Ihe mere anyị agaghị akpọpụta Edozie Njoku dịka onyeisi APGA - Inec

Ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) akọwaala ihe mere ha agaghị ahụta onyeisi otu alaka pati 'All Progressives Grand Alliance (Apga)' bụ Edozie Njoku dịka onyeisi pati ahụ n'ezie.
Edozie Njoku site n'akwụkwọ ozi nke ndị ọkaiwu ya zigara onyeisioche Inec nke otu n'ime ha bụ C.L Egbuchunem binyere aka n'ụbọchị Tọzde bụ abalị iri atọ nke ọnwa June afọ 2022, na-arịọ ka ụlọọrụ Inec nabata mkpebi ụlọikpe kachasị (Supreme Court) nke kwuru na ọ bụ Edozie Njoku kwesịrị ịbụ onyeisioche Apga.
N’ozi Victor Oye onye ya na Edozie Njoku na-adọ okwu onye ọchịchị APGA dịịrị, ọ gwara BBC Igbo na akwụkwọ ozi a Njoku zịpụtara n'ọha bụ akwụkwọ na-achịtaghị aja dịka o boro ebubo na Njoku bipụtara akwụkwọ ozi ụgha n’aha ụlọikpe kachasị iji ghọgbuo ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ Inec.
Ọ gara n’ihu kwuo na Njoku bụ onye agụghọ nke bụ na ọ bụghịdị onye pati Apga ma kọwa na ụlọikpe kachasị nyere ya bụ Oye ikike ịbụ onyeisi pati Apga n’ụbọchị 14 nke ọnwa Ọktoba, 2021.
Mana ozi Njoku nye Inec si, "Onye anyị na-anọchite detaburu ụlọọrụ gị akwụkwọ ozi n'abalị 29 nke ọnwa Juun afọ 2022 nke anyị gwa ụlọọrụ a maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị na Edozie Njoku bụ onyeisioche Apga nke anyị kwakwụnyere n'akwụkwọ ozi a."
" ...Anyị na-arịọ gị ka ịnabata onye anyị na-anọchite bụ Edozie Njoku dịka onyeisioche Njoku otu APGA ma nye ya ugwu dịrị ọkwa ya."
Mana nkọwa Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec nyere BBC Igbo na mkparịtaụka ekwentị na mgbede Fraịde, o kwuru na dịka o merela ihe karịrị ọnwa asatọ Ụlọikpe Kachasị nyere mkpebi ahụ (e nyere mkpebi ahụ na 14/10/2021), kwe nyere n'ezie na Inec emeghị ihe kwesịrị, na Edozie Njoku na ndị ọkaiwu nwere ohere ịgba Inec akwụkwọ maka nnupusi n'ihe ụlọikpe kpebiri.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Etu okwu a si malite

Ebe foto si, Victor Oye/Edozie Njoku
Otu APGA nwere alaka abụọ nke hiwere ntuliaka na Mee 31 afọ 2019 , otu tụpụtara Victor Oye dịka onyeisioche pati ahụ, na ntuliaka e mere n'Ọka, Anambara steeti, ebe alaka nke ọzọ mere ntuliaka n'Owere nke tụpụtara Edozie Njoku dịka onyeisioche ha.
Oye gara ụlọikpe inweta ntuziaka ka Njoku kwụsị ikpo onwe ya onyeisioche Apga.
Njoku gakwara n'Ụlọikpe Ukwu nke etiti nweta mkpebi sị ka Inec nabata ya dịka onyeisioche n'ezie.
Oye gara n'ụlọikpe nke ya natakwa ikike ka e jichie mkpebi ahụ Ụlọikpe Ukwu nke Etiti nyere Njoku.
Mana dịka Njoku na Oye na-adọrịta onye bụ onyeisi APGA, otu ndị isi pati ha chụturu ha abụọ n’ọkwa, họpụta Jude Okeke , onye bụ Osote Onyeisioche mpaghara Ndịda Anyanwụ mgbe ahụ ka o jigodị ọkwa na-arụ dịka onyeisioche n’ọnwa Juun afọ 2021.
Oge ntuliaka gọvanọ Anambara kpụdebere nso, Jude Okeke bụbu osote onyeisioche pati ahụ n'oge gara aga, tipụtara ma chụtuo Oye na ndịisi Apga ma kwụsị Njoku ọrụ n'ike.

