Njem Nwaeze Harry,Meghan nwunye ya meere na Naijiria

Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan

Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan wuchiri Naijiria maka emume metụtara egwuregwu -Invictus Games,' -asọmpi egwuregwu maka ndịagha merụrụ ahụ nke Nwaeze Harry hiwere afọ iri gara aga.

Nwaeze Harry malitere njem ya n'Abuja bụ ebe o zutere ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ 'Lightway Academy' bụ ndị ọ gwara okwu maka ọnọdụ ahụike ụburu.

Dịka onye ntaakụkọ BBC bụ Simi Jolaoso si kwuo, Nwaeze Harry gwara ụmụaka ahụ ka ha na-ekwupụta ma ha nwee nsogbu ahụike ụbụrụ, sị ha na ọ bụ nsogbu na-emetụta onye ọbụla n' ụwa.

"Ọ bụrụ na ị hụ enyi gị, hụ na ihu atọghị ya ọchị? Ị ga-ajụ ya ihe na-eme ya ka ọ bụ na ị gaghị ajụ ya?"

Nwaeze Harry na Meghan nwunye ya

"Ị na-ekwu maka ya, a na-emeri ya."

"Ọ dị mma ikwu na ị dịghị mma."

"O nweghị ihe ọjọọ dị n'ikwu na ụbọchị gị agaghị nke ọma."

Dịka o kwuchara okwu, nwunye bụ Meghan gwara ụmụaka ahụ na-ege ntị sị, " Ụnụ ahụla ihe mere m jiri lụọ ya?"

"Ụbụrụ ya na-acha ọkụ."

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post

Ha gara asọmpi ndịagha merụrụ ahụ

Nwaeze Harry na Meghan ,nwunye ya

Nwaeze Harry na Nwunye ya gakwara ebe asọmpi Vollyeball ebe ya na ndịagha merụụ agụ soro sọọ mpi egwuregwu volleyball.

Nwaaeze Harry na ndịagha merụrụ ahụ

Njem Nwaeze Harry, Meghan awụchiela na Naijiria

Nwaeze Harry na Meghan nwunye ya

'Duke' na 'Duchess' nke Sussex bụ Nwaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan awuchiela na Naijiria

Ha rutere isi ụlọọrụ nchekwa ndịagha Naijiria dị n' Abuja n'ehihe Tọzde.

Ndịisi agha kwuru na ọbịbịa ha metụtara ndịagha merụrụ ahụ na ndị ezinaụlọ ha.

Ndị nwunye ndịagha

Ọbịbịa ha Naịjirịa sochiri ọkpụkpọ oku nke ndị isi agha kpọrọ ha banyere nsonye Naịjirịa n’egwuregwu ‘Invictus Games’ afọ 2023, nke e mere na Düsseldorf, Germany.

Egwuregwu ‘Invictus Games’ bụ nke Prince Harry bidoro n’afọ 2014 maka ịkwado ndịagha merụrụ ahụ iji nye ha ọgwụgwọ.

Akụkọ sitere n’isiụlọọrụ nchekwa nke Air Vice Marshal Abidemi Marquis binyere aka na ya kwuru na pasentị 80 ndịagha Naịjiria bụ ndị nwere ihe mmeru ahụ dị iche iche ma na-anara ọgwụgwọ.

A na-atụ anya na ọbịbịa Prince Harry ga-enyere aka guzobe ogige ‘Egwuregwu Invictus Games’ n’Abuja ma nwere maka ịghazi egwuregwu ‘Invictus Games’ na Naịjirịa n’oge na-adighị anya.