Ọ bụghị eziokwu na ụmụnwaanyị na-etinye m na mkpaabụ ha - Tony Umez

Aha onyonyo, Ama m na Peter Obi abụghị onye amansị mana ọ ama m na ọ ga-edozi Naịjirịa – Tony Umez

Onye aka ochie n’ọrụ ime ejije Nollywood bụ Tony Umez akọwarala BBC Igbo ebe o zoro onwe ya kemgbe dịka ọtụtụ na-ajụ maka ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso a, ọ kọwara na enweghị ebe o zoro onwe ya maka na oge na-eruru onye ọbụla mgbe ha na-eji nọpụ iche ma zuo ike nwa mgbe nta.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ meela ọtụtụ ihe ejije ọhụrụ nke gbarala n’ọha ebe ndị ọzọ ga-apụta n’oge na-adịghị anya.

Tony Umez

Umez onye ọtụtụ ji ama njakịrị maka etu ụmụnwaanyị na-esi akpanye ya n’abụ n’ihe ejije ndị ọ na-eme kọwara na ọ bụghịkwa etu ahụ ka ọ dị maka na ihe ndị ahụ bụ agwa ọ na-akpa naanị n’ejije.

O kwuru na nne ya zụrụ ya ka ọ na-akwanyere ụmụnwaanyị ezi ugwu nke mere ya na nwunye ya nakwa ụmụ ya nwaanyị anọ ji ebi n'udo.

Umez gara n’ihu kọwaa etu o siri banye n'ọrụ ime ejije, ihe ndị ọ mụtarala n’ọrụ ahụ nakwa ihe ndị cheere ya na ndị ogbo ya aka mgba.

Tony Umez na nwunye ya mgbe ha mere afọ 23 ha mere alụmdịnanwunye

Ebe foto si, Tony Umez/Instagram

Nkọwa foto, Tony Umez na nwunye ya mgbe ha mere afọ 23 ha mere alụmdịnanwunye

Otu n’ime ihe o kwupụtara bụ ọgbatauhie n’ọrụ ha bụ ọchịchị Naịjirịa dịka ọ kwuru na ọchịchị Naịjirịa nọ n’ọnọdụ ọjọọ ugbua.

Ọ gara n’ihu rịọ ọha ka ha pụta tụọ vootu na ntuliaka na-abịa abịa dịka o kwupụtara nkwado ya nye Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’aha Labour Pati.

O kwuru "Peter Obi abụghị onye amansị mana amaara m na ọ ga-edozi Naịjirịa"

Umez kwukwara na otu n’ime ihe ndị na-atụ ya n’anya bụ etu ndị mmadụ si ekesa akụkọ ụgha banyere ndị a ma ama nke gụnyere onwe ya nke ụfọdụ kwuru na ọ nwụrụ na nso nso a.

Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe ndị o kwuru n’uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor, Chioma Nkemdilim na Vining Ogu.