Uwe nne m ka m ji malite ọrụ ịkpa ọchị - RealSophy
Na mkparịtaụka BBC Igbo na nwaada Sophia Chisom e ji 'Realsophy' mara na soshal midia nwere na nso nso a, ọ kọwara etu o siri malite ọrụ ịkpa ọchị bụ ihe na-enyezị ezigbo ego nakwa uru ndị ọzọ.
Nwaada Chisom duru ndị ntorobịa ndụmọdụ ka ha were ihe ndị nọ ha nso malite ọrụ ọma ọbụla ha zubere dịka o ji onwe ya maa atụ ma kọwa "Uwe nne m ka ma ji malite ọrụ ịkpa oche"
"Anọghị m na-eche ka m nwetacha ego tupu m amalite atụmatụ ịkpa ọchị a"
Chisom kwuru na ọ chọghị ka ogogo ya kwụsị n'ọrụ ịkpa ọchị na soshal midia dịka o jirila ohere ọrụ ahụ nyere ya malite ọrụ ime ejije na Nollywood n'uju.

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ọ kọwara etu o si echepụta echiche ihe ndị onyonyo ọ na-eme nke otu n'ime ha bụ ihe ndị na-eme na ndụ ya maọbụ ndụ ndị nọ ya nso.
Nke a mere o ji na-adusi ndị ntorobịa ọdụ ka ha sapee anya ma hụ ihe ọma ndị nọ ha n'akụkụ ma nwere ya mịpụta mkpụrụ ga-abara ọha uru.
O gara n'ihu jiri ohere mkparịtaụka a kọwa mkpa ọ dị na ndị mmadụ pụtara tụọ vootu na ntuliaka 2023 dịka o kwuru na ịme nke a ga-emepere Naịjirịa ọzọ inweta ezi ọchịchị nke nwerewike ịgbanwe ọdịnaihu mba a.
Chisom tinyekwara ọnụ n'okwu ihe ndị nwereike ichere ndị ọbụla chọrọ ibanyere ọrụ ịkpa ọchị aka mgba (ọkachasị ụmụnwaanyị), ọ dụrụ ọdụ etu ndị mmadụ nwereike isi wụfee ihe ndị ahụ.
O kwukwara etu nna ya siri jụ ya ịbanye ọrụ na mbido mana ọ gbasiri mbọ ike n'ọrụ nke mere nne na nna ya jiri malite ikwadosi ya ike n'ọrụ ahụ.
Kirie ihe onyonyo a ka ị nụrụ ihe ndị o kwuru n'uju.
Ndị mere akụkọ bụ Makuochi Okafor na Ifeanyi Alapo.







