Etu ndị 'unknown gunmen' siri wakpoo ndị uweojii n'Enugwu na Juun 30,2022

Ebe foto si, Getty
Ndị ojiegbe wakporo ndị uweojii nọ n'ọrụ ịkwụsị ma nnyocha ụgbọala n'ụtụtụ taa bụ Tọzde, abalị 30 nke ọnwa Juun, afọ 2022, dịka ndị uweojii steeti ahụ si kwuo.
Akụkọ kwuru na ndị n
Ụfọdụ ụlọtaakụkọ gunyere Channels TV na Vanguard kwuru na ndị ojiegbe gburu ndị uweojii abụọ dịka ha na ndị uweojii kwarịtara mgbọ na Gariki, dị n'Enugwu n'ebe ndị uweojii na-eche nche nke Bekee kpọrọ 'checkpoint' n'ụtụtụ Tọzde.
N'ọsịsa ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe nyere BBC Igbo n'ozi ekwentị, o kwetara na "ndị agboro a mabeghị ndị ha bụ wakporo ndị uweojii nọ ọrụ ịkwụsị ma nyocha ụgbọala n'okporoụzọ si Agbani Road dị nsọ na okporoụzọ awarawara si Enugwu gawa Pọtakọt,"
Mana o kwughị ma ha adị ndụ ma ha anwụrụ anwụ.
Ndukwe kwuru na "ka ya bụ ihe siri mee edobeghị anyị anya", ma kwukwa na ndị ọrụ ha ejikerela na-achụ ndị omekome ahụ."
Cheta na mwakpo ndị uweojii na ogige ha na-arị elu kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Gọọmentị Naijiria na ndị ọrụ nchekwa eboola otu mnwereonwe Biafra bụ Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN ebubo ịnyụ ihe na-esi.
Mana ugboro ugboro Ipob gọrọ n'aka ha adịghị ya.











