Timi Dakolo: “Ọ bụrụ na Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 a ga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”

Aha onyonyo, Timi Dakolo: 'Ọ bụrụ Naịjirịa bụ mmadụ dị afọ 62, aga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị'
Timi Dakolo: “Ọ bụrụ na Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 a ga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”

Otiegwu a ma ama bụ Timi Dakolo na BBC Igbo nwere mkparịta ụka gbasara ọtụtụ ihe na-eme Naịjirịa ugbua dịka Naijiria na-eme emume ncheta nnwereonwe.

O tinyere ọnụ n'okwu gbasara ọpụpụ ndị mmadụ na-agbapụ na Naịjirịa ugbua.

Dakolo kwuru na ya agaghị asị ndị mmadụ apụla mana onye echefukwala ụlọ.

Otiegwu a ma ama nke gụrụ egwu 'Great Nation' bụ egwu na-akpalịte mmụọ ọtụtụ banyere Naịjirịa na ọdịnaihu ya.

Ebe foto si, Timi Dakolo/Facebook

Nkọwa foto, Otiegwu a ma ama nke gụrụ egwu 'Great Nation' bụ egwu na-akpalịte mmụọ ọtụtụ banyere Naịjirịa na ọdịnaihu ya.

Ọ sị onye obula nwaa ike ya otu ọbụla o nwere ike.

O kwukwara na ya agaghị agwa onye obula onye ọ ga-atụrụ na ntuliaka 2023 mana onye obụla were uche ha lụọrọ onye nwere ike imezi obodo.

O kwuru na “Ọ bụrụ Naịjirịa bụ mmadụ gbara afọ 62 aga m asị ya nwanne m gaa hazie onwe gị”.

Ị sị na Naịjirịa nwere ọtụtụ ebe ha na-etufu ego bụ nke ha kwesiri iwepụ.

Ọ mara atụ sị na Naịjirịa dịka nwoke mụrụ ọtụtụ ụmụ na-abịakwute ya kwamgbe kwamgbe na-abịa anara ego.

Ụbọchị Nna ha jụrụ inye ya, onye ọbụla ekulie zọwa isi onwe ha.

Dakolo kwuru na ya na-esi egwu ọhụrụ ga-apụta n'afọ ọzọ bụ nke ga-ekwu ọtụtụ egwu ga-ekwu maka ihunnanya, okwukwe na ihe ndị ọzọ.

Gee ihe ndi ọzọ na ihe onyonyo a:

Timi Dakolo