Happy New Year: Ihe ndi mmadụ na-atụ anya n'afọ ọhụrụ a

Ọnọdụ akụnaụba obodo Naịjirịa ka na-eme kwapụ kwapụ dịka ihe jisike arị elu kwa ụbọchị.
BBC Igbo jekwuru ụfọdụ mmadụ ịjụ ha ihe bụ olileanya ha n'afọ ọhụru abanyere.
Ụfọdụ chọrọ ihe n'aka gọọmentị, dịka ibelata ụgwọ mmanụ ụgbọala, ịrụ ụzọ na iwulite ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.
Ebe ndị ọzọ na-ele anya ikwalite ihe nke ọnwe ha.
Lee ihe ha gwara anyị n'uju.