Ebe foto si, APGA
Cheta na ọchịchị Okeke haziri ntuliaka imeụlọ nke nyere Chukwuma Umeoji ikike ka ọ nọchite anya Apga na ntuliaka gọvanọ Anambra e merela na Novemba 2021, ebe ọchịchị Oye mere ntuliaka wepụtara Charles Soludo dịka gọvanọ.
Inec gburu oge itinye aha Soludo n'ọbaozi ha, Jude Okeke na ndị otu ya gbagara n'ụlọikpe Jigawa steeti nweta mkpebi kwuru na ọ bụ ya bụ onyeisioche APGA n'ezie dịka ọ nọchiri njoku bụ onye akwụsịrị n'ike. Inec gara n'ihu tinye aha Umeoji n'ọbaozi ha dịka onye ga-efere APGA ọkọlọtọ na ntuliaka gọvanọ Anambara steeti.

Ebe foto si, Charles Soludo
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Oye gbaghara ihe Inec mere na itinye aha Umeoji dịka dịka onye ga-anọchite Apga ebe Okeke gbara akwụkwọ etinye aha ya dịka onye e soro gbaa akwụkwọ n’ikpe ụlọikpe Jigawa steeti kpere. Ọ gara ụlọikpe mkpegharị dị na Kano rịọ ka ha tụsa mkpebi nke Jigawa n’ụsọ. Maka ịdahie n’usoro e si ekpe ikpe. Nke ụlọikpe ahụ nyere ya mkpebi. Ma nye Inec iwu ka e tinye aha Charles Soludo.
Jude Okeke zọpụrụ gaa Ụlọikpe Kachasị sị ya dosa mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị nyere n'ụsọ. N'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2021, Ụlọikpe Kachasị nyere mkpebi n'ikpe ahụ nwere akara No. SC.CV/687/2021 nke Okeke gbara Edozie Njoku , Alhaji Rabiu'u Garba (Garba bụ onye Jiwaga steeti gbaburu Njoku akwụkwọ na steeti ya sị na ọ bụ ya bụ onyeisioche Apga n'ezie) na Inec, Ụlọikpe Kachasị kụpụrụ mkpebi ụlọikpe Mkpegharị nke Kano sị na "ihe butere okwu emeghị na Jigawa steeti".
Mana na ndepụta mkpebi ahụ, ụlọikpe dehiere aha onye ha nyere mmeri, denye Oye, hapụ idenye Edozie Njoku nke mere ka ha laghachi Ụlọikpe Kachasị ọzọ, ụlọikpe dezigharịa ya.
Mana Oye gbaghara nke a sị na ọ bụ mpụ ịdegharị mkpebị ụlọikpe n'ụzọ na-akwụghị ọtọ.
N'ihi nke a, Edozie Njoku chọrọ ka Inec kwuo na ọ bụ ya bụ onyeisi Apga, ọ bụghị Victor Ike Oye.
Cheta na ọ bụ Victor Oye bụ onyeisi Apga ka ọ dị ugbua.
Ihe Edozie Njoku gwara BBC Igbo

