Etu e si chọta ozu otiegwu Chop Boii na ndị enyi ya atọ n'Abuja

Chopboii

Ebe foto si, Chopboii/Instagram

Nkọwa foto, Anpe Pankyes Samson, bụ otiegwu tupu o zute ọnwụ ya

Akụkọ ọhụrụ apụtala maka ọnwụ Anpe Pankyes Samson, bụ otiegwu a ma dịka Chop Boii na Naịjiria, onye a hụrụ ozu ya na ndị enyi ya atọ n'ime ụlọ na Gwarimpa dị n'Abuja nso nso a.

A chọtara ozu Chop Boii bụ onye si Plateau steeti, onye mmepụta egwu ya a ma dịka Beerollings, enyi nwaanyị Beerollings na otu nwoke ọzọ, n'ime ụlọ ahụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Septemba 2022.

Dịka akụkọ si kwuo, enyi nwaanyị Chop Boii malitere ịchọ ya ka ọ na-anụghị olu ya ka otu ụbọchị gachara, ese ọ jụwara ndị enyi ya ka o ji mara na ọ bụ otu enyi ya ọzọ ka a ma na ha abụọ nọ mgbe ikpeazụ anya hụrụ ya.

Enyi ya nwaanyị ahụ kpọrọ ndị uweojii; ndị du ya gaa n'ụlọ enyi ya nwoke ahụ (onye nke atọ a hụrụ ozu ya) ebe a nọ wee hụ na ndị amabeghi ndị ha bụ egbukasịala mmadụ anọ ahụ nọ n'ụlọ ahụ.

Ka ọ dị ugbua, ebugala ozu ha n'ụlọozu dị nke Kubwa General Hospital.

Ndị uweojii amalitela ime nnyocha ịma etu ihe si gaa.

Akụkọ ka na-abịa.