Queen Elizabeth's health: Ezenwaanyị Elizabeth nọ ọfụma na-ezu ike

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị mba Briten nọ ebe ndị dọkịta ya na-elekọta ya ugbua n'obieze dị na Balmoral dịka ha na-echekasị maka ahụike ya.
N'ozi ụlọọrụ ya bụ 'Buckingham Palace wepụtara ha sị na "Dịka enyochachara ya ahụ taa, ndị dọkịta Ezenwaanyị nwere nchekasị ebe ahụike ya nọ ma kwuo ka elekọtakwa ya ọfụma".
Mana ugbua ekwuputakwara na ọ nọ ọfụma na-ezu ike.
Nwa mbụ ya bụ Nwaeze Charles agaala Balmoral bụ ebe ahụ ọ nọ
Ozi a na-abịa dịka Ezenwaanyị pụrụ na nzụkọ pụrụiche nke 'Privy Council' n'ụbọchị Wenzde dịka ndị dọkịta ya sị ya zuo ike.
Cheta na ọ nabatara Mary Liz Truss dịka Praịm Minista ọhụrụ mba Briten n'ụbọchị Tuusde.
Truss n'onwe ya kwuru na ndị mba ahụ niile na-echekasị maka ozi ahụike Ezenwaanyị.
Ọ sị "echiche m nakwa echiche mmadụ niile n'ala anyị na-agara Ezenwaanyị na ezinaụlọ ya n'oge awa a"
Onyeisi ụlọụka Anglịkan bụ Justin Welby kwuru na "ekpere m na ekpere ndị niile n'ụlọụka Church of England nakwa ala a nọ ebe Ezenwaanyị anyị nọ ugbua".
Ụmụ Ezenwaanyị niile agaala na Balmoral ahụ ịnọ ya nso.
Otu ụgbọelu bu Nwaeze William bụ nwanwa ya, Nwaeze Andrew nakwa Nwaeze Edward adatuola n'Aberdeen na mba Scotland.
Ha ga-esi ebe ahụ gawa Obieze Balmoral bụ ebe Ezenwaanyị nọ na-ezu ike.
Adaeze Anne so na ndị nọ n'Obieze Balmoral n'akụkụ nne ya bụ Ezenwaanyị Elizabeth.
Ndị nche nọzị na mpụta Obieze Balmoral bụ ebe Ezenwaanyị na-agakarị izu ike kemgbe ụwa.








