Ihe ụfọdụ merela kamgbe ndị ntorobịa malitere 'Peter Obi rally'

Peter obi rally

Ebe foto si, screen grab

Ụfọdụ ihe ịrịba ama emeela kamgbe ndị ntorobịa malitere ngagharị na mpaghara Naịjirịa dị icheiche iji kwadoo Labour Pati na onye na-azọ ọkwa Onyeisiala na pati ahụ bụ Peter Obi.

Ngagharị nkwado a emeela na steeti dị icheiche n'agbanyeghị na oge erubeghị kpọmkwem maka mmalite achụmnta vootu dịka ngalaba nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' si nye ntuziaka.

Akụkọ a bụ maka ihe ịtụnanya ụfọdụ merela kamgbe ngagharị ndị a malitere.

Di na nwunye yi uwe agbamakwụkwọ ha sonye

Peter Obi rally

Ebe foto si, Screen grab

Dịka ndị ntorobịa na-eme ngagharị nkwado maka PEter Obi n'Abuja, taa bụ Satọde, abalị iri abụọ na anọ nke Sepụtemba, otu di na nwunye gbara akwụkwọ ọhụrụ yi uwe agbamakwụkwọ ha sonyere ndị na-eme ngagharị.

Nke a butere nnọọ nnukwu akụkọ na soshal midia.

Peter Obi n'onwe ya zipụkwara ozi na Twitter iji kelee di na nwunye a.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Nwoke gbanyere enyi ya nwaanyị ọla

Na ngagharị nke ndị ntorobịa mere n'Ọnịcha, Anambra Steeti iji kwado Peter Obi, otu nwaokorobịa nọrọ ebe ahụ jụọ enyi ya nwaanyị sị "ị ga-alụ m?"

Ebe ahụ ka ọ nọrọ gbanye nwaagbọghọ ahụ ọla dịka ndị mmadụ gbara ha okirikiri na-akụrụ ha aka.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ndị uweoji ji anwụrụ ose chụsaa ndị mmadụ

Peter Obi rally Ebonyi

Ebe foto si, Twitter

N'ụbọchị 17 nke ọnwa Sepụtemba a, ndị uweojii n'Ebonyi steeti na ndị ntorobịa na-eme ngagharị iji kwado Peter Obi takọtara isi.

Nke a mere ka ndị uweojii were anwụrụ ose chụsaa ha.

Ndị uweojii kọwara na ndị a na-enme ngagharị erubeghị isi na ntuziaka e nyere ha ka ha nọdụ n'ime ama egwuregwu dị n'Abakiliki.

Kama ha pụtara jupụta n'okporo ụzọ, mee ka kpachikpachi ụzọ jide ndị na-emere onwe ha njem.

Mana ndị ntorobịa a mechara gbakọtakwa dịka ndị uweojii chụsachara ha ma malitekwa ngagharị ha.

Onye bụ Peter Obi

  • Ọ bụbu gọvanọ Anambra steeti afọ asatọ
  • Ọ bụbụ onyeisioche ngalaba 'Securities and Exchange Commission'
  • Ọ bụ onye oji ego achụ ego tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị
  • Ọ zọburu ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa na 2019 n'otu Peoples Democratic Party (PDP)
  • Ọ hapụrụ PDP banye Labour Pati n'ọnwa Mee afọ a

Mmalite achụmnta vootu maka ntuliaka 2023

Dịka Inec si hazie ntuliaka 2023, achụmnta vootu amalitebeghị kpọmkwem; ọ ga-amalite n'ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba 2022.

Ọ bụ malite n'oge a ka ndị na-azọ ọkwa dị icheiche ga-ebido ịgagharị n'onwe ha na-akọwara ndị mmadụ ebumnuche ha nakwa arịọ ka a tụnyere ha vootu.

Ka ọ dị ugbua, ha dị pati iri na asatọ, nke pụtara mmadụ iri na asatọ, ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị 2023.

Lee aha ndị niile ga-eso zọọ ya bụ ọkwa dịka Inec si depụta aha ha.

Ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa ga-adị n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.