Nnamdi Kanu ọ ga-esi mkpọrọ DSS lawa taa?

Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu n'afọ 2021 maka ebubo ruru 15 nke gụnyere iyi ndụ egwu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu n'afọ 2021 maka ebubo ruru 15 nke gụnyere iyi ndụ egwu

Dịka ụlọikpe mkpegharị nọ n’Abuja mere mkpebi banyere Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indiegnous people of Biafra (Ipob) nke nyere iwu ka a tọhapụ ya, ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ Nnamdi Kanu ọ ga-esi mkpọrọ DSS lawa taa? Kedụ mpụtara mkpebie ahụ nke Ụlọikpe Mkpegharị nọ n'Abuja nke kagbuo ebubo 15 gọọmentị Naịjirịa nwere n’isi ya dịka o si metụta mkpụlata a si Kenya kpụlata ya?

Otu onye ọkaiwu na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nye ndị mmadụ bụ Samuel Ihensekhien gwara BBC na mgbe esoghi ezi usoro mee ihe na ọ na-eme ka atụmatụ ebu n’obi mee ya bụ ihe ghara ịchịta aja.

Cheta na ụbọchị Tọzde(13/10/22) ụlọikpe sịị Kanu lawa, na ikpe amaghị ya n'akwụkwọ nke Gọọmentị Etiti gbara ya n'ebubo metụtara iyi ndụ egwu.

Ụlọikpe kwuru na ụzọ Gọọmentị Naijiria sirị si Kenya kpọlata Kanu megidere iwu Naijiria na nke mba ụwa.

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na-enwe aṅụrị maka mpụtara ikpe ya n'ụlọikpe mkpegharị
Nkọwa foto, Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu na-enwe aṅụrị maka mpụtara ikpe ya n'ụlọikpe mkpegharị

Lee ihe ndị ọnụ na-eru n’okwu na-akọwa

Otu onye ọkaiwu na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nye ndị mmadụ bụ Samuel Ihensekhien gwara BBC na ọ na-eto ụlọikpe mkpegharị etu ha siri kpebi ikpe na-enweghị egwu ọbụla maọbụ na-eleghị anya n’ihu onye ọbụla.

Ihensekhien kwuru na mgbe esoghi ezi usoro mee ihe na ọ na-eme ka atụmatụ ebu n’obi mee ya bụ ihe ghara ịchịta aja.

N’okwu ya, “Etu e si nwụchịe ma kpọghachite Nnamdi Kanu ezighi ezi, o dara iwu Naịjriịa na nke ụwa ma megidekwa ikike dịịrị ya.”

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Gọọmentị Naịjriịa

Nkọwa foto, Mgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ma kpọghachite Nnamdi Kanu Naịjirịa n'afọ 2021.

Ọ gara n’ihu kwuo “Tupu ị nwụchie ma kpọghachite mmadụ site na mba Afrịka ọzọ bịa nke gị ị kwesịrị iso usoro iwu mba ahụ, nke mba ụwa nakwa usoro ntuziaka ụlọikpe nke bụ na tupu ị mee nwụchi na mkpọghachite e kwesịrị inye gị ikike ime nke a.”

“Mana n’okwu etu Kanu siri lọghachite Naịjirịa, anyị nụrụ ya dịka onwe mmụọ ozii si n’ikuku wụbata enweghị onye kwuru okwu usoro mkpọghachite ya, enweghị ihe gosiri akwụkwọ mkpebi mba ahụ mere”

Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọikpe malitere ikpe ikpe Kanu gosiri nkwado ‘ntọrọ’ ya na mba ọzọ bịa Naịjirịa.

 Ihensekhien gara n’ihu kwuo na n’ihi mmehie gọọmentị Naịjịrịa mere na ha enweghị ihe ọzọ ha ga-eme na-abụghị ịtọhapụ Kanu dịka ụlọikpe mkpegharị si kwuo.

“Ka ọ dị ugbua, Nnamdi Kanu a bụrụla onye nweere onwe ya, ụlọikpe ekwuola ka a tọhapụ ya, Gọọmentị Etiti enweghị ihe ọzo ha ga-eme na-abụghị irubere mkpebi a isi”

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na gọọmentị Naịjirịa kwesịrị ịbu ụzọ tọhapụ Kanu tupu ekwuwe ihe ọzọ.

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook

Nkọwa foto, Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na gọọmentị Naịjirịa kwesịrị ịbu ụzọ tọhapụ Kanu tupu ekwuwe ihe ọzọ.

N'otu aka ahụ, otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor zịpụtara ozi iji saa okwu ọkaiwu ukwuu gọọmentị etiti ma na-akọwa na mmehie gọọmentị etiti mere na 'ntọrọ' Kanu nakwa mkpọghachite ya ezịghị ezi ma bụrụzị ọgbaughie nye atụmatụ ha ebo ya ebubo ọbụla maọbụ ikpe ya ikpe gbasarea ebubo ndị ahụ. N'ozi ya, ọ sị "Mkpebi ụlọịkpe mkpegharị erigorola n'elu atụmatụ ikpe a nke a na-eche n'usoro ya ezighi ezi ma ghara ịchatazị aja" Ọ gara n'ihu dee "Agaghị enweike boo ya ebubo ọhụrụ ọzọ, a ga ebugodị ụzọ tọhapụ ya tupu e kwuwe ihe ọzọ n'okwu ya."