Ọ bụghị eziokwu na ụmụnwaanyị na-etinye m na mkpaabụ ha - Tony Umez
Onye aka ochie n’ọrụ ime ejije Nollywood bụ Tony Umez akọwarala BBC Igbo ebe o zoro onwe ya kemgbe dịka ọtụtụ na-ajụ maka ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso a, ọ kọwara na enweghị ebe o zoro onwe ya maka na oge na-eruru onye ọbụla mgbe ha na-eji nọpụ iche ma zuo ike nwa mgbe nta.
Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ meela ọtụtụ ihe ejije ọhụrụ nke gbarala n’ọha ebe ndị ọzọ ga-apụta n’oge na-adịghị anya.

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Umez onye ọtụtụ ji ama njakịrị maka etu ụmụnwaanyị na-esi akpanye ya n’abụ n’ihe ejije ndị ọ na-eme kọwara na ọ bụghịkwa etu ahụ ka ọ dị maka na ihe ndị ahụ bụ agwa ọ na-akpa naanị n’ejije.
O kwuru na nne ya zụrụ ya ka ọ na-akwanyere ụmụnwaanyị ezi ugwu nke mere ya na nwunye ya nakwa ụmụ ya nwaanyị anọ ji ebi n'udo.
Umez gara n’ihu kọwaa etu o siri banye n'ọrụ ime ejije, ihe ndị ọ mụtarala n’ọrụ ahụ nakwa ihe ndị cheere ya na ndị ogbo ya aka mgba.

Ebe foto si, Tony Umez/Instagram
Otu n’ime ihe o kwupụtara bụ ọgbatauhie n’ọrụ ha bụ ọchịchị Naịjirịa dịka ọ kwuru na ọchịchị Naịjirịa nọ n’ọnọdụ ọjọọ ugbua.
Ọ gara n’ihu rịọ ọha ka ha pụta tụọ vootu na ntuliaka na-abịa abịa dịka o kwupụtara nkwado ya nye Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’aha Labour Pati.
O kwuru "Peter Obi abụghị onye amansị mana amaara m na ọ ga-edozi Naịjirịa"
Umez kwukwara na otu n’ime ihe ndị na-atụ ya n’anya bụ etu ndị mmadụ si ekesa akụkọ ụgha banyere ndị a ma ama nke gụnyere onwe ya nke ụfọdụ kwuru na ọ nwụrụ na nso nso a.
Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị nụrụ ihe ndị o kwuru n’uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Makuochi Okafor, Chioma Nkemdilim na Vining Ogu.














