Celebrity deaths: Oke osisi ndị dara na Naịjirịa n’afo 2023

Ebe foto si, Rotimi Akeredolu/Mohbad/Screengrab
Ọtụtụ ndị isi okpokpo nwụrụ na Naịjirịa n’afo 2023. Anyi mere nchọcha bayere nke a ma chọpụta aha ha dum nakwa mgbe ha nwụru.
Lee ha nga a.
Saint Obi

Ebe foto si, Saint Obi/Facebook
Otu n’ime ha bụ Obinna Nwafor ama dịka Saint Obi, na-eme ihe ejije ‘Nollywood’.
A mụrụ Saint Obi n’ụbọchị 16 nke onwa Novemba n’afo 1965, ọ nwụọ na 7 Mai n’afo 2023, Obi ọrịara ọrịa tupu onwnụ.

Ebe foto si, Ezeife/Okere/Obi/ Facebook/Instagram
Don Brymo

Ebe foto si, Don Brymo/Instagram
Onye nke abụọ bụ Don Brymo onye na-eme ejije ‘Nollywood’. A murụ Brymo na 26 Novemba 1966, ọnwaamadi a nwụrụ n’ụbọchị 15 nke ọnwa Juun 2023.
Brymo bụ onye Enugwu-ukwu dị n’Anambra steeti, akụkọ kwuru na onye ejije Nollywood a si n’ụra ba n’ọnwụ ya.
Cynthia Okereke

Ebe foto si, Cynthia Okereke/Instagram
Onye ọzọ bụ Cynthia Okereke. Cynthia bụ onye na-eme ihe Ejije Nollywood a mụrụ n’ụbọchị 20 nke ọnwa Epril, afọ 1960. Ọ nwụrụ na 11 Julaị, afọ 2023.
Cheta na atọọrọ Cynthia n’afọ 2022. Akụkọ kwuru na ọ bụ obi nkolopu nwada a bidoro nwenwe ka atọhapụrụ ya kpatara ọnwụ ya.
Morphy Afolabi

Ebe foto si, Morphy Afolabi/Instagram
Ọzọ dịka ibe ya bụ Morphy Afolabi. Morphy bụ onye na-eme ejije Nollywood, dịka akụkọ siri kwuo, ọ nwụrụ ka ọ dara ada n'ebe a na-asa arụ.
A mụrụ ya n'ubọchị 5 nke ọnwa Mee, afọ 1974, ọ nwụọ na 14 Mee, afọ 2023.
Chukwuemeka Ezeife

Ebe foto si, Chukwuemeka Ezeife/Facebook
End of Mkparịtaụka BBC Igbo na Chukwuemeka Ezeife aka chibụrụ Anambra steeti
Onye ọzọ amaama nwụrụ n'afọ a bụ aka chịburu Anambra Steeti bụ Chukwuemeka Ezeife. Ezeife chịrị Anambra n’afọ 1992 ruọ Nọvemba 1993 n'oge onye agha chịrị Naịjirịa n'oge ahụ bụ Ibrahim Badamosi Babangida nwara inyefe ọchịchị site n'ọchịchị ndị agha nye ọchịchị onyekwuoucheya nke Babangida onwe ya mechara kagbuo n'afọ 1993.
A mụru Ezeife n’ụbọchị 20 Nọvemba, afọ 1937 n'obodo Igboukwu dị n’Anambra Steeti. Ọ nwụrụ na 14 Disemba 2023.
Ilerioluwa Oladimeji Aloba (Mohbad)

