Timi Dakolo: “Ọ bụrụ na Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 a ga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”
Otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo na BBC Igbo nwere mkparịta ụka gbasara ọtụtụ ihe na-eme Naịjirịa ugbua dịka Naijiria na-eme emume ncheta nnwereonwe.
O tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọpụpụ ndị mmadụ na-agbapụ na Naịjirịa ugbua.
Dakolo kwuru na ya agaghị asị ndị mmadụ apụla mana onye echefukwala ụlọ.

Ebe foto si, Timi Dakolo/Facebook
Ọ sị onye obula nwaa ike ya otu ọbụla o nwere ike.
O kwukwara na ya agaghị agwa onye obula onye ọ ga-atụrụ na ntuliaka 2023 mana onye obụla were uche ha lụọrọ onye nwere ike imezi obodo.
O kwuru na “Ọ bụrụ Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 aga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”.
Ị sị na Naịjirịa nwere ọtụtụ ebe ha na-etufu ego bụ nke ha kwesiri iwepụ.
Ọ mara atụ sị na Naịjirịa dịka nwoke mụrụ ọtụtụ ụmụ na-abịakwute ya kwamgbe kwamgbe na-abịa anara ego.
Ụbọchị Nna ha jụrụ inye ya, onye ọbụla ekulie zọwa isi onwe ha.
Dakolo kwuru na ya na-esi egwu ọhụrụ ga-apụta n'afọ ọzọ bụ nke ga-ekwu ọtụtụ egwu ga-ekwu maka ihunnanya, okwukwe na ihe ndị ọzọ.
Gee ihe ndi ọzọ na ihe onyonyo a:




