Ezenwaanyị Elizabeth II anwụọla

Ezenwaanyị Elizabeth
Nkọwa foto, Ọ gbara afọ iri itoolu na isii

Ezenwaanyị Elizabeth II nke mba Briten kachasị nọ n'ocheze anwụọla na Balmoral dịka ọ gbachara afọ 96. Ọ nọrọ n'oche eze afọ 70.

Ọ nwụrụ n'ehihe ụbọchi tọzde n'ụlọ ya akpọrọ Scottish, ebe ọ nọ ezu ike Sụma.

Ezenwaanyị malitere ọchịchị n'afọ 1952, ma nọrọkwa ndụ hụ ka ọtụtụ mgbanwe batara.

Ugbua ọ nwụrụla, nwa ya nwoke bụ Charles, bụbụ Nwa Eze nke Wales, ga-edu mba Briten niile n'iru uju, dịka Eze ọhụrụ nakwa onyeisiala nke mba iri na anọ dị na Commonwealth.

Otu akwụkwọ ozi si n'obi eze Buckingahm kwuru sị: "Ezenwaanyị nwụrụ n'udo na Balmoral n'ehihie a."

"Eze na ndị na-eso Ezenwaanyị ga-anọ na Balmoral na mgbede a tupu ha alọghachi na London echi."

Ụmụ Ezenwaanyị niile gara na Balmoral, nke dị nso n'Aberdeen, dịka ndị dọkịta kwuchara na ha na-agbado anya maka ahụike ya.

Nwa nwa ya bụ Prince William, nọkwa ebe ahụ, mana nwanne ya bụ Prince Harry nọ n'ụzọ na-abịa.

Ndị ọrụị Obi Eze Buckinghamna-edowe ọkwa ọnwụ Eze Nwaanyị n'ilo

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ozi e dere sị "Ezenwaanyị nwụrụ n'udo na Balmoral n'ehihie a. Eze na ezenwaanyị ga-anọ na Balmoral n'abalị a, ha ga-agaghị alaghachị London echi."

Praịm Minista Liz Truss, bụ onye Ezenwaanyị ka were n'ọrụ n'ụbọchị Tuzde, kwuru na Ezenwaanyị bụ okwute nke a rụkwasịrị ihe bụ Briten nke ọgbara ọhụrụ, nke "nyere anyị nkwụdosi ike na ikike kwesịrị anyị".

Ka ọ na-ekwu maka Eze ọhụrụ, o kwuru sị: "Anyị na-enye ya nkwanye ugwu na nsọpụrụ anyị, dịka nne ya nyere anyị ọtụtụ ya, ogologo oge.

"Site na ngafe oge Elizabeth a, anyị na-akpọbata ofe ọhụrụ n'ọmarịcha akụkọ ala anyị, dịka ọ gaara esi masị Ezenwaanyị, site n'ikwu okwu a 'Chukwu zọọ Eze'."

Ọchịchị Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ dịka onyeisiala nọrọ site n'oge nnapụ onwe nke agha butere, site n'oge alaeze ruo oge Commonwealth, ruo n'oge Agha Nzuzo (Cold War) biri nakwa mgbe UK banyere n'ime ma si na nkwekọrịta European Union pụta.

Praịm Minista 15 chịrị n'oge ọchịchị ya; malite na Winston Churchill a mụrụ n'afọ 1874 ma gụnyekwa Truss a mụrụ ka afọ 101 gachara, n'afọ 1975.

Ya na ndị praịm minista ya zutere kwa izu ọbụle mgbe ọ na-achị.

N'obieze Buckingham Palace dị na London, igwe mmadụ nukọrọ na-eche ịnụ ozi gbasara ọnọdụ ahụike Ezenwaanyị malitere ibe akwa arịrị dịka ha nụrụ maka ọnwụ ya.

E wedatara ọkọlọtọ Union Jack dị n'elu obieze ka o fewe n'ọkara dịka o ji nkeji atọ gafee elekere isii nke mgbede n'oge ndị Briten, dịka e tinyere ozi ọkwa ọnwụ ya n'ezi.

Ka Ezenwaanyị nwụrụ ka Ọkparaeze William na Catherine nwunye ya jiri bụrụ 'Duke' na 'Duchess' nke 'Cambridge' na 'Cornwall'.

Iji cheta afọ iri asatọ ha lụrụla onwe ha n'ụbọchị 20 Novemba 2007, Ezenwaanyị na Ọparaeze Phillip gara njem nlegharị anya ebe ha gara ka ha lụchara onwe ha n'afọ Novemba 1947, afọ iri isii ebe ha rahụrụ n'abalị ha lụrụ onwe ha.

Ebe foto si, Tim Graham/PA

Nkọwa foto, Duke ndị Edinburgh kwụ n'akụkụ Ezenwaanyị karịa afọ iri isii mere ya onyeenyemaka nọterela aka na ntọala Briten

A mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth Alexandra Mary Windsor, na Mayfair, London n'ụbọchị 21 nke ọnwa Epreelụ afọ 1926.

