Tọhapụnụ Nnamdi Kanu- Ortom

Ebe foto si, Getty images/Samuel Ortom
Aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom akpọọla oku ka Gọọmentị Etiti tọhapụ onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu.
Gọọmentị Etiti nwụchiri Kanu kemgbe Juun afọ 2021, kpụpụ ya ụlọikpe ebe ọ na-azara ọnụ maka ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
Mana na mkparịtaụka Ortom na ụlọntaakụkọ AriseTV nwere n’ụtụtụ Wenezde, o kwuru na ọ maghị ihe a ga-eji jichie Nnamdi Kanu bụ onye na-alụ ọgụ maka nnwereonwe ndị nke ya, ma hapụ ndị ọchịehi na ndị ekperima ha na-egbusi mmadụ na mpaghara dị iche iche na Naijiria.
O kwuru na agụụ na ụbịam ji ọtụtụ ụmụ Naijiria mana nke ka njọ bụ na ndị gaa ugbo, ndị ekperima awakpoo ha.
Anyị na-ata ahụhụ. Ụmụ Naijiria na-arịa agụụ na ụbịam."
"Ụfọdụ anaghị ahụ tụtụrụ sachaa n'ụbọsị"
"Ị ga-ugbo, ndị ekperima awakpoo gị. Gọọmentị adịghị njikere ime ihe ọbụla maka ya."
"Kedụ ihe e ji jichie Nnamdi Kanu?""N'ezie ana m akpo oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu."
O gara n'ihu boo ebubo na dịka nke a na-eme, na gọọmentị anaghị eme ihe ọ bụla banyere ndị na-eme mwakpo ndị ahụ, kama na ha jichiri Kanu maka ịlụrụ ndị nke ya ọgụ.
Ọrtom sịrị, "Onye ọbụla nwere ọrụ ọ ga-arụ iji zọpụta Naijiria, nke a abụghị okwu APC maọbụ PDP."
"Naijiria na-achọ ighasa. Naijiria nọ n'ụlọọgwụ na-anara 'drip' ugbua."
"Ka anyị hapụ ịghọziri onwe anyị aghụghọ; ndị na-agwa Buhari na ihe dị mma, ihe adịghị mma."
"
'Atiku kwesịrị ịga rịọ Wike'

Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook
Ortom ekwụpụtakwara mgbarụ obi ya maka mgbahapụ onye ga-efere PDP ọkolọtọ na ntuliaka Onyeisiala 2023 bụ Atiku Abubakar gbahapụrụ ịhọrọ gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike dịka Osote ya na ntuliaka na-abịa.
Ortom gwara ụlọntaakụkọ AriseTV na mmadụ 14 n’ime 17 nọ na Kọmiti nke Atiku na PDP hiwere họrọ Wike dịka onye kachasị mma ị bụ Osote onyeisiala mana na Atiku họrọ Gọvanọ Ifeanyị Okowa nke Delta Steeti.
O kwuru na o kwesịrị ka Atiku gaa rịọ Wike dịka onye tụnyerela ihe na ịkwalite otu PDP.
Ọ sị, “ Atụrụ m anya na ọ (Atiku) aga hụ Wike.” Ọ gaghị asị na ọ kpọrọ ya n’ekwentị. Ọ dịghị mma. Wike bụ ide gi pati. Oge ndị mmadụ gbara ọsọ na PDP ọ kwu chịm.”
Ndị isi pati kwesịrị ịga rịọ Wike.










