Ebe ka ụka Anglịkan Naijiria kwụ n'okwu ichi nwaanyị Achịbishọpụ nke Canterbury?

 Sarah Mullally na Henry Ndukauba

Ebe foto si, BBC/Church of Nigeria

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe akụkọ gbara na nso nso a na ụka Anglikan nke Ingland ahọpụtala nwaanyị dịka Achịbishọpụ nke Canterbury na-ewu, ajụjụ ọtụtụ kpụ n'ọnụ ọ kachasị ndị otu Kraịstị na Naijiria bụ kedụ ebe ụka Ingland na Naijiria kwụ na mkpebi ọhụrụ ahụ?

N'abalị atọ nke ọnwa Oktoba, afọ 2025, a họpụtara Sarah Mullally dịka Achịbishọpụ Canterbury nke bụ ọkwa Onyeisi ụka Anglịkan na mbaụwa.

Mullaby ga-anọchi anya Justin Welby bụ onye rituru n'ọkwa Achịbishọp nke Canterbry kemgbe otu afọ gara aka dịka ọ gbara arụkwaghịm.

Mana ụka Anglịkan na Naijiria gbarụrụ ihu na nhọpụta ahụ, sị na o megidere nkwenye ọtụtụ ndị Anglịkan na mba ụwa.

Ozi nke Onyeisi Ụka Anglikan na Naijiria bụ Nnukwu Ụkọchukwu Henry Ndukuba binyere aka ma wepụta nke rutere BBC Igbo aka, kwuru na nhọpụta ọhụrụ ahụ megidere nkwenye ha na nwaanyị ekwesịghị ịbụ onye ndu ụka nakwa ọjụjụ ụka Anglịkan jụrụ nwaanyị ilụ nwaanyị ibe ya bụ nke o kwuru Mullaby na-akwado.

Akwụkwọ mgbasaozi nke Ụka Anglịkan nke Naijiria

Ebe foto si, Church of Nigeria

Ọ sịrị,"Ịhọpụta Sarah Mullaby bụ ịkpọchi ntị na nkwenye nke ndị Anglịkan n'ụwa gbaa gburugburu nwere na Ụka 'Church of England' na Achịbishọpụ nke Canterbury abọghịzịkwa ndị ndu" ha.

Cheta na ụka Anglịkan na Naijiria kewepụrụ onwe ha na ụka nke Inglandị n'ọnwa Septemba afọ 2005 dịka isi mmiri ụka Anglikan mere Gene Robinson bụ ụkọchụkwụ na-edina nwoke ibe ya, Bishopụ diọcese Hampshire dị na Amerịka nke ha si gosipụtara na ụka ahu na-akwado nwoke ịlụ ibe ya.