Ogbaru Massacre: Ọ bụ ndị nkịtị ka e gburu n'Ogbaru?

Ebe foto si, Screenshot
Akụkọ fegharịrị na soshal midia na e gburu ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha n'Ogbaru dị n'Anambra steeti ọ bụ eziokwu?
Akụkọ ahụ fegharịrị kwuru na ndị ọrụ nchekwa wakporo Okpuruọchịchị Ogbaru n'Anambra steeti, ma gbagbuo ndị na-enweghi ihe ha mere, n'izu gara aga.
Mana ndị dị iche iche bi n'obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị omekome a ma ama ka ndị ọrụ nchekwa chọ bịa n'obodo ahụ.
Ha kwuru na mgbe ndị agha ahụ bịara, ha gwara ndị mmadụ ka ha baa n'ime ụlọ n'ihi na ọ bụghị ha ka ha chọ bịa.
Ha kwuru na ndị omekome a akpaala oke arụ n'obodo ahụ ma tinye ndị obodo ahụ n'oke ụjọ, nke bụ na ọtụtụ ndị obodo ahụ esila n'obodo ahụ gbafuo.
Ha sị na ọ bụ nke a mere ka ndị ọrụ nchekwa bịa tinye aka.

Ebe foto si, Screenshot
Otu onye bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'Okpuruọchịchị ahụ na-achọghị ka a kpọọ ya aha, ziputere ozi na-akpọ oku ka ndị Ogbaru gbara ọsọ n'obodo ha lọghachite.
N'ozi ahụ, o kwuru na ọ ma na ya bụ mwakpo ndị ọrụ nchekwa mere etinyela ndị Ogbaru n'ụjọ na mgbagwoju anya, mana ndị agha anaghị ebuso ndị Ogbaru agha "n'ihi na ndị Ogbaru abụghị ndị otu ojiegbe amaghị ndị ha abụ", ma kwuo na "ndị ọrụ nchekwa ma ndị ha chọ bịa, ọ bụghị Ụmụ Ogbaru".
Ihe mere 'Ogbaru Massacre' ji ewu na soshal midia na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-efegharị ugbua na soshal midia na-ekwu na ndị agha Naịjirịa wakporo mpaghara Ogbaru Anambra steeti ma gbuo ọtụtụ ndị ntorobịa ebe ahụ.
Ogbaru bụ mpaghara dị nso n'osimiri Naịjia n'Anambra steeti.
Ọtụtụ foto nakwa onyonyo ndị e gburu egbu na-efesa ebe niile ugbua, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ndị agha wakporo obodo ahụ n'ihi ebubo na ndị ekperima ji mpaghara ahụ mere isi ụlọọrụ ha.
BBC Igbo amatabeghị ma foto nakwa onyonyo niile abụcha eziokwu, mana ndị bi n'Ogbaru gwara BBC Igbo na ndị agha wakporo obodo ha n'ezie.
N'aka nke ọzọ, ndị uweojii Anambra steeti sị na ha anụbeghị maka ihe a merenụ.
Anyị na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị agha maka ya bụ okwu.
Ihe ndi bi n'Ogbaru kwuru maka nke a
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu onye bi na mpaghara ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na n'ezie, ọ bụ ndị ekperima ka ndị agha ahụ chọtara.
Onye a kwuru na nke bụ eziokwu bụ na mpaghara Ogbaru, Atani, Osomala, na Ogwu Aniocha bụ ebe ndị ekperima jizi mere ebe obibi.
O kwuru na ụra anaghị aga ha bụ ndi bi ebe ahụ n'anya n'ihi mmekpa ahụ ndị ekperima.
Nwa amadi ahụ kwuru sị: "Ee, ọ bụ eziokwu na ndị agha bịara Ogbaru n''isi ụtụtụ ụbọchị June 29. Mana ọ bụghị eziokwu na ha gbagbusiri ndị aka ha dị ọcha."
"Oge ha bịara, ha gwara nụfọdụ ndị ha hụrụ n'ezi ka onye ọbụla lakpuo n'ụlọ."
"Ọ bụ ndị ekperima ka ha chọrọ bịa. Ọtụtụ ndị ha gburu bụkwa ndị ekperima onye ọbụla ma ama."
"Mmadụ abụọ n'ime ha bụ ndị buuru ọgbatumtum nna m n'ike n'oge gara aga, na-ekwu na onweghị ihe mmadụ ga-eme ha."
Nwa amadi a gwara anyị okwu kwuru na ọ maghị kpọmkwem ndị mere mwakpo a, ma ha abụ ndị agha, ka ọ bụ ndị agha mmiri a kpọrọ 'Navy'.
Matakwa na akwa ndị agha niile, ma ndị ala, ma ndị mmiri ma ndị elu, yitere onwe ha.
Ọ bụ naanị onye ma ndịịche dị na ha nwere ike ịmata ndị bụ ndị n'ime ha.
Chetakwa na ndị agha mmiri nwere ebe obibi, Bekee kpọrọ 'Naval Base' n'Ogbaru.
Onye ọzọkwa anyị kpọrọ kwuru na ya hapụrụ Ogbaru n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa June, mana ndị be ha nọ n'ụlọ kesara akụkọ na foto mwakpo ahụ n'ọgbakọ ndị Ogbaru na whatsapp.
Onye a kwuru sị: "Nke bụ eziokwu bụ na ndị a kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' ewegharala ụfọdụ mpaghara n'okirikiri Ogbaru."
"Obodo Ogwu-Aniocha dịzi ka ebe a gbara ọsọ agha, ndị mmadụ esila na mpaghara ahụ niile pụọ, maka ihi ndị ekperima."
"Eji m n'aka na ebumnuche ndị ekperima a bụ iji Ogwu-Aniocha mere ebe obibi ha, maka na enweghịzi ndị bi ebe ahụ."
"Kamgbe e gbuchara Igwe ndị Ogwu-Aniocha n'ọnwa Nọvemba 2021, ọtụtụ ndị eze obodo dị icheiche n'Ogbaru agbaala ọsọ, ụjọ anaghịkwa ekweha lọta ụlọ."
"Onye ọbụla na-ekwu na ọ bụ ndị aka ha dị ọcha ka ndị agha gburu, bụ onye asị. ụmụaka ahụ niile esonyerela ndị otu ọjọọ."
BBC Igbo dere akụkọ gbasara ọgbaaghara nke butere ọnwụ Eze ndị Ogwu-Aniocha n'ọnwa Nọvemba afọ 2021
Nwa amadi a kwuru na ọ bụ egwu mere ya ji rụọ ọrụ o ji n'aka n'Ogbaru ngwa ngwa ma si ebe ahụ gbapụ.
Otu ihe ọzọ onye a gwara anyị bụ na "ọ bụ naanị otu nwoke ka ndị obodo na-ekwu na mgbọ na-efe efe tụgburu."
Ọ gara n'ihu kọọrọ anyị etu ndị mmadụ si ebi n'ụjọ na mpaghara ahụ niile, ma kwuo na ndị a abụghị ndị na-azọ nnwereonwe, kama "ha bụ ndị ESN adigboroja".
ESN pụtara 'Eastern Security Network', nke bụ ngalaba nche nke Nnamdi Kanu, onyeisi ndị otu Ipob hibere.
Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndi ESN na IPOB bụ ndị na-eyi ndị mmadụ egwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Mana ugboro ugboro ka ndị isi ha gọrọ na aka ha adịghị ya









