Benin/Togo degree ban: Mmachi a nwere ike igbochi m ime NYSC- Nwaakwụkwọ na-agụ na Benin

Alberty Oluwatoyosi na`Akerele Olawale

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-agụ na mahadum Bene Repọblik atụọla arịrị na mmachi Gọọmentị Etiti machiri asambodo si mba ahụ ga-eme ha a sụọ ala ma akọghị ji.

Na nsonso a, Gọọmentị Etiti site na Ministrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ mara ọkwa mmachi ịnabata asambodo si mahadum dị na mba Bene nakwa Togo n'ihi ebubo akpụrụ akpụ asambodo.

Mana ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụghị nzọpụ ụkwụ ahụ ga-akwụsị nsogbu ndị mmadụ ịkpụ asambodo adịgboroja.

Ha kpọrọ oku ka gọọmentị mee nnyocha chọpụta mahadum na-ere asambodo kama ịta ndị aka ha dị ọcha ahụhụ.

Otu nwata akwụkwọ na-agụ 'Mass communication' na mahadum 'Estam University Benin Republic' bụ Alberty Oluwatoyosi gwara, BBC na gọọmentị kwesịrị ịchọpụta ndị aka ha dị n'ụdị ihe ahụ ma taa ha ahụhụ kwesịrị" kama ịmachi mahadum nile.

Ọ sịrị," O kwesịrị ka ụlọakwụkwọ nile tawa ahụhụ maka ndahie otu onye?"

Ọ gara n'ihu kwuo, "Ana m eche na o nwere ike imetụta ohere iji ife ala fee ala nna m na inweta ọrụ."

Ụmụakwụkwọ mahadum

Ebe foto si, Getty Images

Nwata akwụkwọ na-agụ Theatre Arts na mahadum dị na Bene bụ Olawale Akerele sịrị na "ọ bụ ihe mwute n'ihi na ọ pụtara na agbnyeghị mbọ nile m gbara n'ịgụ akwụkwọ, ihe nile a ga-ala n'iyi n'ihi na o nwere ike imetụta iji otu afọ efe ala nna."

Olawale , onye gọtara mahadum ya, "Enwere m ntuwasị obi na mahadum m na-agụ," kwuru na mmachi ahụ ebuterela ya "oke echichi."

" O butela gbagharịa nye ụmụakwụkwọ si Naijiria nọ Bene."

"Ọ gara aka mma ma ọbụrụ na Gọọmentị bu ụzọ mee nnyocha chọpụta mahadum ndị na-akpa ụdị agwa ahụ."

Gọọmentị Etiti amachiela asambodo mahadum Benin, Togo

Gọọmentị Naịjirịa machiri asambodo si na mahadum Bene Repọblịk.

N'ozi nke ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ ụbọchị nke abụọ n’ọnwa Januarị nke afọ 2024 nke ọnụ na-ekwuru Minịstrị ahụ bụ Augustina Obilor-Duru, binyere aka ma wepụtara n’ụbọchị Tuzde,mmachi ahụ iji nye ohere maka nnyocha pụrụ iche.

Nnyocha ahụ so akụkọ ụlọọrụ akụkọ ‘Daily Nigerian Newspaper’ dere n’ụbọchị 30 nke ọnwa Disemba afo 2023, nke boro ebubo n na ndị mmadu ji ego azụta asambodo mahadum na mahadum na mba abụọ ahụ.

Akụkọ ahụ kwuru na nke ha na-enweta n’ime ịzụka isii asambodo e kwesiri inweta na agụmakwukwọ afọ anọ.

Akụkọ ahụ kọwara etu ụmụakwụkwọ si eji ya bụ asambodo adịgboroja abata Naịjirịa ma sonye na ndị ji otu afọ efe ala nna ha.

O kwuru na ufodu ndi Naịjirịa ji asambodo adịgboroja ahụ enweta ezigbo ọrụ ha na kwesighị inweta na Naịjirịa.

Kedu mgbe ya bụ ịwu ga-amalite ịdị ire?

Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na Naịjirịa kwuru na iwu ahụ ga-amalite n' ụbọchị nke abụọ n’ọnwa Janụwarị nke afọ 2024 dịwa ire.

"Ministrị ahụ sịrị,"Ministrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ malite n'abalị abụọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2024 ga- na ngalaba ndị uweojii nzuzo na ngalaba na-ahụ maka iji otu afọ efe ala nna."akwụsịtụ ilele maọbụ ịnabata asambodo mahadum si Bene na Togo ganye mpụtara nnyocha na-aga n'ihu n'etiti Ministrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ na mba abụọ ndị a."

" Mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba abụọ

Ha gwara ndị Naijirịa ka ha nyere aka ihụ na ya atụmatụ ga-abụ ihe gara nke ọma,site na ịgbaara ha ama onye ọbula ji usoro ụgha ma ọ bu asambodo adịgboroja arụ ọrụ.