Etu ndị mba Amerịka 37 si agbụrụ Igbo si mee emume iza aha Igbo n'Enugwu

Emume igu ndị Amerịka aha

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Otu Ohaneze Ndigbo anabatala mmadụ iri atọ na asaa ndị isi ojii si mba Amerịka chọpụtara na ha si agbụrụ Igbo.

E meere ndị ahụ bụ ụmụakwụkwọ na ndị na-arụ ọrụ n'ụlọakwụkwọ Morehouse College Glee Club dị n' Atlanta, Amerịka emume iji gụ ha aha Igbo n'ọgbakọ pụrụ iche nke otu Ọhaneze Ndigbo na eze Ibagwa-Aka dị n' Igbo-Eze South Enugwu Steeti bụ Igwe Hyacinth Eze, nọ n' isi ya na mahadum 'University of Nigeria Nsukka'.

Ndị ụmụakwụkwọ MooreHouse college so mee emume ịgụ aha Igbo ahụ

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Alex Ogbonna bụ ọnụ na-ekwuchitere Ohaneze kọwara na njem ndị ahụ bịara nakwa aha a gụrụ ha dị mkpa iji me ka ha mara onwe ha.

Ogbonna gwara BBC na ndị ahụ bụ ndị Igbo ezupuru mgbe e ji ndị isi ojii agba ohu.

"Mana ihe a wutere m n'ihi na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Igbo nke gosiri na Igbo erere (n'oge ịgba ohu) karịrị" ka Ogbonna kwuru.

Emume ahụ emere n'Enugwu

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Ihe mere emume igụ aha a ji dị mkpa

Emume ahụ emere n'Enugwu

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo

Ogbonnaya kọwara ihe mere emume ịgụ aha a ji dịrị ndị ahụ bịara njem mkpa.

Ọ kọwara na mgbe niile echiche amaghi onwe ha ga na-enye ha nsogbu mana ugbua a gụrụ ha aha Igbo, mkpụrụ obi ha ga-eru ala.

Ogbonnaya kọwara sị,"Ọ dị ka mmadụ nwụọ akwaghị ya, ọ bụru ozu akwaghi akwa na-enye nsogbu mana a gụọ aha ndị be gị, ọ na-atọ ụtọ."