Prince Philip: Ihe ndị ọchịchị mba ụwa kwuru maka ọnwụ Duke nke Edinburgh

Ebe foto si, PA Media
Ndị ọchịchị mba ụwa dị icheiche na-ezibata ozi iti aka n'obi nye ezinaụlọ Obieze mba Briten dị na Buckingham gbasara ọnwụ Prince Philip, bụ Duke nke Edinburgh, onye gbara afọ 99.
Ndị eze, ndị isi ala nakwa ndị Praịm Mịnịsta dị icheiche, ma ndị chịburu achị ma ndị ka nọ n'ọchịchị na mba Sweden ruo India na New Zealand, zitechara ozi mgbaru.
'Duke' a lara mmụọ so Ezenwanyị Elizabeth mee ọtụtụ njem oge ọ dị ndụ.
"Ọ bụ nnukwu mmadụ gosipụtara agbụrụ nke anyị agaghị ahụkwa ọzọ," Praịm Mịnịsta mba Australia bụ Scott Morrison depụtara.
Duke na ụfọdụ ndị si n'obi eze mba Europe dị icheiche nwere mmekọrịta site n'ọbara, ọtụtụ n'ime ha ezitekwala ozi mgbaru nke ha.

Ebe foto si, PA Media
Ozi iti aka n'obi si mba Commonwealth ruru iri ise na anọ bata - ọtụtụ n'ime ha gbanyere mgbọrọgwụ n'obi eze mba Britain; ihe ruru ijeri mmadụ abụọ na ụma anọ bi na mba ndị a.
Ọtụtụ ndị ọzọ zitere ozi mgbaru jara Duke ike n'ihi ọrụ ya nke o ji nyere ndị na-eto et aka, nakwa ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ọ rụrụ.
Australia
Scott Morrison kwuru na 'Duke' bụ nnukwu nkwado nyere nwunye ya bụ Ezenwaanyị, ma bụrụkwa nnukwu nna otu dị icheiche na mba Australia.
Julia Gillard bụbụ Praịm Mịnịsta Ọstrelia kwuru na 'Duke' bụ mmadụ dị uche n'ọrụ ma bụrụkwa onye na-akpa ndị ọzọ obi ọma.
Sweden
Eze Carl Gustaf kwuru na 'Duke' bụ "nnukwu ọyị nke ezinụlọ ya ruo ọtụtụ afọ, nke ha ejighi egwu egwu."
Ezinaụlọ obi eze nke mba Sweden gwara BBC na Eze ha bụ 'Duke' soro mee njem ụgbọmmiri n'otu oge gara aga, gaa mba England. "Ọ bụ ebe ahụ ka ọdịnamma ha abụọ malitere."
Mba Netherlands
Ezinaụlọ obi eze kwuru na Prince Philip bụ onye ha ji nnukwu nkwanye echeta. Ha kwuru na "o ji ogologo ndụ ya tinye n'ịrụrụ ndị mba Briten ọrụ nakwa ọrụ ndị ọzọ o tinyere onwe ya. Ọ bụ mmadụ anaghị echefu echefu."
Amerịka
Aka chịburu mba Amerịka bụ George W Bush toro 'Duke' ma kwuo na o biri ogologo ndụ kwesịrị nṅomi, ma bụrụkwa onye rụrụ ọrụ nke ọma, maka ndị ọzọ."
Belgium
Eze Philippe zigaara Ezenwaanyị ozi na nzuzo sị na ya chọrọ ka ha abụọ nwee nzukọ ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.
O kwuru na ya na Ezenwaanyị Mathilde 'agaghị echefu oge niile ha abụọ zukọrọ."

Ebe foto si, EPA
Malta
"Ọnwụ Prince Philip wutere anyị nke ukwu, o ji mba Malta mere ụlọ ya ma na-alọtakwa ebe a kwa mgbe. Ndị be anyị agaghị echefu ya," Praịm Mịnịsta Malta bụ Robert Abela dere nke a.
"O kwuru na puku kwuru puku ndị ntorobịa nwetara ọzụzụ gbanwere ndụ ha n'ihi atụmatụ nturugo nke Duke hibere, a kpọrọ 'Hilary Award'
Philip na Elizabeth nọrọ afọ abụọ na Malta, ebe Philip na-arụ ọrụ dịka onye agha mmiri tupu Eze George nke isii anwụọ n'afọ 1952
New Zealand
Praịm Mịnịsta Jacinda Ardern zigaara Ezenwaanyị ozi na ezinụlọ obie eze niile ozi.
"O kwuru na puku kwuru puku ndị ntorobịa nwetara ọzụzụ gbanwere ndụ ha n'ihi atụmatụ nturugo nke Duke hibere, a kpọrọ 'Hilary Award'.
Kanada
Praịm Mịnịsta Justic Trudeau kwuru na Duke "tinyere atụmatụ mwulite pụrụ iche nke mba anyị - nakwa ụwa niile".
O kwukwara na "Prince Philip bụ oke mmadụ nke ihe na-ajalite mmụọ ya bụ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Anyị ga-echeta ya dịka ide kwudosiri ike n'akụkụ Ezenwaanyị anyị."
Israel
Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu kwuru na Duke bụ "onye ọrụ ọha pụrụ iche nke mba Israel nakwa mba ụwa dị icheiche ga-eru uju ọnwụ ya.
Nne Duke, bụ Adaeze Alice nke Batternberg, onye nwụrụ n'afọ 1969, bụ na ụlọụka Mary Magdalene dị na Jerusalem ka e liri ya.

Ebe foto si, Getty Images
India
Praịm Mịnịsta Narendra Modi kwuru na obi ya na-agara "ndị mba Briten nakwa ezinụlọ Obi Eze". O kwukwara na Duke rụrụ ọrụ nke ọma n'otu ndị agha ma bụrụkwa onye wepụtara atụmatụ dị icheiche iji nyere obodo aka.











