Etu m si eji uli arụpụta akwa iji chekwaa omenala Igbo - Ifebuche Madu

Aha onyonyo, Etu m si eji uli arụpụta akwa iji chekwaa omenala Igbo - Ifebuche Madu
Etu m si eji uli arụpụta akwa iji chekwaa omenala Igbo - Ifebuche Madu
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Nwaada Igbo nwere ụlọọrụ na-emepụta akwa bụ Ifebuche Madu akọwaala etu ịhụnanya o nwere n'omenala Igbo siri kpalie ya iji uli arụpụta akwa abada.

Ifebuche Madu, onye hiwere ụlọọrụ Afrikstabel kpughere nke a oge ya na BBC nwere mkparịtaụka pụrụiche n'ụlọọrụ ya.

O kwuru na ya bụ onye ịchọ mma na-amasị kemgbe ọ bụ nwata, nke mere o ji malite iji uli emepụta akwa iji chekwaa omenala Igbo maka ọgbọ nke ugbua nakwa ọgbọ ndị ga-abịa n'ọdịnihu.

"Abịara m chọpụta na uli bụ omenala e mere n'oge gara aga, mana a na-ete ya n'ahụ nakwa n'ahụ aja, ọ bụghị ihe e ji eme akwa na mgbe ochie".

"Mana achọrọ m ime ka ọgbọ dị ugbua na ndị nke ga-abịa n'ọdịnihu mata ihe bụ uli," ka Afrikstabel gwara anyị.

Ifebuche Madu gụrụ ihe ọmụmụ Fine Arts na mahadum ma lekwasị anya n'ihe gbasara imepụta akwa.

O kwuru na ụlọọrụ Afrikstabel na ndị ahịa nọ na mgbago ugwu Naịjirịa na-arụkọ ọrụ, tinyekwara ụmụnwaanyị Akwaete, dịka ha nwere ndị na-azụ ha ahịa na mba ofesi gụnyere Amerịka, UK, Chaịna na mba ndị ọzọ.

Nwaada Ifebuche Madu kpọgharịrị anyị n'ụlọọrụ Afrikstabel ma gosi anyị usoro dị iche iche ha si eji uli emepụta abada.

Ụlọọrụ Afrikstabel nwekwara igwe na-azachasị mmiri uli e ji mepụta akwa iji hụ na o buteghị nsogbu ọbụla nye gburugburu obibi nakwa ihu igwe.

Etu m si eji uli arụpụta akwa iji chekwaa omenala Igbo - Ifebuche Madu

"Ihe a bu igwe anyị ji na-eme ka mmiri anyị dị ọcha. E wepụta mmiri n'ebe anyị na-arụ ọrụ, mmiri ya na-abanye n'ime taankị dị n'ala ebe a. Ọ bụ ebe ahụ ka anyị na-azacha mmiri ya ka ọ dị ọcha".

"Mmiri ahụ na-esite na taankị nọ n'ime ala banyezie n'ime ihe ndị a nọ ebe a, iji wezuga ureghure na ihe ọjọọ niile dị n'ime ya. O wepụchaa ya, anyị akpọghezie ya ka mmiri ndị ahụ banye n'ọwammiri".

"Oge ahụ mmiri ya adịla ọcha, nke bụ na ọ banye n'ala, ọ gaghị emebi ihe ndị anyị kọrọ n'ubi maọbụ gbuo azụ ndị nọ na mmiri. Ọ gaghị emebikwa gburugburu anyị, kama ọ ga-adịzi ọcha dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri zoro ezo," ka Ifebuche Madu kwuru.