"Ọ bụghị mụnwa sị ka emeere m achịcha Bekee Biafra, ọ bụ mmadụ nyere m ya - Nwoba Chika

Aha onyonyo, Biafra Wedding Cake: "Ọ bụghị mụnwa sị ka emeere m achịcha Bekee Biafra"
Chika Nwoba na nwunye ya

Ebe foto si, Chika Nwoba

Chika Nwoba bụ onye mgbasaozi Peoples Democratic Party ekwuola ka ndị Department of State Services si kpoo ya oku gbasara achịcha agbamakwụkwọ ya.

Ọ kọwaara BBC Igbo etu achịcha Bekee ahụ si banye aka ma kwuo na o nweghi ihe ọ ma maka ya.

Ọ sịkwa na otu PDP o so na ya nyere ya nkwado mgbe ọ di ya oke mkpa.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.

Etu achịcha agbamakwụkwọ m si mee ka DSS kpọọ m oku

Chika Nwoba kwuru na DSS gwara ya bia n'ụlọọrụ ha taa bụ June 28, 2022 n'elekere 12 nke ehihie

Ebe foto si, Chika Nwoba Facebook page

Chika Nwaoba bụ onye mgbasaozi Peoples Democratic Party ekwuola ka ndị Department of State Services si kpoo ya oku gbasara achịcha agbamakwụkwọ ya.

Nwoba wepụtara foto ebe ya na ọdịnobi ya gbara akwụkwọ n'ụbọchị June 25, 2022.

Nwoba depụtara n'akara soshal midia ya ma gwakwa BBC Igbo na ọ bụ taa bụ June 28, 2022 ka ụlọọrụ DSS dị n'Ebonyi state si ya bia zaa oku ha.

Ọ gwara anyị na ha ekwughị kpọmkwem ihe mere ha ji akpọ ya oku ma na ya bụ Nwoba ma na ọghaghị ịbụ maka achịcha bekee o ji mee agbamakwụkwọ ya.

Foto achịcha beke ahụ efegharịwala n'elu soshal midia maka etu e si jiri agwa na njirimara Biafra wee chọọ ya mma.

Kedụ ebe achịcha bekee a si?

Nwoba kwuru na ọ bụghị ya kwuru ka e mere ya achịcha bekee ahụ.

O kwuru na ọ bụ mmadụ mere ya bụ achịcha butere ya.

Nwoba kwuru na ihe mere o ji nara ya bụ achịcha wee mee agbamakwụkwọ ya bụ makana agwa Biafra ahụ masịrị ya dịka onye Igbo.

O kwukwara na aka ọrụ onye mere achịcha ahụ ma bunye ya bara ya anya, nke mere o ji kwe jiri ya gbaa akwụkwọ.

Nwoba kwuru na ọ ga-aza oku DSS taa bụ June 28, 2022 n'elekere iri na abụọ nke ehihie taa ma kọrọ ụwa ihe o jetere.

Ihe DSS kwuru maka oku a Nwoba kwuru na akpọrọ ya

Ụlọ ọrụ Department of State Service (DSS) ekwuola na ndụmọdụ ha na-enye Nwoba bụ ka ọ zaa oku a kpọrọ ya maọbụrụ n'ezie na DSS kpọrọ ya.

Peter Afunanya bụ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ DSS kwuru n'ozi o zitere BBC Igbo n'ekwenti na onweghị ihe dị njọ ma ndị ọrụ nchekwa kpọọ mmadụ ha chee ga-abara nyocha ha na-eme uru, oku ma gbaa ya ajụjụ ọnụ. O kwuru na ọ bụ etu a ka e si eme ya na mba ụwa niile.