"Nnamdi Kanu pụta taa obodo ga-ajụ oyi n'ala Igbo"

Ebe foto si, Charles Ogbu, Ebere Chikezie, FCC Jones/ NGR Government
Dịka okwu ntọghapụ Nnamdi Kanu na-ewu ebe niile, BBC etinyela anya n’ihe ikpe nke ụlọikpe nyere n’ụbọchị Tọzde pụtara.
Na mkparịtaụka anyị na ndị ọnụ na-eru n’okwu gbasara ọchịchị nakwa otu onye ọkaiwu, ụfọdụ ihe dị mkpa malitere maka okwu ahụ.
Ndị bịara ya bụ mkparịtaụka bụ Ebere Chikezie bụ onye ọkaiwu, Charles Ogbu bụ onye ọnụ na-eru n’okwu gbasara ọdịmma ndị Igbo nakwa FCC Jones Owuasoanya bụbu ọnụ na-ekwuru APC n’Imo steeti.
Dika ọkaiwu Chikezie si kwu, o nweghi ihe gbochiri gọọmentị etiti ịtọghapụ Nnamdi Kanu dịka mkpebi ụlọikpe mkpegharị si nye.
Ọ kọwara na onye na-aga ụlọikpe maka ikpe ọbụla kwenyere idebe mkpebi ọbụla si n’ụlọikpe ahụ pụta.
“Mgbe ụlọikpe nyere iwu ahụ bụ mgbe ekwesiri ịtọghapụ Kanu ozugbo ozugbo" ka o kwuru.
O kwukwara sị "ọ bụrụgodi na gọọmentị etiti chọrọ iwega ikpe a ụlọikpe kachasị, a ga-ebu ụzọ tọghapụ Kanu tupu ha e mee nke ahụ"
Ala Igbo jụọ oyi. ọ dịrị Naịjirịa mma
FCC Jones kwuru na n'uche ya, ala Igbo ga-ajụ oyi maọbụru na atọghapụ Nnamdi Kanu.
"Ala Igbo jụọ oyi, ọ dịrị ala Naịjrịa mma" bụkwa ihe ọzọ o kwuru mgbe o tinyere ọnụ n'okwu ahụ.
O kwụnyere Okaiwu Chikezie n'okwu kọwara na tupu gọọmentị Naịjirịa emee mkpegharị ikpe ahụ, Kanu kwesiri ịnwere onwe ya.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na Ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami ekwesighi ịleda iwu ala Naịjirịa anya site n'ika jichi Kanu.
"Mana onyeisiala Naịjirịa ekwela ịtọghapụ Kanu?"

Ebe foto si, Charles Ogbu
Nke a bụ ajụjụ Charles Ogbu na-ajụ na mkparịtaụka ahụ.
O kwuru sị na o kwenyere n'ime obi ya na ọ njichi gọọmenti etiti jichiri Nnamdi Kanu abụghị maka nchekwa chaa chaa.
"Njichi gọọmentị etiti ka jichiri Nnamdi Kanu n'agbanyeghi na ụlọikpe sị ka atọghapụ ya gosiri na gọọmentị etiti enweghi nkwanye ugwu n'ebe iwu ala dị"
Ihe ọzọ dị mkpa o kwuru bụ na mba ọbụla akwadoghi iwu ala debere ya agaghị enwe ọganihu.










