Etu ndị uweojii siri gbagbuo onye ọkaiwu gara ibugara ndị ntọrị ego ịgbapụta nwanne ya

Eli Ugwu

Ebe foto si, Elias Ugwu Facebook

Ndi uweojii na steeti Kogi ekwetala na ha gbagburu onye ọkaiwu aha ya bụ Elias Ugwu. A gbagburu nwoke ahụ ụbọchi Fraide abalị 7 Maachị 2024.

Elias bụ Iheakpụoka na Nsụka, Enugwu ma bụrụ onye ọkaiwu na-arụ ọrụ na Nsụka.

Nchọpụta gosiri na ọ bụ okwu amaghị onye ọ bụ nke Bekee kpọrọ "mistaken identity" mere mkpamkpa ahụ jiri kpaa dịka ndị uweojii siri kwuo.

Ndị uweojii kwuru na ọkaiwu Elias Ugwu siri Enugwu buru ego ebuagara ndị ntọrị na-ana maka nwanne ya a tọọrọ. Ka ha siri kwuo, o bunyere ndị ntọrị ego ahụ, ndị ntọrị akponyekwanụ Maazi Ugwu ndị ahụ ha ji ọ kpọrọ ha na-alọghachi Enugwu.

Mana oge o rutere n’ohia dị nso na Ayingba ka ndị uweojii malitere gbawa ụgbọala ya egbe, nke mere ọkaiwu nwụnyụọ anya pịị.

Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na Kogi bụ SP Williams Anya kwuru; “ọ bụ ndị obodo gwara ndị uweojii na ha hụrụ ndị ji ụgbọala agagharị n'ọhia okpuruọchịchị Dekina dị na Ayamgba, Kogi steeti”

Maapụ Enugwu Steeti

Ebe foto si, Enugwu

Dịka o siri kọwaa; “ ndị ohi ka kpachara ike na gburugburu Ayingba, zuo ohi n'ụlọakụ nakwa ụlọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala.

Mana ngwa ngwa ozi batara na o nwere ndị na-agagharị, ndị a kpọrọ “tactical team” bara n’ime ohia ahụ gbawa egbe n’ụgbọala ahụ n’ihi na ha chere na ọ bụ ndị ohi.”

O kwuru na owuteziri ha oge ha chọpụtara na ọ bụghị ndị ohi ka ha gbara ọtụtụ egbe. Ha mere ngwangwa buru ozu Elias Ugwu gawa n'ụlọọgwụ Maria Goretti Ayingba ebe ọ nọrọ nwụọ.

Kọmishọna ndị uweojii na Kogi steeti akasiela ezinaụlọ Elias Ugwu obi were kwuo na ọ bụ nghọtahie mere ihe ahụ jiri mee.

Eli Ugwu

Ebe foto si, Eli Ugwu Facebook

Mana ndi otu ọkaiwu Nigerian Bar Association ngalaba dị na Nsụka kwuru na ọ bụ okpotokpo asị ka ndị uweojii Kogi na-atụ.

Onye isi NBA na Nsụka bụ Sunny Okoro, wepụtara ozi ebe o boro ndị uweojii ebubo na ha kpachara anya laa nwoke ahụ n’iyi.

Okoro kwuru na onye ahụ a tọọrọ bụ nwanne Elias Ugwu aha ya bu Alexander Ugwu, onye a tọọrọ ya na mmadụ ise ndị ọzọ na Ijih, Kogi steeti.

Ọ gara n’ihu kọwaa na o nyere ndị ntọrị ego ahụ n'abalị 9 Maachị were na-alaghachi Enugwu, mana ọ maghị na ndị uweojii chebiri ha na Ojigbala-Egume ebe ha nọrọ gbagbuo ya na-ajụghị ese ọbụla.

O kọwara na ọ bụghị n’ime ọhịa ka e gburu ya kama na ọ bụ n’ụzọ awara awara Ayingba ebe ya na ndị ọ zọpụtara n’aka ndị ntọrị na-alaghachi Enugwu.

Ndị NBA ahụ gwara ndị Uweojii Kogi ka ọ gwa ha ihe gburu onye otu ha makana ọnwụ Elias Ugwu ahụ abụghị mberede.