Opekatampe mmadụ bụ ndị gaara ahụ ọhụ na ọ ga-emecha bụrụ eze, mana n'ọnwa Disemba afọ 1936, nwanne nna ya bụ Edward nke asatọ, gbaghapụrụ oche eze ya ka o nwee ike ịlụ Wallis Simpson bụ nwaada onye mba Amerịka lụrụla di ma gbaa alụkwaghịm ugboro abụọ.

Nna Elizabeth bịara bụrụ Eze George nke isii, oge ọ dị afọ 10, Lilibeth, bụ aha e ji mara ya n'ezinaụlọ ya, bịara bụrụ onye nketa oche eze ga-anọchi eze.

N'ime afọ atọ nke a mechara, Briten na Nazi Germany abanye agha.

Elizabeth na nwanne ya nwaanyị nke ọ tọrọ bụ Adaeze Margaret, nọrọ ọtụtụ oge agha ahụ n'ụlọ Windsor Castle dịka nne na nna ha jụrụ ịnabata atụmatụ e nyere ka a kpọga ha mba Canada.

Crowds outside Buckingham Palace on Thursday, after the death was announced

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ọtụtụ agbalkọọtara n'ezi Obi Eze na Buckingham na-eche ka e kwupụtara na ọ nwụọla

Ka ọ gbara afọ 18, Elizabeth nọrọ ọnwa ise n'ebe Bekee kpọrọ Auxiliary Territorial Service, ebe ọ nọ mụta etu e si arụzi ụgbọala nakwa etu e si akwọ ụgbọala.

"Amalitere m ịmụta mmụọ onye aghala nwanne ya nke na-amụbanye mgbe nsogbu chere mmadụ ihu," ka o mechara kwuo.

Ka agha na-ada, ya na nwanne nne ya nke atọ bụ Philip, Ọkparaeze nke Greece, so ndị agha mmiri nke ndị eze arụ ọrụ malitere ikekọrịta akwụkwọ ozi.

Ịhụnanya ha bịara mụbawanye, mere ka ha lụọ dịka di na nwunye n'ụlọụka Westminster Abbey, n'ụbọchị 20 nke Nọvemba afọ 1947, dịka Ọkparaeze natara ochichi Duke nke Edinburgh.

O mechara kọwaa Ọkparaeze Philip dịka "ike m na ebe obi idere duu m" n'ime afọ 74 ha nọ n'ime alụmdinanwunye, tupu ọ nwụọ n'afọ 2021, ka ọ dị afọ 99.

Charles delivered the Queen's speech on behalf of his mother for the first time in May

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Charles, dịka eze Ọparaeze nke Wales, kpọpụtara edemede Ezenwaanyị mgbe ọ nọchịrị nne ya mgbe m,bụ n'ọnwa Mee

Nwaeze Charles bụ Ọpara ma bụru nwa mbụ amụrụ n'afọ 1948, nwanne ya nwaanyị bụ Adaeze Anee sotere ya n'afọ 1950, ebe nwaeze Andrew sotere Anne n'afọ 1960, nwaeze Edward bụ nwa ikpeazu sotere Andrew n'afọ 1964.

Ha niile mụtara nne na nna ha ụmụ asatọ ndi nke mụtara ụmụ ụmụ iri na abụọ.

Adaeze Elizabeth nọ njem nleta ebe ọ nọchitere anya nna ya bụ Eze Philip mgbe ọ natara ozi na nna ya onye ahụ adịghị anwụola. Ọ hapụrụ ihe niile ọ na-eme gbara lọghachi mba Briten ebe e mere ya Eze Nwaanyị.

Dịka o siri kwuo, " Ya bụ ihe bịara na-atụghianya kama ịkwesịrị ịhụ na ị mere ihe atụru n'anya ebe ịno nke ọma".

The Duke and Duchess of York with their eldest baby daughter Princess Elizabeth at her christening

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, A mụrụ Ezenwaanyị Elizabeth Alexandra Mary Windsor na Mayfair, London, n'ụbọchị Epreel 1 1926, ya bụ nwa nkwe mbụ Duke na Duchess mke York

Elizabeth dị afọ iri abuọ na asaa mgbe e chiri ya Eze Nwaanyị na Westminster Abbey n'ụbochi abụọ nke ọnwa Jun afọ 1953.

Ihe ruru mmadụ nde iri abụọ lere ya bụ echichi n'ihe onyonyo.

N'ime afo olemaole gara nụ, ọchichị mba Briten na mba ndọ ọzọ biri ebe oge eji 'Singing 60s' cheere ụfodụ ntụala mba Briten aja mgba.

Elizabeth gbanyere ụfodu omenala ndi Eze mba Briten dịka ọ gbalịrị hụ na ya na ndị obodo na-enwe mmekọ, ọ na-aga dịka ọbịa eleta ndị mmadụ ma na-apụta kwa na-eso n'ụfọdu mmemme.

Mmasị ya ebe mba ndị Briten chịbụru nke bụ Common Wealth gosikwara dịka o gbalịrị gaa leta chaa ha niile ọ bụrụ godi naani otu mgbe.

