Mmekọrịta mụ na nwa Mohbad dịka nke nwanne na nwanne - Nna Mohbad

Aha onyonyo, Mohbad nwa m bụ nwata nwere umeala ma na-erubeisi - Nna Mohbad
Mmekọrịta mụ na nwa Mohbad dịka nke nwanne na nwanne - Nna Mohbad

Aloba Joseph Oluwabanowo bụ nna oti egwu a ma ama nwụrụ anwụ bụ Mohbad akọwaala ụdịrị mmadụ nwa ya bụ nakwa etu ha si enwe mmerikọta dị nna na nwa.

Na mkparịtaụka ya na BBC Pidgin nwere n’izuụka ole ma ole nwa Mohbad nwụchara, Maazị Aloba kwuru na nwa ya bụ nwata nwere omeala na nrubeisi.

“Mohbad bụ nwata dị umeala na-anaghị ekwu ọtụtụ okwu, ihe ọbụla i nyere ya na ezuru ya.”

O kwuru na mmekọrịta ya na Mohbad abụghị naanị nke nna na nwa kama ọ bụ mmekọrịta enyi na enyi ya.

“Ọ bụ enyi m, ihe ọbụla m na-eme ọ na-achọ iso m eme ya, mmekọrịta mụ na ya dịka nke nwanne na ihe ya.

Mohbad na Nna ya Aloba

Ebe foto si, BBC/Mohbad Instagram

Maazị Aloba gara n’ihu kwuo na egwu Mohbad na-eti bụ onyinye si n’aka ya fee nwa ya.

O kwuru na oge ụfọdụ na ọ na-eso ya eti egwu dịka onye na-ete egwu maọbụ ikwere ya ukwe.

O kwuru na nwa ya Mohbad na-eso ya arụ ọrụ dịka onye na-arụ ọrụ aka n’ịrụ oche nakwa ihe ndị ọzọ a kpọro ‘carpenter’.

Maazị Aloba kọwara etu o siri bite ego iji hụụ na o tinyere Mohbad n’ụlọakwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ ha gabigara n’ezinaụlọ.

Ọ kpọkuru gọọmentị na ọha na eze ka e mee nyocha banyere etu nwa Mohbad si nwụọ.

Kirie ihe o kwuru n’uju;