AMVCA: Ihe ị kwesịrị ima maka Investor Sabinus (Mr Funny) na Stan Nze na-ewu ewu ugbua.

I nwete mmeri n'asọmpị ejije Nollywood nke AMVCA a bụrụ ihe ọṅụ nye ọtụtụ dịka ha ji ya egosi na ha bụ ọkaibe n'ọrụ ejije, Sabinus na Stan Nze gbara ama nke a

Ebe foto si, Mr Funny/Stan Nze/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Aha Mr Funny a na-akpọkwa Investor Sabinus gbara afọ 27 so n'aha ndị mmadụ kpụ n'ọnụ kemgbe abalị Satọdee.

Nwaamadị a bụ onye ọkpa ọchị bụrụkwa onye na-eme ihe onyonyo ritere ihe nrite n'emume asọmpị ejije ndị Nollywood bụ AMVCA nke ugboro asatọ n'akaala nrite nke ndị na-emepụta ihe onyoyo n'ịntanetị.

Mgbe ọ pụtara zipụta ozi nnabata ihe nrite a n'emume ahụ, Sabinus ji ọṅụ pụta n'ihu ọha dịka ọ gosiri ọha na ọ tụghị anya ị nweta mmerị a.

O kwuru "Ekele m ndị niile na-akwado n'ọrụ a, obi dị m mma nke ukwuu"

"Ihe a bụ ihe nrite nke mbụ m na-erịta na Legọs steeti"

Na mkparịtaụka 'Rubbing Minds' ya na onye ntaakụkọ Ebuka Obi-Uchendu nwere n'ọnwa Jenụwarị 2022, o kwuru na o si Pọta Kọtụ wụbata Legọs steeti maka atụmatụ ịgba mbọ n'ọrụ ikpa ọchị kemgbe 2019 agbanyeghị na o bidoro ya kpọm kwem na 2015.

N'emume AMVCA 2022, ndị nhazị emume a tinyere akụkụ nturuugo ọhụrụ maka ndị na-eme obere ejije na soshal midia nke ha kpọrọ "best online social content creator'" na Bekee na mbụ ya.

Ndị so zọsaa Sabinus akụkụ ihe nrite a gụnyere ndị ọkpa ọchị a ma ama dịka Mr Macaroni, Tee Kuro, Bukunmi Adega Ilori, Taoma na ndị ọzọ.

Aha Sabinus na-ewu dịka ndị zọsara ya ihe nrite a bụkwa ndị na-emepụta ihe onyonyo aghara aghara ma bụrụ ihe nrite tara akpụ maka ndị ọkaibe so zọọ ya.

Sabinus so na ndị ọtụtụ hụrụ n'anya nke ukwuu dịka ọha kpụụ aha ya n'ọnụ, eto ya na mmeri ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mr Funny nke a na-akpọ Sabinus malitere ọrụ ịkpa ọchị n'ụlọ akwụkwọ mahadum ọ gara n'oge gara kemgbe 2015

Ebe foto si, Mr Funny/Instagram

Onye bụ Investor Sabinus?

  • Emmanuel Chukwuemeka Ejekwu nke ọtụtụ ma dịka Sabinus (Mr Funny) si Rịvas steeti, a mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Jenụwarị, 1995.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum nke Pọta kọtụ ebe ọ natara ọzụzụ n'asụsụ na mgbasa ozi.
  • Na mkparịtaụka ya na Ebuka Obi-Uchendu nwere n'ọnwa Jenụwarị 2022, ọ kọwara na nna ya akwadobughị atụmatụ iya ime ihe ọchị dịka ọ chọburu ka ọ nata ọzụzụ dịka onye ọkaiwu.
  • Sabinus kọwara na nna ya mechara nabata ya bụ atụmatụ mgbe ọ hụrụ na ihe nrite si na ya abịara ya.

Agbanyeghị na ọtụtụ ndị ọzọ ritere mmerị n'akụkọ asọmpị dị ịcheịche aha Sabinus nakwa aha Stan Nze so na ndị kacha ewu. Kemgbe abalị Satọde, aha Stan Nze na-akpọtụ n'igwe okwu Twitter na akara okwu soshal midia ndị ọzọ n'ihi mmeri o nwetara na nturugo AMVCA e mere n'abalị unyahụ na Legọs.

Stan Nze

Ebe foto si, Stan Nze/Instagram

AMVCA nke mkpọrụ n'isi ya bụ "Africa Magic Viewers' Choice Awards" bụ nturuugo nke ụlọọrụ ihe onyonyo MultiChoice na-ahazi kwa afọ maka ịkwanyere ndị mere ihe kwụpụtara na ihe onyonyo TV nakwa ejije ugwu.