Kama enwere ụfodu ihe mmekpa ahụ nke mere n'ime ụlo na nke ụwa niile ma maka ya.

ọN'afọ 1992, nke eji "Annus Horriblilis" mara , nke pụtara afọ ọdachi dịka ọkụ gbara Obi Eze nke Windsor bụ ebe obibi na ụlọọrụ Obi Eze ọzọ kwa abụrụ na alụmdịnanwunye ụmụ ya atọ gbasara n'otu afọ 1992.

Dịka Adaeze Diana nwụru n'ihe mberede okporoụzo n'afọ 1997, ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ma gosi iwe ha dịka ha siri chee na Eze Nwaanyi Elizabeth aputaghị n'ihu ọha kwuo okwu maka ọnwụ Diana.

Ụfọdu na-ajụkwa ajụjọ na e nwere uru Eze na ezinulọ baara ndị mmadụ n'oge agba ọhụru a.

Ọ zara sị, " Ngalaba ọbụla ehiwere kwesiri ibu n'obi na ndị na-akwado ha ga-ajụ ha ajuju ma nyocha ihe ha na-eme, ya fọduzịa ndị na anaghị akwado ha".

Camilla, Duchess of Cornwall, Prince Charles, Prince of Wales, Queen Elizabeth II, Prince George of Cambridge, Prince William, Duke of Cambridge, Princess Charlotte of Cambridge, Duchess of Cambridge and Prince Louis of Cambridge on the balcony during the Platinum Jubilee Pageant on June 05, 2022 in London, England

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na emume afọ iri asatọ ya n'oche Eze, Eze nwaanyị mere ọha obi aṅụrị ka ya na ezinụlọ ya si wee pụta kele ya

Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu ka Ezenwaanyị Elizabeth kpebiri ịrụ ọru ma rụọ ya nke ọma.

Dịka a na-eme emume ncheta nke afọ iri na ise ya ka Elizabeth tụlara uche azụ n'okwu o kwuru were sị, "Agbanyeghị na m kwuru okwu a mgbe m ka bụ nwata na-asa ahụ n'afọ n'afo, enweghị ihe m ga-ewepụ na ya, a ka m kwuzosiri ike n'ihe m kwuru".

Prince Harry arriving at Balmoral

Ebe foto si, Rex Features

Nkọwa foto, Ọparaeze Harry ka ọ wuchịrị na Balmoral iso ndị ezinụlọ Eze ndị ọzọ

Ekizabeth gosiri na ya kwụsi ike n'ihe o kwuru ma gosikwa ya n'akwukwọ ozi ozipụtara n'emume ncheta afọ iri asaa e mere n'ọnwa Juun.

Eji emume pụruiche nke eji mara omenala ndi mba Briten ya na ihe mmemme ndi mba a pụtara jiri obi ụto mee n'okporoụzọ ha niile.

Agbanyeghi na ọnodụ ahụike Ezenwaanyị Elizabeth ekweghị ya soro n'ihe ncheta na mmemme ndị a niile kama o ziri mmadu niile ozi were si, "Obi m na ihụnanya m nọ n'ebe unu nọ oge niile"

Prince Andrew and Prince Edward arrive at Balmoral

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị William nyara ndị ezinaụlọ okenye - gụnyere Ọparaeze Andrew nakwa ọparaeze Edward - ga Balmoral

Eze Charles onye dị afọ iri asaa na atọ abụrụla onyeisiala mba iri na anọ ndị mejupụtara Commonwealth.

Ya na nwunye ya bụ Camilla na ụmụnne ya Nwaeze Anna na ọpara eze Andrew na Edward nọ na Balmoral ugbua.

Nwunye Edward bụ Sophie, na ụmụeze Wiliam na Harry nọnyekwara ha ebe ahụ.

Nwunye William bụ Catherine na ụmụ ha nọ na Windsor dịka ụmụ ha bụ George, Charlotte na Louis ga-ebido akwụkwọ nm'ụlo akwụkwọ ọhụrụ.

Ezinụlọ Eze abanyela n'iriuju ugbua.

Akagbuola emume niile ma agaghị efeli ọkọlọtọ mba Briten bụ Union Jack elu n'ụlọ ndị niile bụ ndị ezinụlọ Eze na ebe niile ndị agha mba Briten nọ.

Ọtụtụ ndị ọchịchị mba ọzọ zitere Briten ozi iti aka n'obi dịka onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden na-ekwu na ọ chetara mgbe mba Amerịka nọ na nsogbu dịka awakporo ha nke eji 9/11 mara.

Ebe onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel MAcron na-echeta ya dịka, " Eze nwaanyị nwere obi ọma" na "Ezigbo enyi mba Fransị".

Ebe onyeisiala mba Kanada bụ JUstin Trudeau na ekwu na Eze Nwaanyị bụ onye ndị mba Kanada ma nke ọma ma bụrụkwa " Onye kacha masị ya na mba ụwa niile".