Climate Change: Ihe i kwesịrị ịma maka oke okpomoọkụ a dị ugbua - NiMet
- Onye dere ya, Michael Ilediagu na Okechukwu Omeire
- Ndị mere akụkọ a, Journalist and Video Journalist
Onye ma ihe ekwe na-akụ gbasara mgbanwe ihu eluigwe si n'ụlọọrụ na-ahụ maka ihu eluigwe na Naịjirịa bụ 'Nigerian Meteorological Agency' (NiMet) akọwaala ihe na-ebute oke okpomoọkụ dị ugbua na Naịjirịa.
Osote onyeisi NiMet bụ Oluchukwu Anokwu kwuru na ndị mmadụ soro kpalie okpomoọkụ dị ugbua site n'ihe dị icheiche ha na-eme.
O kwuru na iji nkụ na-esi ihe so ebute ihe mere okpomoọkụ jiri dị ma kọwaa na nke ka nke bụ ndị na-amị mmanụ agbịdị.
N'okwu ya, "ụfọdụ na-asị na ọ bụ ndị na-arụ okporoụzọ gara jichie mmiri ozuzo, okpomoọkụ a na-achọ ikpogbu ndị mmadu, mụ a na-achị ha ọchị; ọ bụ ndị na-arụ okporoụzọ jichiri mmiri na Legọs nakwa ebe niile?
"Asịrị m ha na ọ bụghị ndị na-arụ okporoụzọ jichiri mmiri, kama ọ bụ mgbawe ihu eluigwe butere okpomoọkụ a."

"I lee anya n’ụwa gburugburu e nwere mkpụrụedemede gosiri na ihe gbanwere. A bịala nwee mgbakwunye n'etu o si adịbu.
" Anyị nyochara ya wee hụ na ọ bụ ihe ahụ a na-ekwu na-emetụta ebe a. Okpomoọkụ dị ebe niile."
"Okpomoọkụ ahụ bụ ihe na-ebute mmiri ozuzo. Okpomoọkụ ahụ dịrị, ọ na-eme ka mmiri zoo n'ike, nke na-ebute mbuze."
"Ọ bụrụ na ị kọnye ihe n’ubi ma mmiri ezoghị mgbe o kwesịrị izo, ọ na-emetuta ya." "Mgbe ụfọdụ mmiri na-amalite izo ma gbabie n’ike. E nwere ike mmadụ kọchaa ịhe n'ubi, anwụ akpọnwụọ ya".
"N'afọ gara aga, ị ga-ahụ na oke mmiri ozuzo buuru ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka na-agụ akwụkwọ ọkachasị ndị bi n’ikpere mmiri."
"Ndị ọkachamara Sayensi chọpụtara na ọ na-emetụta ahụike. Ọrịa dị icheiche na-eso mgbanwe ihu eluigwe."
"E kwesịrị ị na-akwado ndị mmadụ ka ha na-eji gaasị esi nri maka na isi ihe na nkụ so eme ka mgbanwe ihu eluigwe kawanye njọ."
"Anwụrụ ọkụ ndị na-esi n'ịmị mmanụ 'crude' karịrị nke ndị mmadụ na-esi nri na nkụ na-ewepụta.
"Ndị na-achị anyị ga-agba mbọ chọwa ụzọ ọzọ ala anyị ga na-esi akpata ego nakwa ụzọ ọzọ a ga-esi mee ka mmanụ ahụ ghara ị dị na-ebunye anwụrụ ọkụ n’ikuku maka na ọ ga-ebute nsogbu n'ọdịnịihu."






