliki, Reuben Baru nakwa Igoli Ebi.

Otu onye ọkammụta na ndị ọzo a na-ebo ebubo igbu ndịagha n'Okuama, Delta Steeti
Ndị a na-enyo enyo gburu ndịagha Naịjirịa na Delta Steeti

Ebe foto si, Nigerian Army

Ndịagha Naịjirịa ewepụtala aha mmadụ itoolu ndị ha na-achọ achọ n’ogbugbu ndị otu ha n’Okuama, Delta Steeti n’ụbọchị 14 Maachị 2024.

N’ozi ha wepụtara n’ọbaozi ha na X, na 28 Maachị, gosiri foto na aha mmadụ asatọ ndị a nke gụnyere ụmụnwoke asaa na otu nwaanyị.

Onyeisi nchekwa na Naịjirịa bụ Ọchịagha Christopher Musa dị mbụ kwuo na ndịagha maara ndị aka ha dị n’ogbugbu ndị otu ha mmadụ 17 nke ngalaba 81 Battalion bụ ndị gara ime udo n’obodo Okuama.

N’otu mgbasaozi o mere, o kwuru na e gburu onyendu ndịagha a bụ Colonel A.H Ali na ndị otu ya maka na ha na-agba mbọ ịkwụsị ịdị na-ezu mmanụ agbidi na mpaghara Niger Delta Creeks.

“Anyị maara ndị kpara arụ a, o doro anyị anya na oge na-adịghị anya na anyị ga-anwụchi ha.”

Kedụ ndị e boro ebubo a?

Otu onye ọkammụta na ngalaba Physics na mahadum Abraka bụ Ekpekpo Arthur so na ndị a kpọrọ aha gburu ndịagha a.

Ndị ọzọ gụnyere;

  • AkevwruDaniel Omotegbono (AKA, Amagbem)
  • Andaowei Dennis Bakriri
  • Igoli Ebi
  • Akata Malawa David
  • Sinclear Oliki
  • Clement Ikolo Oghenerukevwe
  • Rueben Baru

A malitela ili ndịagha Naịjirịa e gburu n'Okuama dị na Delta Steeti

Ndịagha e gburu

Ebe foto si, Nigerian Army

Ozu ndịagha Naịjirịa asa e gburu n'obodo Okuama n'okpuruọchịchị Ughelli South Delta Steeti awụchiela ogige ebe a na-eli ozu dị n'Abuja.

A ga-eli ndị a n'usoro e ji eli ndịagha ma kwanyere ha ugwu ikpeazụ.

Bayo Ononuga bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ ga-abịa n'emume ịkwa ozu ndị ahụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

A ga-eli ndịaha Naịjirịa e gburu n'Okuama Delta Steetị na 27 Maachị

Ndị agha nwụrụ anwụ

Ebe foto si, NIG Military HQ

Ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na a ga-eli ndị otu ha mmadụ iri na asaa e gburu n'obodo Okuama dị na Delta Steeti taa bụ ụbọchị 27 Maachị 2024.

Ụlọọrụ a kwuru na a ga-eme akwamozu ha n'ogige ebe a na-eli ozu ndịagha dị n'Abuja n'elekere atọ nke ehihie.

Nke a na-abịa n'ime izuụka ole ma ole ndị ekperima gburu ndịagha Naịjirịa a ngalaba '181 Amphibious Battalion' bụ ndị gara ọrụ imeudo n'etiti obodo Okuama na Okoloba nke Delta steeti.

Onyeisiala Tinubu na ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa katọrọ ogbugbu ndịagha a. Onyeisiala nyere ndịagha ka ha gbaa mbọ chọpụta ndị kpara arụ a.

A na-atụ anya na Onyeisiala Tinubu ga-aga akwamozu ndịagha a iji kwanyere ha ugwu ikpeazụ.

Ihu, aha na ọkwa ndịagha Naịjirịa e gburu

Isi ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa ewepụtala aha ndịagha mmadụ iri na asaa bụ ndị e gburu na mwakpo a wakporo ndịagha na Delta Steeti.

E gburu ndịagha ahụ n'izuụka gara aga n'obodo Okuama dị n'okpuru ọchịchị Ughelli Saụt nke steeti ahụ.

Dịka mgbasaozi ndịagha siri kwuo, ndịagha ahụ e gburu bụ ndị gara ikpe udo n'etiti obodo ndị na-enwe esemokwu oge ndị ntoroọbịa obodo ahụ wakporo ha ma gbuo ndịagha mmadị iri na asaa.

Ka abalị ole na ole gachara mwakpo ahụ mere, isi ụlọọru nchekwa ewepụtala aha ndị nwụrụ na ya bụ mkpamkpa kpara gụnyere onye ọchịagha nke ọgba 181 Amphibious Batallion, majo abụọ, otu kaptin, ndịagha mmadị iri na abụọ.

