BBC Igbo Townhall: Ọrụ anyị abụghị ọrụ nchọpụta ma e rere vootu ma e reghị na ntuliaka imeụlọ - Inec

Ebe foto si, Getty Images/Facebook
Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) asaala ebubo ụfọdụ dapụtara na ọgbakọ nrụrịtaụka nke BBC Igbo Townhall e mere n’ọba ozi soshal midia nke BBC Igbo n’izu a.
Ebubo dapụtara na nrụrịtaụka a gụnyere ebubo na ụfọdụ ndị ‘Delegates’ so mee ntuliaka ime ụlọ nke pati abụọ nwere agba na Naịjiraị bụ All Progressives Congress (APC) na People’s Democratic Party (PDP) n’ọnwa gara aga mere mpụ nke ire nakwa ịzụ vootu.
BBC Igbo zịgara Inec ozi ịchọpụta ebe ha kwụụ n’ebubo a nakwa ihe usoro ọrụ ha kwuru maka ebubo ndị a.

Ebe foto si, Facebook/Inec
Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec gwara BBC Igbo na “usoro na etu ndị patị ọbụla siri mee ntuliaka ime ụlọ ha dịịrị ha. Nke a bụ ikike ime ụlọ ha n’ezie.”
Ọ gara n’ihu kwuo: “Ihe niile gbasara ebe a nọ mee ya, ihe eji mee ya, ụbọchị emere ya, ndị soo menye abụghị ọrụ nakwa ihe dịịrị Inec, ọ bụ ndị ọrụ nchekwa ga-ekwu ma usoro ndị a abụ usoro ọjọọ maọbụ usoro mpụ dị n’ime ya.”
Ọ kọwara kpọm kwem sị: “Ọrụ anyị abụghị ọrụ nchọpụta ma e rere vootu ma e reghị na ntuliaka imeụlọ”
Na ozi ọsịsa a onye nyere BBC Igbo, o kwukwara na akụkụ iwu ntuliaka Naịjirịa nke Section 29 nyere ndị pati ọbụla ya bụ ikike ime ihe niile iwu Naịjirịa kwadoro n’ọrụ nhọpụta onye ga-azọchịtere ha ọkwa ọchịchị na ntuliaka ọbụla.
Cheta na otu pati PDP mere ntuliaka ime ụlọ ha n’ụbọchị 22 nke ọnwa Mee, 2022 ebe otu pati APC mere nke ha n’ụbọchị asaa ruo asatọ nke onwa Juun, 2022.
Ntuliaka ime ụlọ ndị PDP họpụtara Atiku Abubakar dịka onye ga-azọrọ ha ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023 ebe ntuliaka ime ụlọ APC họpụtara Bola Tinubu dịka onye ga-azọchịtere pati APC ya bụ ọkwa na 2023.
Etu okwu a siri dapụta n'ọgbakọ nrụrịtaụka nke BBC Igbo

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Ngozi Anike/Ned Nwoko
Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akpọọla oku ka e wepụ atụmatụ 'delegate' na ntuliaka imeụlọ pati.
Ndị a bụ omeiwu Ned Nwoko, Ọkaiwu Ndidi Anike nakwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị APC bụ Joe Igbokwe, kpọrọ oku a na mkparịtaụka BBC Igbo hiwere ụbọchị Wenezde n'ịntanet.
Okwu mmadụ a bupụtara ebubo dị ịche ịche dịka otu n'ime ha bụ okwu ndị 'Delegates' rere vootu ha.
Mmadụ atọ ndị ọnụ ruru n'okwu a nwere nrụrịtaụka nke isi okwu ya gbadoro ụkwụ n'ajụjụ "O kwesịrị ka e wepụ atụmatụ 'delegate' na ntuliaka imeụlọ pati?"
Ha gwara n'ihu kọwa ihe ikwesiri ima maka ndị 'Delegates', ọrụ pụrụiche ha na-arụ n'ịhọpụta ndị ga-azọ ọkwa, ọ kachasị ọkwa onyeisiala.
O nweghị ihe dị mma n'usoro iji 'delegate' tụọ ntuliaka imeụlọ pati - Ned Nwoko
Onye bụbụ onye omeiwu Naijiria ma bụkwara onye welitere isi n'otu PDP bụ Ned Nwoko ekwuola hoohaa na o nweghị ihe ọma dị n'iji atụmatụ ndị nnọchiteanya pati nke a kpọrọ 'delegates' were mee mbinyeaka nke imeụlọ pati.
Nwoko kwuru nke a na mkparịtaụka BBC Igbo haziri n'ikuku ụbọchị Wednezde, 29 nke ọnwa Juun 2022.
Ọ sị, "'Delegate' bụ ihe anyị gabigara na nsonso a.
"Etu o si gaa bụ ihe ọtụtụ ndị Naijiria katọrọ.
Mụ onwe m akwadoghị ya. "
"Ọ dịghị mma na mmadụ 400 kpebiri onye ga-abụ onyeisiala mba nwere ọnụọgụgụ mmadụ karịrị nde 200."
"Ihe anyị hụrụ ugbua bụ ebe a na-enye ego maka iji nweta vootu. Nke a bụ nrụrụaka."
"Nke a adịghị mma n’ihi na ndị bụ ezigbo mmadụ chọrọ ịzọ ọkwa agaghị enwe ohere ịzọ."
"Etu a ga-esi gbanwee ya bụ ịhụ na onye ọbụla nwere ohere ịzọ maọbụ tụnyere onye na-azọ."

Ebe foto si, Ned Nwoko
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'otu aka ahụ nwaada Igbo bụ Ndidi Anike bụkwa onye ọkaiwu, sịkwa na ya bụ usoro nke naanị ndị "adhoc delegate" e jiri mee ya bụ ntuliaka imeụlọ, adịghị mma chaacha.
Maka na ọ na-ebute nrụrụaka na ngarị.
Ọ sị na e kwesịrị itinye n'iwu nke ga-eme ka ataa onye ọbụla dara ya bụ iwu ahụhụ site n'ịchụpụ ya na pati na kpekwaa onye ahụ ikpe ga-eme ka ọ gaa mkpọrọ ma a chọpụta na o nyere maọbụ nara ngarị iji wepụta onye ga-azọ ọkwa ọchịchị.
Joe Igbokwe n'onwe ya na-ekwusi ike na ọ nweghị ihe dị njọ na itinye ego na ndọrọndọrọ.
Ọ sị na ihe niile a na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ego.
O kwuru si, "a na-etinye ndị mmadụ na hotelụ, nye ha nri na mmiri ma ha pụta ime ya bụ ntuliaka. Ị gaghị akpọpụta mmadụ n'ụlọ ya gbawa ya aka". Mana o kwuru na ọ bụghị ngarị ka a na-enye.
Igbokwe kwukwara na ihe ahụ bụ ohere iji kwughachị ndị mere mmadụ ụgwọ ihe ha meere ha. Dịka ọ sụrụ ya na Bekee, "it is pay back time".
Mana Ndidi zaghachiri ya na ọkwa onyeisiala Naịjirịa abụghị ihe e ji akwụghachị ndị mmadụ ụgwọ ihe ọma e mere ha maka na ọ bụ nke ọha niile.
Ọ sị na nke ahụ bụ nke Bekee kpọrọ "Vote buying".









