Ahụhụ Naịjirịa na-ata ugbua sitere n'iwu ọjọọ ndị e mere n'oge gara aga - Benjamin Kalu
Osote onyeisi ụlọomeiwu nta na Naịjirịa bụ Benjamin Kalu akọwaala ihe mere ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa jiri dị njọ ugbua ma sị na ọ ga-ebi n'oge na-adịghị anya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na ahụhụ ndị Naịjirịa na-ata ugbua bụ ahụhụ sitere n'iwu ọjọọ nke akụnaụba gọọmentị ndị gara aga hiwere.
O kwuru na nke a ga-ebi n'oge na-adịghị anya maka na ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu emeela iwu ga-agbanwe ọnọdụ a nke gụnyere iwepu ego enyemaka mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'fuel subsidy'.
Ọ rịọrọ ụmụafọ Naịjirịa ka ha nweere gọọmentị na-achị ugbua ndidi na "ofe dị ọkụ ga-ajụ oyi" n'oge na-adịghị anya.

Kalu gara n'ihu kwuo na o nweghi onye obi ga-adị mma ma ego ha na-apụ afọ n'ala dịka naịra si apụ ugbua ma a tụnyere ya dọla nakwa ego ndị ọzọ.
O kwuru na ọ bụ ya mere ndị ụlọomeiwu jiri kpọkuo onyeisi ụlọakụ etiti bụ Central Bank ka ọ bịa kọwaa ihe ọ ga-eme nakwa atụmatụ o nwere iji kwalite naịra.
"Ọ bụrụ na anyị gee ntị n'atụmatụ ọ ga-ewete, hụụ na ọ dịghị mma, anyị ga-ajụ ya maka anyị nwekwara ndị ọkachamara n'etiti anyị."
Kalu kwuru na ọ bụghị eziokwu na ha bụ mmọnwụ a na-akwa aka n'ịkwado ihe Onyeisiala mere dịka ọtụtụ ndị mmadụ si ebo ha ebubo.
"O nweghi mgbe ndị omeiwu na ụlọọrụ Onyeisiala ga-alụ ọlụ dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya, ọchịchị onye kwuo uche bụ maka mkparịtaụka, ọ bụghi iti ọkpọ."
Kirie ihe o kwuru n'uju;



