Gịnị na-esere Rochas Okorocha, Nana Opiah na Ahmed Lawan?

Ebe foto si, Rochas Okorocha/ Ahmed Lawan/ Nana Opiah
Ihe dịka egwu a gwara ọkwa dapụtara n'Ụlọomeiwu Ukwu ụbọchị Wenezde dịka Onyeisi ụlọomeiwu bụ Senetọ Ahmed Lawan pịnyụrụ igwe e ji ekwu okwu, jụ inye Rochas Okorocha ohere ikwu okwu n'ọgbakọ ha na-enyocha ndị Onyeisiala Mụhammadụ Buhari maka ọkwa mịnịsta.
Tụmsara dapụtara dịka Okorocha bụ senetọ na-anọchite anya Imo-West chọrọ ịjụ Nana Opiah bụbụ onyeisi Ụlọomeiwu Imo steeti bụ Nana Opiah ajụjụ oge ọ bịara n'ihu ndị omeiwu maka nnyocha.
Iwe gbara Okorocha nke mere ka o bowe ebubo na Lawan na-ele anya n'ihu n'ihi na o nyere ogbo ya bụ Senetọ Francis Onyewuchi Ezennwa, ohere ikwu okwu.OnEzenwa kwuru na Opiah zuru ka e mee dịka o jiderela ọtụtụ ọkwa n'ọchịchị ma rịọ ka ụlọomeiwu hapụ ya ka o gbuchaa, ma gawa.
N'ọsịsa ebubo Okorocha, Lawan kwuru na ndị omeiwu nwere omenala ha na-emere onye bụbụ onye omeiwu site na ị hapụ ịgba ya ajụjọ kama ha sị onye ahụ gawa.
Ọ sịrị, "Anyị nwere iwu na-agbaziri anyị ụzọ. Ọ bụrụ na anyị kpebie ihe, ka anyị kwụrụ na ihe anyị kpebiri."
"Mkpebi anyị nwere bụ ha bịa, ha gbuchaa, gawa."
N'okwu ya, Opiah gwara ndị ntaakụkọ na o nweghị ihe na-esere ya na Okorocha, sị na o nweghị ihe ọjọọ Okorocha buuru ya n'obi.
Ihe i kwesịrị ị ma maka Opiah

Ebe foto si, Nana Opiah
- Ọpiah bụ Komishona na-ahụ maka mmanụ agbidi n'Imo steeti.
- Ọ bụbụ onyeisi Ụlọomeiwu Imo steeti
- Dịka Omeiwu , ọ na-anọchite anya mpaghara Ohaji/Egbema, Oguta na Oru West n'Ụlọomeiwu Nta