N'emume ahụ nke ndị ejije na ndị na-arụ ọrụ ime ọha obi ụtọ bịara n'ikem n'ikem, Stan Eze ritere nturugo nwoke ihe ejije bụ ọkaibe (Best Actor in a drama) maka agwa ya dịka 'Ahanna' n'ejije 'Rattlesnake' nke abụọ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-eto ya dịka ha kwuru na o metara agwa ya nke ọma n''Rattlesnake'.

Mana ọ bụghị na o ritere ya bụ nzere bụ ihe e ji kpụrụ ya n'ọnụ kama ọ bụ etu o siri mee.

Stan Nze

Ebe foto si, Stan Nze

Nwa amadị ahụ bụ onye e jizi 'Ahanna' were mara gara ṅụrịarara ogbo ya bụ Osas Ighodaro bụ onye ritere nzere(nwaanyị ihe ejije ya kachasị mma(Best Actress in Drama) maka agwa "Amara" na Rattlesnake , na-alọghachi, aha ya daa ka ụda egbe mkpọnala dịka a kpọpụtara ya ka ọ bịa nara nturuugbo nke ya.

Ejije 'Rattlesnake' nke Ramsey Noah haziri kporo nturuugo ekpo na mmemme ahụ dịka ejije ahụ ritere nturuugo nwoke ihe ejije kachasị mma ( Stan Nze), nwaanyị ihe ejije ya kachasị mma(Osas Ịghodaro) na onye nhazi kachasị mma(Ramsey Noah).

Funke Akindele ritere nzere maka agwa ya 'ejije "Omo Ghetto".

Ihe ejije ritere ọkaibe n' ihe ejije nile pụtara n'afọ 2021 bụ 'Amina nke Okey Ogunjiofor nwe; Samuel Perry bụ onye ọkpaọchị e ji "Broda Shaggi" mara ritere nzere maka agwa ya na 'Dwindle" .

Onye bụdị Stan Nze?

Stan Nze

Ebe foto si, Stan Nze/Instagram

Aha ya bụ Stanley Ebuka Nzediegwu mana a ma ya dịka Stan Nze, onye na-eme ihe ejije Nollywood.

Nze onye gbara afọ 33 toro na Legos n'etiti ụmụnne anọ bụ ndị ọ tọchara.

Nna ya na-azụ ahịa, ebe nne ya bụ onye na-akwa akwa.

Stan gara akwụkwọ na mahadum 'Nnamdi Azikiwe University', Ọka dị n'Anambra steeti ebe ọ gụrụ "Compụter Science".

Ejije bupụtara Stan Nze, mee ka a nụwa aha ya ebe nile bụ 'Tinsel' bụ ebe ọ zara Ọhakanu.

Nwa amadi ahụ nke lụrụ nwa n'afọ 2021 wuru ewu maka ya dịka ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ya n'ọnụ maka ịlụ Jessica Obasi bụ onye ji afọ 10 were tọọ ya.

Etu ndị a ma ama si chawapụ na mmemme AMVCA

Maria Chike Benjamin
Nkọwa foto, Maria Chike Benjamin

Emume nturugo a kpọrọ AMVCA kpọtụrụ akpọtụ dịka ọtutụ ndị a ma ama n'ime obi ụtọ gosiri onwe ha na 'Red Carpet' na mmemme e mere n'abalị Mee 14, afọ 2022 na Legọs.

Ndị na-eme ejije, ndị na-akpa ọchị, ndị so zọ ọkwa Big Brother nakwa ndị otiegwu so na ndị kwadoro pụta taa.

Igbo na-ekwu okwu sị "unu amara ka m si kwado" ma lezie foto ndị dị n'okpuru ka ịhụ etu ndị ude ha na-ede ebe niile si kwado taa.

Kate Henshaw
Nkọwa foto, Kate Henshaw

Ọtụtụ n'ime ha yi uwe 'olu gbajie boys'

Juliet Ibrahim
Nkọwa foto, Juliet Ibrahim
James Brown
Nkọwa foto, Ị nụtụla maka 'Princess of Africa'(James Brown)?
Ihuoma Linda Ejiofor
Nkọwa foto, Ihuoma Linda Ejiofor
Nancy Isime
Nkọwa foto, Nancy Isime

Ndị ụmụ nwoke a na-achịkwanụ?

Pretty Mike
Nkọwa foto, Pretty Mike na nwa atụrụ ya
White Money
Mawuli Gavor

Ebe foto si, BBC Sport

Daniel K Daniel
Nkọwa foto, Daniel K Daniel

AMVCA pụtara 'Africa Magic Viewers Choice Award bụ mmemme nturugo amalitere n'afọ 2013 iji chọpụta ma kwado ndị na-eme ọfụma n'ihe onyonyo.

Ihe onyonyo a na-akwanyekwara ndị gbara mbọ na mba Afrịka ndị ọzọ ugwu iji kpalite mmụọ ha.

Ihe ndị ha na-elegara anya ịme nhọpụta a bụ ihe onyonyo ndị emerela n'afọ gara aga.