Aha ndịagha nwụrụ na ọkwa ha

Isi ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa depụtara aha ndị agha ahụ e gburu

– Lt Col AH Ali, the Command Officer, 181 Amphibious Battalion, ndịagha Naịjiria

– Maj SD Shafa (N/13976)

– Maj DE Obi (N/14395)

– Capt U Zakari (N/16348)

– SSgt Yahaya Saidu (#3NA/36/2974)

– Cpl Yahaya Danbaba (1ONA/65/7274)

– Col Kabiru Bashir (11NA/66/9853)

– LCol Bulus Haruna (16NA/TS/5844)

– Lal Sole Opeyemi (17NA/760719)

– LCpl Bello Anas (17NA/76/290)

– LCpl Hamman Peter (NA/T82653)

– LCpl Ibrahim Abdullahi (18NA/77/1191)

– Pte Alhaji Isah (17NA/76/6079)

– Pte Clement Francis (19NA/78/0911)

– Pte Abubakar Ali (19NA/78/2162)

– Pte Ibrahim Adamu (19NA/78/6079)

– Pte Adamu Ibrahim (21NA/80/4795).

Ihe anyị ma gbasara nsogbu dị n'etiti ndịagha na ụmụafọ Delta

E gburu ndị agha mmadụ 16 na Delta Steeti
Nkọwa foto, E gburu ndị agha mmadụ 16 na Delta Steeti

Ọgbaaghara tiwapụrụ na Delta Steeti n’ụbọchị Tọzdee 14 Maachị 2024 n’oge ndị ojiegbe wakporo obodo Okuama ma site n’ụgbọmmiri kwasoo ha mgbọ.

Ya bụ ọnọdụ bụ nke a hụtara dịka a nọọrọ na-enwe ọgbaaghara n’etiti obodo Okuama dị n’okpuru ọchịchị Ughelli na Okoloba nke dị n’okpuru ọchịchị Bomadi na Delta Steeti.

Ọgbaaghara ahụ riri isi mmadụ atọ dịka ọtụtụ ndị ọzọ nwetara ihe mmerụ ahụ.

Ọ bụ n’ihi ọnọdụ ahụ mere gọọmenti Naịjirịa jiri zipụ ndịagha ịga mee udo n’etiti obodo Okuama na Okoloba n’ụbọchị Tọzde 14 Maachị 2024.

Dịka ndịagha nọ na-aga ozi e dunyere ha, ndị ntorobịa wakporo ha ma gbuo ndị agha mmadụ iri na isii nke gụnyere ndị isi anọ.

Ihe ụlọọrụ ndịagha kwuru banyere nke a

N’ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Ọchịagha Tukur Gusau wepụtara na Satọde, o kwuru na ụfọdụ ndị ntoroọbịa obodo wakporo ndịagha ngalaba 181 Amphibious Battalion n’oge ha gara ọrụ ime udo n’okpuru ọchịchị Bomadi nke Steeti Delta.

Gusau nọọrọ n’ụbọchị ahụ kwuo na ha emeela ka gọọmentị Delta Steeti maara maka nke a, tinyekwara na ha anwụchiela ụfọdụ ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’arụ ahụ.

O kwukwara na ndịagha agaghị ala azụ na mbọ ha na-agba iweta udo na nchekwa na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.

Lee ihe onyeisiala Tinubu kwuru banyere ọnọdụ a

Onyeisiala Bola Tinubu enyela ndị ọchịagha na ndị isi ụlọọrụ nchekwa ikike iweta ikpe ziri ezi nye ndị niile aka ha dị n'ogbugbu e gburu ndịagha Naịjirịa mmadị 16 na Delta Steeti.

N'akwụkwọ ozi onyeisiala Tinubu tinyere aka na ya, o kwuru na ndị mere ihe ahụ agaghị ala n'efu. Dịka o siri kwuo “a na m akasi ezinaụlọ ndịagha niile e gburu egbu obi tinyere ndị ogbo ha na ndị hụrụ ha n’anya.

“Ndị isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa na-elebara ọnọdụ ahụ anya ugbua. Ndị iberibe aka ha dị na nnukwu arụ ahụ aghaghị ịnata ntaramaahụhụ,” ya ka o kwuru.

Ihe Sịnetọ Ned kwuru maka ogbugbu e gburu ndịagha na Delta Steeti

Onye Sịnetọ na-anọchite anya mpaghara Delta North n’ụlọomeiwu sinet bụ Ned Nwoko ekwuola na a ga-achọpụtarịrị ndị aka ha dị n’ọnwụ ndịagha mmadụ 16 ma kpee ha ikpe.

N’ozi ọ wepụtara n’ọbaozi X, Ned Nwoko nyere mmadụ niile ndụmọdụ ka ha dere duu ma ghara ibu agha mmegwara n’ihi na nke ahụ ga-eme ka ya bụ ọnọdụ kawanye njọ.

Dịka o siri kwuo “gọọmenti etiti na nke Delta Steeti kwesịrị ihiwe otu panel nnyocha ngwangwa iji chọpụta ebe mmiri siri banye n’opi ụgbọghọrọ n’etiti obodo Okuama na Okoloba, nke mere ndịagha jiri zọpụ njem iweta udo ma zutezie ọnwụ ha.”

Gịnị ka Atiku Abubakar kwuru banyere nke a?

Onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar agbaala ndịagha ume ka ka ha saa anya ha mmiri ma gbasoo ezi akparamaagwa dịka ha na-azaso ọnọdụ dakwasara ha na Delta Steeti.

Ihe na-eme ugbua na Delta Delta Steeti

A mụnyela ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ n’obodo Okuama nke Delta Steeti dịka ndị ntorobịa gbuchara ndịagha mmadụ 16 n’ụbọchị Tọzde 14 Maachị 2024.