Brighton Vs Man United: Penariti azọọla Man United ọzọ dịka oshimiri Brighton chọrọ iri ha

Ebe foto si, Getty Images
Otu bọọlụ Manchester United na Brightom zutere onwe ha taa na asọmpị Premier League.
Mgbe ya bụ asompi na-ebido ka ndị otu Brighton gosiri na ha abịaghị igwu egwu dịka shọtụ Leandro Trossard kụrụ n'ọsịsị post were pụo.
N'ime nkeji iri na asatọ ka ndị Brighton gbara mbọ ịnye goolu mana chi na-enye onyinyi goolu eleghị ha anya.
Na nkeji iri abụọ na abụọ ka Bruno Fernandes ritere yelo kadị maka etu o siri gbaso Neal Maupay bọolụ.
N'ime nkeji iri na atọ, mbọ niile ndị Brightom gbara ịnye goolu kụrụ na baa postu ndị Man Utd.
Ndị ManUtd nyere goolu na nkeji iri atọ na atọ ma Marcus Rashfords nọ offside nke mere ka akagbuo goolu ahụ.
Na nkeji iri atọ na asatọ ka ndị Brighton nwetara Penariti nke Neal Maupay ji nye goolu.
Nemanja nke Man Utd reitkwara yello kadị na nkeji iri anọ na otu dịka ọ tinyere Aaron Connoly n'anya.
Ndị otu ManUtd nwetara goolu iti aka n'obi mgbe Harry Maguire nyere goolu na nkeji iri anọ na anọ.
Na nkeji iri ise na otu ka ndị ManUtd nyere goolu mana VAR gụpụrụ ya.
Ọ dịka ọ kpalịrị iwe Rashford nke mere ka ọ kpakasịa ndị otu Brighton were gbakaa netị ha na nkeji iri ise na otu.
Ndị Brighton zọpụtara onwe na nkeji iri itolu na ise mgbe Solly March nyere goolu nke abụo.
Kama chị penariti zọrọ ndị ManUtd ọzọ dịka ha nwetara penariti










