Lee ihe ndị Igbo abụọ a kwuru maka ihe ha chọpụtara maka Ezenwaanyị Elizabeth II
Dịka Ezenwaanyị Elizabeth II nwụrụ n'ehihe ụbọchi tọzde n'ụlọ ya akpọrọ Scottish, ebe ọ nọ ezu ike Sụma.
Ọtụtụ ndị mmadụ kwpuputara uju ha ebe ndị ọzọ nwere ihe dị iche iche ha na-ekwu maka etu o siri bie ndụ ya.
Eliri ya n'ụbọchị 19 bụ Mọnde nke ọnwa Sepụtemba afọ 2022 a.
Ndị Naịjirịa nke gụnyere ndị bi si n'ọwụwa anyanwụ tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
Onye bụbụ odeakwụkwọ ukwu nke otu mba Common Wealth bụ Chukwuemeka Anyoku na onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Mbazulike Amaechi kwuru ihe ha chọpụtara mgbe ha na Ezenwaanyị nwere zutere.

Ihe Ị kwesịrị ịma maka Ezenwaanyị Elizabeth II
A mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth Alexandra Mary Windsor, na Mayfair, London n'ụbọchị 21 nke ọnwa Epreelụ afọ 1926.
Enweghị ndị tụrụanya na ọ ga-emecha bụrụ eze, mana n'ọnwa Disemba afọ 1936, nwanne nna ya bụ Edward nke asatọ, gbaghapụrụ oche eze ya ka o nwee ike ịlụ Wallis Simpson bụ nwaada onye mba Amerịka lụrụla di ma gbaa alụkwaghịm ugboro abụọ.
Nna Elizabeth bịara bụrụ Eze George nke isii, oge ọ dị afọ 10, Lilibeth, bụ aha e ji mara ya n'ezinaụlọ ya, bịara bụrụ onye nketa oche eze ga-anọchi eze.N'ime afọ atọ nke a mechara, Briten na Nazi Germany abanye agha.
Elizabeth na nwanne ya nwaanyị nke ọ tọrọ bụ Adaeze Margaret, nọrọ ọtụtụ oge agha ahụ n'ụlọ Windsor Castle dịka nne na nna ha jụrụ ịnabata atụmatụ e nyere ka a kpọga ha mba Canada.