Ebe foto si, Mohbad/Instagram
End of Ihe onyoonyo ebe nna Mohbad bụ Aloba Oluwabanowo kwuru maka ọnwụ nwa ya
Ọzọ dịka ibe ya bu otiegwu aha ya bụ Ilerioluwa Oladimeji Aloba eji ‘Mohbad’ mara. A mụru Mohbad n’afọ 1996 na Legọs, ọ nwụọ na 12 Septemba, 2023.
Akụkọ kwuru n'afọ 1996, nakwa na papa ya bụ onye zulitere ya, dịka o si kwuo na mkparịtaụka ya na BBC nwere.
Mohbad nwetara ihe nrite maka egwu ya ụfọdụ.
Ọ mụrụ otu nwa tupu ọ nwụọ.
Oluwarotimi Akeredolu

Ebe foto si, Twitter@RotimiAkeredolu
End of Etu mụ na di m hụrụ onwe anyị - Betty Akeredolu
Onye ọzo nwụrụ n'afọ 2023 bụ Gọvanọ Ondo Steeti bụ Oluwarotimi Akeredolu. Akeredolu malitere ịchị Ondo Steeti n’ọnwa Febụwarị, afọ 2017 ruo mgbe ọ nwụrụ na 27 Disemba, afọ 2023 na mba Legọs.
Akeredolu bụbu Attorney General nke Ondo Steeti site 1997 ruo 1999. N'afọ 1998, ọ bụrụla Senior Advocate of Nigeria - SAN. Ọ bụbụ Onyeisioche ndị Legal Aid Council site n'afọ 2005–2006.
Ọ lụrụ Betty Akeredolu n'afọ 1981. Ha mụrụ ụmụ anọ, ụmụnwaanyị abụọ, ụmụnwoke abụọ.
Ọ nwụrụ ka ọ gbachara afọ 67 site n'ọrịa kansa.
Ghali Umar Na'Abba

Ebe foto si, Ghali Umar Na’Abba/Facebook
Ghali Umar Na’Abba bụbu onyeisi oche ụlọ nnọchiteanya Naịjirịa n’afọ 1999 rụọ 2003.
Umar bụ onye otu ndọrọndọrọ ọchichị PDP, a mụrụ ya n’afọ 1958, ọ nwụọ na 27 Disemba, afọ 2023 n’Abuja.
Hon Ghali Na'Abba, dị afọ 65. A mụrụ ya na Kano.
Na'Abba bubụ onye mbụ a họpụtara banye Ụlọomeiwu nke mpaghara Kano Municipal Federal Constituency n'afọ 1999.
Taiwo Daniel Odukoya

Ebe foto si, Taiwo Odukoya/Facebook
Onye ọzọ ama ama nwụrụ n’afọ a bụ Ụkọchukwu Taiwo Daniel Odukoya. Taiwo bụ nnukwu ụkọchukwu ‘’The Fountain of Life church’’ dị na Ilupeju Legọs Steeti, bụrụkwa di ụkọ Chukwu Bimbo Odukoya nwụrụ n’ihe mberede ụgbọelu Sosoliso nke mere n'afọ 2005.
Taiwo Odukoya liri nwunye ya nke abụọ bụ Ụkọchukwu Nomthi Odukoya, ọ lụrụ n'afọ 2010 ka ụkọchukwu Bimbo Odukọya nwụrụ, Nomthi rịrịa ọrịa akpụ kansa nke ara tupu ọ nwụọ n'afọ 2021.
A mụru ya n'ọnwa Juun 1956, ọ nwụọ n'Ọgọst, 2023.
Chinwoke Mbadinuju

Ebe foto si, Screengrab
End of Ihe ndị kwesịrị ịma maka aka chịbụrụ Anambra steeti
Chinwoke Mbadinuju bụ aka chịrị Anambra steeti nwụrụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Eprelu afọ 2023.
Ezinaụlọ ya bụ ndị wepụtara ozi ọnwụ ya kwuru na ọ rịachara ọrịa obere oge tupu ọ nwụọ n'ụlọogwụ dị n'Abuja.
E liri Mbadinuju n'ọnwa Nọvemba afọ 2023 n'emume ebe ndị Gọvanọ gụnyere Chukwuma Soludo, Willie Obiano nakwa Peter Obi bịara ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ.









