Ezenwaanyị Elizabeth nke mba Briten ebutela ọrịa Covid-19

Ezenwaanyị mba Briten

Ebe foto si, Getty Images

Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ ebutela ọrịa covid-19.

Obi eze 'Buckingham Palace' nke mba Briten gbara ama a n'ụbọchị Sọnde

N'akwụkwọ ozi ha bipụtara, ha kwuru na Ezenwaanyị Elizabeth nwere naanị obere azụzụ ugbua.

Ha kwukwara na nke a agaghi egbochi ya ịrụ nwa obere ọrụ dịrị ya na mpaghara Windsor n'izu a na-abịa abịa.

Ozi ndị ọrụ mgbasaozi Obi Ezenwaayị zipụtara kwuru: "Ọ ga-aga n'ihu na-anata ọgwụgwọ dịka anyị ga-eso usoro ahụike kacha mma."

Ezenwaanyị onye dị afọ 95 na diọkpara ya bụ Charles zụkọrọ na izu gara aga tupu achọpụta na Charles butere ọrịa Covid-19.

Nke a na-abịa dịka n'izu olemole gara aga e mere emume ikwanyere Ezenwaanyị ugwu dịka onye kacha nọtee aka n'oche ọchịchị ahụ.

Emume a e mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Febụwarị kwupụtara na ọchịala dịka Ezenwaanyị ruo afọ 70.

Abalị foro chi emume a bụ nke mbụ Ezenwaanyị pụtara nwee nkwụkọrịta n'ihu ọha dịka ihe kariri ọnwa atọ agafeele mgbe ọ mere nke a.

Onye ntaakụkọ BBC nke Obi Ezenwaanyị kwuru na ọ ma kpọmkwem na Ezenwaanyị agbazuola ọgwụ mgbochi ọrịa Covid-19.

O kwuru na kamgbe Ezenwaanyị si ụlọọgwụ pụta n'ọnwa Ọktoba 2021 na o jizi nwayọ nwayọ eso ndụ ya.

Cheta na ezipụtara ozi n'ụbọchị itolu nke ọnwa Jenụwarị 2021 nke kwuru na Ezenwaanyị gbara ọgwụ mgbochi ọrịa a nke mbụ ya.

Ezinụlọ Ezenwaanyị mba Briten

Ebe foto si, Getty Images

Ncheta oge dị mkpa Covid-19 metụtara ezinaụlọ Ezenwaanyị

  • Ọnwa Maachị 2020: Diọkpara Ezenwaayị mba Briten bụ Charles butere ọrịa Covid
  • Ọnwa April 2020: Nwa ya nwoke bụ William butere ọria Covid-19
  • Jenụwarị 2021: Ezenwaanyị na di ya bụ Philip gbara ọgwụ mgbochi Covid-19 nke mbụ ha
  • Febụwarị 2021: Charles na nwunye ya Camilia gbara ọgwụ mgbochi Covid-19 nke mbụ ha
  • Ụbọchị asatọ nke ọnwa Febụwarị 2022: Ezenwaanyị zutere diọkpara ya bụ Charles n'emume emere na Windsor
  • Ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị 2022: Charles butere ọrịa Covid-19 nke ugboro abụọ ya
  • Ụbọchị 14 nke ọnwa Febụwarị 2022: Camilla butere ọrịa Covid-19
  • Ụbọchị 20 nke ọnwa Febụwarị 2022: Obi Ezenwaanyị kwuru na Ezenwaayị butere ọrịa Covid-19.