Hijab Controversy: Ihe mere m ji yiri uwe ụkọchụkwu gaa ụlọikpe n'Anambara- Ọkaiwu Abuchi Ogbachalụ

Ebe foto si, Aloysius Attah
Otu onye ọkaiwu akọwaala na ihe mere o ji yiri uwe ụkọchukwu gaa ụlọikpe bụ iji gosi ikike ya dịka nkwenye ya sịrị dị.
Ọkaiwu Abuchi Goshen gbara afọ 38, mere ka ụlọikpe gbaa jim ụbọchị Tozde dịka o yi akwa ụkọchụkwu bịa ikpe n'ụlọikpe majịa dị n' Okpoko, dị n' Okpuruọchịchị Ogbaru n'Anambara Steeti.
Ọkaiwu Abuchi bụ onyeisi ụkọchụkwụ ụka 'Grace and Mercy Gospel Church' dị n'Okpokpo ma nwekwa ngalbaba n' Ekwulobia nakwa Omaba dị n'Ọnicha gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na ",
"Maka na 'Section 38 of the constitution nyere m ikike iyi akwa ụkọchukwu nke m bụ otu onye n'ime ha."
"N'ihi kwado ihe iwu ahụ kwuru, Ụlọikpe Kachasị ekpebiela were sị na na onye ọbụla nwere ikike iso okpukperechi masịị ya n'ikpe dị n'etiti Legọs steeti na otu nwata akwụkwọ Muslim."
Ọkaiwu Ogbachalu Abuchi Goshen, bụ onye ụkọchụkwu bụ onye sị na ọ bụ ụkọchụkwu e tere mmanụ, ji akwa mwụda ụkọchụkwụ ya bịa ikpe o nwere ebe ọ na-ekwuchitere mmadụ n'okwu iti aka.

Ebe foto si, Abuchi Goshen
Oge a kpọlitere ya, ọkaikpe majie n'isi ụlọikpe ahụ bụ CB Mbaegbu bụ onye na-ekpe ikpe ndị ọzọ tupu o rue ikpe nke Goshen bịaara kwụsịrị ikpe ya n'ike ma gwa ya na ọ gaghị apụta n'ihu ya na-eyighị uwe dịka o siri kwesịrị.
Mana Goshen , onye kwuru na dịka Ụlọikpe Kachasị si nye mkpebi na okwu ndị yi hijab aga ụlọakwụkwọ gọọmentị na ya nwere ikike dịrị onye iyi akwa masịrị ya dịka ọ dị n'iwu Naijiria akụkụ nke 38 nke Iwu Naijiria nke afọ 1999.
Ndọghasị okwu ahụ na etiti ọkaiwu ahụ na ọkaikpe ahụ mere ka ụlọikpe ahụ sara ọkụ nke mere ka ọkaikpe mechie ikpe ahụ na-egbughị oge.
Ndị bi n'Okpokpo na ndị nwere ụlọ na ebe ahụ bịara ikpe maka okwu gbasara ebubo na e tiri ndị ọrụ ụlọ na-enye ọkụ latrik ihe nke ndị uweojii wetara n'ụlọikpe. Ndị ọzọ nwekwara ikpe ndị ọzọ dị iche iche n'ụlọikpe ụbọchị ahụ.
Cheta na nsonso a, otu ọkaiwu bụ Malcolm Omoirhobo, tinyere onye ọbụla na gbagharịa dịka o yi akwa ndị omenala bịa ụlọikpe Kachasị ebe o nwere ikpe nke mere ka ndị ọkaikpe kulie gbasaa n'ike.
Nke a na-abịa dịka Ụlọikpe Kachasị nọrọ na nso nso a n'ikpe dị n'etiti Legọs steeti na otu nwata akwụkwọ aha ya bụ Asiyat AbdulKareem kpebiri ma nye ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị okpukpere alakuba ikike iyi 'hijab' aga akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ gọọmentị, sị na dịka ọ dị n'iwu na onye ọbụla nwere ikike iyi uwe masịrị ya.
Ọnye bụdị Ọkaiwu Abuchi Ogbachalụ aha ya na-ewu?

Ebe foto si, Abuchi Goshen
Ogbachalu Abuchi Goshen bụ ọkaiwu na ụkọchụkwụ ụka "Grace and Mercy Church Inc.
Ọ bụ ya bụ onyeisi ụlọọrụ ikpe , Goshen Lawlord Solicitors dị n'Onicha, Anambra steeti
Ọ bụ onyeisioche otu 'Young Lawyers Forum NBA' ngalaba nke okpuruọchịchị Anaocha malite n'afọ 2019 rue 2020.
Ọ na-arụ dịka onyeisioche otu 'Anambra State Indigenous Lawyers Forum'O nweela ọtụtụ ọzụzụ gụnyere ọzụụ n'okwu nchekwa n'ụlọ ọzụzụ 'Institute of Global Peace and Conflict Management'.









