Onye bụ Biodun Oyebanji ga-abụ gọvanọ ọhụrụ nke Ekiti steeti?

Ebe foto si, Biodun Oyebanji/Twitter
Biodun Abayomi Oyebanji ga-anọchi anya Gọvanọ Kayode Fayemi dịka gọvanọ ọhụrụ nke Ekiti steeti dịka ngalaba nhazi ntuliaka bụ Inec kwuru na ọ bụ ya meriri ntuliaka e mere n'ụbọchị Satọde, abalị iri na asatọ nke ọnwa Jun afọ 2022.
Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ maka ndụ nwa amadi a:
- Biodun Oyebanji dị afọ iri ise na ise.
- Ọ bụ onye Ikogosi-Ekiti
- Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ praịmarị, sekọndịrị, nakwa Mahadum n'Ekiti steeti
- O nwetara nzere B.Sc n'ọmụmụ gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1989, na mahadum 'Ondo State University' nke bụzi 'Ekiti State University' ugbua
- Ọ rụọla ọrụ ọtụtụ afọ na ngalaba dị icheiche n'Ekiti Steeti.
- Ọ bụ onye enyemaka gọvanọ n'okwu gbasara ụlọ omeiwu, malite n'afọ 199 ruo 2001.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ nke gọvanọ Ekiti steeti bido na 2001 ruo 2003.
- Na 2013, e nyere ya ọkwa dịka Kọmishọna nhazi akụnụba (Economic Planning); ọ nọrọ n'ọkwa a ruo afọ 2014.
- N'afọ 2018 ka e nyere ya ọkwa odeakwụkwọ gọọmentị Ekiti steei, bụ ọkwa o jigide ruo ọnwa Disemba 2021, tupu ọ rịtu iji tinye isi n'ịzọ ọkwa gọvanọ.
Lee nkwa Oyebanji kwere ndị Ekiti dịka ọ na-achụ nta vootu

Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na be ya dị n'Ikogosi Ekiti n'ụtụtụ Sọnde a, Oyebanji kwere nkwa na ya ga-agbakwasa ụkwụ n'ọrụ nke ndị buru ya ụzọ rụọ ọrụ dịka gọvanọ.
Cheta na n'ime akwụkwọ achụmnta vootu ya, nke bekee kpọrọ 'manifesto', Oyebanji kwere nkwa na ọ bụrụ na ya merie, ọchịchị ya ga-agbakwasa ụkwụ na mmepe obodo, ime ka ọtụtụ ndị mmadụ nwee ọrụ, ime ka ndị nwere obere ụlọahịa nakwa ụlọ ọrụ nweta ego enyemaka, ya na iwulite ọnọdụ egwuregwu na steeti ahụ.