Ebe foto si, Edozie Njoku
Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Edozie Njoku, o kwuru na n'ezie ọ bụ ya meriri ntuliaka nke Pati mere n'afọ 2019 iji họpụta onyeisioche pati ahụ.
Ọ gara n'ihu kọwaa na dịka ya bụ okwu pụrụ ụlọikpe, na ya enwetala mmeri malite n'ụlọikpe nta ruo ụlọikpe kachasị.
"Ọ gbara m gharịị ihe mere na Inec achọghị ịnabata mkpebi ụlọikpe nyere ma kwuo na ọ bụ mụ bụ onyeisioche Apga," Njoku kwuru.
"Mana obi agaghị ada anyị mbọ, anyị ga na-agba mbọ iji hụ na Inec rubere isi na mkpebi ụlọikpe."
Ihe Victor Oye sara n'okwu a

Ebe foto si, Victor Oye
Iji saa nke, Oye gwara BBC Igbo ma boo ebubo na Njoku bụ ntisa dịka ọ na-aụta kwa mgbe oge ntuliaka ọbụla kpalite ọgbaghara na pati Apga.
Ọ sị na ya bụ okwu kwesịrị ịbụ ihe ndị uweojii ga-etinye aka ma nyocha.
O kwuru: "ihe bụ ihe ọ mere n'oge ntuliaka gọvanọ Anambra nke 2021 ma tụọ asị na ahọpụtala ya dịka onye ga-azọchịtere Apga ọkwa Gọvanọ na ya bụ ntuliaka"
Oye gara n'ihu kwuo:
"Nwoke a abụghịdị onye Anambra steeti, ọ bụ onye Mbaise nke Imo steeti, kedụ onye so mee ma nyocha ọgbakọ pati a ọ sị e mere n'Owerri?"
Ọ gara n'ihu gwaa ọha ka ha ghara ige Njoku ntị ma ncha.
Ihe Inec kwuru gbasara nke a

Festus Okoye kwuru sị: "Ọ bụrụ na ụlọikpe nye mkpebi, iwu ji Inec irube isi na mkpebi ahụ."
"Ọ bụrụ na Inec erubeghị isi, onye ahụ nwere ikike ịgakwu ụlọikpe gwa ha na Inec na-enupu isi, ma gwakwa ha ka ha manye Inec ka ha rube isi."
"Ọ bụrụ na nke a amịtaghị mkpụrụ, onye ahụ nwere ikike ịga gwa Ụlọikpe ha ka tụkpuo ndị isi Inec na mkpọrọ maka inupuru ụlọikpe isi."
"Ọ bụ eziokwu na anatala akwụkwọ ahụ (nke Edozie Njoku na ndị ọkaiwu ya dere), mana kedu ụbọchị ụlọikpe kachasị nyere ya bụ mkpebi?"
"Gịnị mere kemgbe Ọkutoba 14 2021 ruo ugbua? Gịnị mere ha ji ewetara Inec akwụkwọ mkpebi ahụ ugbua?"
"Ọ bụrụ na ha chọọ, ha gaa gbaa Inec akwụkwọ maka nnupu isi."
Na mbido...

Na mbido, APGA bụ otu APGA nke Chekwas Okorie malitere na abalị 22 nke ọnwa Juun 2002.
Okorie natara asambodo ndebanye aha n'aka Inec n'emume nke onyeisioche Inec oge ahụ bụ Abel Guobadia,nọ n'isi ya.
Esemokwu malitere n'Apga oge onyeisioche mbụ otu Chekwas Okorie na odebe ego otu ahụ bụ Victor Umeh kwarịtakwara nke mere ka a chụpụ Okorie na pati ahụ.
Dike Biafra bụ Emeka Odumegwu Ojukwu banyere APGA, onwe isi e jicha malite ya ma zọkwa onyeisiala n'aha pati n'afọ 2003 ahụ mana o merighị dịka o nwetara nanị pasent 3.3 vootu a tụrụ na ntuliaka ahụ.
Mana APGA nwetara oche abụọ n'ime oche 360 dị n'Ụlọomeiwu Nta.
N'afọ 2007, Ojukwu zọkwara ọzọ, mana o merighị.
APGA nwetara mmeri mbụ ya n'ọkwa gọvanọ n'afọ 2011 oge Rochas Okorocha zọrọ n'aha pati ahu.












