Mba Australia na New Zealand anabatala afọ 2025

Ebe foto si, Getty Images
Ka afọ 2024 na-agwụ taa, ọtụtụ mmadụ na-enwe anụrị na mpaghara dị iche iche na mbaụwa gbaa gburugburu.
Ka ọ dị ugbua, mba New Zealand abaala afọ 2025. Ha ji ọkụ e ji-achụ afọ nabata ya taa.

N'aka nke ọzọ, ọtụtụ mmadụ gosịpụtara obi aṅụrị na Sydney dị na mba Austrilia dịka ha nabatara afọ 2025.
Na mba Spen, ndị mmadụ na-enwe aṅụrị ma na-eme emume omenaala e jiri mara ha dịka ha na-eche afọ 2025.

Ebe foto si, Getty Images
Emume ọmenaala ahụ gunyere ịgụ mkpụrụ osisi grepụ ọnụ ma na-eri ya n'abalị tupu ha abanye afọ ọhụrụ.
Emume a bụ nke a malitere ime na mba Spen kemgbe afọ 1909 oge ndị ọrụugbo na-akọpụta mkpụrụosisi grepụ chọrọ ime ka ndị mmadụ mara ha ma malite ịzụ ha ahịa.

























