Bosun Tijani: Gọọmentị Naịjirịa anaghị amachi Kripto - Mịnịsta mgbasaozi na akụnauba dijitaal

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha anaghị akwado ịmachi ego dijitaalụ a na-akpọ 'Cryptocurrency' na Bekee, mkpọbiri ya bụ kripto na Naịjirịa.
Mịnịsịta mgbasaozi, teknụzụ na akaụnụba dijitaal bụ Bosun Tijani kwuru nke a na mkparịtụka ya na BBC Igbo mere n'Abuja.
Ọ kọwara ọnọdụ gọọmentị Naịjirịa gbasara azụmaahịa kripto na Naịjirịa ma kwuo na mkpebi gọọmentị maka kripto abụghị maka iji gbochie azụmahịa kripto kama ọ bụ itinye ụfọdụ njikwa nke ga-egbochi itinye ego ụmụ Naịjirịa n'aka ndị mba ọzọ.
Nke a na-abịa ka gọọmentị Naịjirịa machiri ụlọọrụ kachasị e ji eme azụmahịa kripto na mbaụwa Binance n'ọnwa Maachi.
N'okwu gbasara mgbali ọnụahịa nri na agụụ na-akpagbu ndị Naịjirịa ugbua, Tijani kwuru na ọ bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ mana gọọmentị na-eme ike ya iji belata etu o si emetụta ndị Naijiria.
Ọ rịọrọ ka obi sie ndị Naịjirịa ike n'ọchịchị Tinubu maka na o nwere ọdịmma ndị mmadụ n'obi; o kwuru na goomenti ewepụtala atụmatụ ole ma ole iji gosi nke a.
Ọ dụrụ ndị mmadụ ọdụ ka ha jụọ mịnịstrị niile na-ahụ maka atatu a ka o si aga, ma dọnyere gọọmentị ukwu iji hụ na e mejupụtara atụmatụ ndị a



