Ndụ m nọ na nsogbu n'ihi na e nwere ike igbu maka iso nwoke ibe m- Nwoke esi Briten tụlata Naijiria

Onye mbịarambịara nktịtị e si mba ọzọ bụlata

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye nọ na foto a na onye kọrọ akụkọ abụghị otu onye.

Otu nwoke onye Naijiria mba Briten tụlatara na nso nso a ebela akwa arịrị maka egwu na e nwere ike igbu ya n'ihi na ọ bụ nwoke na-edina nwoke ibe ya.

Mba Briten nọrọ ụbọchị Tozde tụlata ụfọdụ ndị isiojii gụnyere ndị Naijiria mmadụ 11 na ndị Gana asatọ.

Dịka nwoke ahụ akpọghị aha ya siri gwa BBC Focus Africa Radio, nwoke ahụ so na ndị mba Briten tụlatara na Naijiria ụbọchị Tọzde kwụụ sị na “ndụ m nọ na nnukwu nsogbu n'ihi na abụm nwoke nwoke ibe m na-amasị."

Na Naijiria nwoke maọbụ nwaanyị idina ibe ya megidere iwu.

Nwoke ahụ gbara afọ 46, kwuru na ya na adanyeghị na nsogbu ọbụla megidere iwu na mba Briten.

"Aganụbeghị nga, o nwebeghị okwu ebe a mara m ikpe."

" Naanị njọ m mere bụ ibụ nwoke nwoke ibe m na-amasị."

Ha tụlatara m n'ihi na ha sị na onweghị ihe mkpagbu ọbụla mere m ga-eji anọọ na mba Briten."

Ọ gara n'ihu kwuo na ya si na Naijiria gbaa ọsọndụ gbata mba Briten oge a chụụ ya n'ọrụ n'ihi na ya na-edina nwoke ibe ya.

Na mba Briten, gọọmentị ejighị anya ọma ele ndị akwụkwọ mbịarambịara ha ezughị oke.