Etu anyị si kwasaa ogige ndị IPOB/ESN n'Anambra na Enugwu - Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Army
Ndị agha Naịjirịa na-ekwu na ha wakporo ogige ebe ndị ekperima bi n'ime ọhịa dị icheiche n'Anambra nakwa Enugwu.
Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa wepụtara akwụkwọ ozi ebe ọ nọ kọwaa na ọ bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nakwa ndị Eastern Security Network (ESN) bi n'ime ọhịa ahụ.
O kwuru na ogige ndị ekperima ahụ dị n'obodo Idara Nnebo, Ihembosi nakwa Ukpor, nke dị n'okpuru ọchịchị Nnewi South n'Anambra steeti.
N'otu aka ahụ kwa ka ndị agha nke ngalaba '103 battalion' wakporo ogige ndị ekperima dị n'ọhịa Nkwere Inyi nke dị n'Oji River, Enugu.

Ebe foto si, Nigeria Army
N'Anambra, ndị agha chọpụtara egbe AK 47 abụọ, egbe 'pump action' abụọ otu egbe ọka, ọtụtụ mgbọ egbe nakwa igwe na-enye ọkụ atọ.
N'ime ọhịa nke dị n'Oji River, ndị agha hụrụ ụgbọala Lexus nakwa Toyota bụ nke a na-eche na ndị ekperima a napụrụ ndị mmadụ, ọgbatumtum abụọ, otu egbe 'double barrel' na mgbọ ya asaa.
Ndị agha mebikwara okwu arụsị dị n'ebe ahụ.
Onyema Nwachukwu rịọrọ ndị mmadụ ka ha gaa n'ihu na-agbara ndị ọrụ nchekwa ama gbasara ndị omekome na-akpa ike n'ogbe ha.








