'Inye Peter Obi ụbọchị agbamakwụkwọ anyị bụ naanị onyinye anyị nwereike inye ya'
Otu nwoke na otu nwaanyị mere agbamakwụkwọ n’ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Sepụtemba mere ihe tụrụ ọha n’anya dịka ha si emume agbamakwụkwọ ha ma ka yiri uwe ha ji gbaa akwụkwọ wụba n’etiti ọha na-eme ngagharị nkwado nye Peter Obi.

Ebe foto si, Blessing Adamson/Twitter
Maazị Desmond na nwaada Blessing Adamson akụchapụtla ọtụtụ kepu kepu nakwa akụkọ ndị pụtara na-ekwu na ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ha abụọ yii uwe agbamakwụkwọ ha sonye ngagharị nkwado Obi bụ nkonukọ nakwa nkata ndị ‘Obidents’ kpara iji kwalite akụkọ atụmatụ a.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
N’okwu ha, ha sị “Anyị bụ di na nwunye n’ezie, ihe anyị mere bụ echeche anyị chepụtara iji kwado Peter Obi n’ihi na anyị enweghị ego maọbụ ihe onyinye ọbụla iji kwado ya”

Ebe foto si, Blessing Adamson
Dịka ihe di na nwunye mere pụtara dịka nnukwu akụkọ na soshal midia, Peter Obi n'onwe ya zipụkwara ozi na Twitter iji kelee di na nwunye a maka etu ha siri pụta kwụnyere ya na ngagharị nkwado a e mere n’Abuja.

Ebe foto si, Blessing Adamson
Cheta na mmadụ abụọ ọzọ gbakwara akwụkwọ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktọba bụ ụbọchị ncheta nnwereonwe Naịjirịa mekwara otu ihe a dịka ha mechapụrụ agbakwụkwọ ha ma pụta sonye igwe ndị mmadụ na Benin City.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, Uchenna Nnanna
Etu ndị ọzọ si kwado Peter Obi
Puku kwuru puku ndị mmadụ gbakọtara ọnụ gosi nwado ha nye Peter Obi n’akụkụ Naịjirịa nakwa ụwa dị icheiche n’ụbọchị ahụ. Nke a gụnyere Kaduna, Zaria, Bauchi, Akwa Ibom, Aba, Benin, Ekiti, Asaba, Oshogbo, London, New York. Oji River n'Enugu Steeti nakwa ebe ndị ọzọ.
Obi kọwara na ihe ndị mmadụ mere n'ụbọchị ahụ nakwa etu ha siri pụta tụrụ ya n'anya dịka ọ gara n'ihu kwee nkwa ịgbara ha obidi n'ụzọ ziri ezi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2









